Apostolic Nuncio: Lee Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu na Thaddeus Okolo, ụkọchukwu Igbo abụọ bụ 'Papal Nuncio'

Ebe foto si, Catholic Diocese of Kingstown
A na-ezitara ndị okpukpere ụka Katọlik na Naijiria ndị ndu si Vatican a kpọrọ 'Papal Nuncio'.
Ọtụtụ n'ime ha na-abụkarị ndị ọcha mana ị ma na e nwere ụmụafọ Igbo nọ na nnukwu ọkwa na mbaụwa?
Papal Nuncio maọbụ 'Apostolic Nuncio' bụ onye nnọchiteanya nke Bekee kpọrọ 'Ambassador' nke Rome na mba ndị ọzọ.
Ndị a na-eme papal nuncio na-abụkarị ndị bishọp kajara akaja na nkuzi Katọlik.
Ụmụ Naijiria atọ ma bụrụkwa ụmụafọ Igbo, bụ ndị na-anọchịte anya ọchịchị Rome na mba ụwa; Achịbishọp Fortunatus Nwachukwu n'Antille, Achibishọp Thaddeus Okolo n'Ireland na Achịbishọp Brian Udaigwe n'Benin na Togo.
Ihe ị maghị maka Achibishọp Fortunatus Nwachukwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
- Achịbishọp Fortunatus bụ 'Apostolic Nuncio' mba na Dominican Republic, Jamaica, Antigua, Barbuda, Barbados, Bahamas, Belize, Grenada, Guyana, wdg.
- Nwa afọ Umuokoro Egbelu Eziama Ntigha dị n'Abia Steeti rụburu dịka 'Apostolic Nuncio' mba Nicaragua,
- E chiri ya ụkọchụkwụ Aba Diocese n'afọ 1984
- Nwachukwu na-anụ ọtụtụ asụsụ gụnyere; Bekee, Italian, Jamani, Frenchị na Spanish
Ihe ị maghị maka Archibishop Thaddaeus Okolo
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
- E mere ya 'Papal Nuncio' ndị mba Ireland n'afọ 2017
- Ọ rụbuola dịka 'Papal Nuncio' mba ndị ọzọ gụnyere Dominican Republic, Central East Africa nakwa mba Chad
- A mụrụ nwaafọ Anambara steeti a na Kano n'afọ 1956
- Ọ gụrụ akwụkwọ Seminarị na Bigard Memorial Seminary dị n'Enugwu
- Francis Arinze bụ onye chiri ya ụkọchukwu n'afọ 1983
Ihe ị maghị maka Achịbishọp Brian Udaigwe(Benin na Togo)

Ebe foto si, Catholic Diocese of Orlu
- A mụrụ ya na mba Kamerun n'afọ 1964
- E chiri nwa afọ Imo steeti a ụkọchukwu n'Ọlụ Diocese n'afọ 1992
- E mere ya 'Apostolic Nuncio' mba Benin n'afọ 2013
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










