Butt Implant: 'Achọrọ m ịwepụ otele m gotere egote'

Ike e tinyere etinye

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị abụo ndị mba Ịngland nwụrụ mgbe ha gara ka a waa ha ike na mba Tọki
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Sophie Elise bụ nwaagbọghọ dị afọ iri abụọ na anọ nwere agba n'ihe onyonyo na Norway ma nwee ndị nkwado puku narị ise n'elu 'Instagram'.

Sophie kọwara na o nwere obere ahụ mana ọ chọro ka e wulite ukwu ya ka ọ dị ka nke 'nwaanyị Owere'.

Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-agbasa iwulite otele dị ka ngwaahịa n'Instagram, Sophie graa mba Tọki ịzụta otele nke ya.

O kwuru na ọ na-atụ anya na ọ ga-ada ezigbote ọnụ, mana ha beere ya ezigbo ego nke mere ka obi dị ya mma.

Sophie Elsie

Ebe foto si, SOPHIE ELISE

Nkọwa foto, O rụola afọ ise Sophie tinyere otele ukwu ọhụrụ

"O bere ego oo, o bere ego karịa ihe ọ kwesịrị ibụ" ka Sophie gwara ndị mgbasa ozi 'Radio 1 Newsbeat'

Gịnị mere ọ ji chọọ ịwepụ ya ugbua?

O kwuru na mgbe a wachara ya otele, na ahụ fụrụ ya ụfụ.

Mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ na Soshal Midịa bidoro kwuwe okwu maka otele ya.

Ndị mmadụ kwuru na otele ọhụrụ ahụ na ahụ ya agakọghị nke ọma.

"Ugbua ka m matara na ọ bụghị ihe m kwesịrị ime. Ihe niile mere m 'vuum' n'anya, ugbua ka m matara na m echeghị ya ọfụma tupu m waa otele m" ka Sophie kwuru.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Sophie tinyere nke a na-etinye etinye akpọro 'Silicone' mana e nwere atụmatụ ọzọ ebe a ga-ewere abụba dị n'ahụ mmadụ were tinye n'otele ka o buo ibu.

Ọ chọpụtala na ahụ ya mara mma ma ghọta na onweghị ihe o ji.

Mana ịwepụ otele ya ugbua nwere 'Kọma'

Sophie mechazịrị chọta onye dọkita na-awa ahụ nke ọma.

Aha onyonyo, Nkechi Blessing sunday: Otele ukwu m na-ekopu ụwa

Dọkita a kọwaara ya na o nweghị ike ịwepụcha ha niile n'ihi na nke e tinyeere ya bụ nke a na-etinye n'ara.

Ọ gwara Sophie na ihe ga-emebi ma e wepụchaa ha niile n'ike.

Sophie kwuru na ọ ga-arụzi otele ya n'ọdịnihu, mana ka ọ dị ugbua, ọ ga-ewelata ya ka ọ dịkwa ka ihe yiri anụ ahụ mmadụ.

Akụkọ ga-amasị g:

Ihe nkịrị ga-amasị g:

Aha onyonyo, 'Ndị ohi ezuchaala ọtụtụ ihe nka Igboukwu'