Ogoni Killings: Ọ bụ ndị ojiegbeezu e ji onyeisi ha gburu ndị mmadụ - Abueh

Ebe foto si, Nwazim Barikui Clever
Abueh gwara BBC na eze obodo ha nwụchiri onye ojiegbeezu ahụ ma nyefe ya n'aka ndị uweojii ndị tinyere ya na mkpọrọ dị na Pọtakọt.
Mana ndị otu ya kpọrọ ndị obodo gwa ha na ha agaghị aṅụ mmiri tọgbọ iko ma ọ bụrụ na a tọghapụghị onye otu ha.
"Ehe, a gbara ụlọ m ọkụ. Obi adịghị m mma maka ya mana amaghị m maka akụkọ sị na ọ bụ ndị ndị otu nzuzo mere ya."

Ebe foto si, Nwazim Barikui Clever
" Ihe m maara bụ ihe mere n'obodo Okwali, amaghị m ihe mere n'obodo ndị ọzọ, ọ bụ ndị otu onye ojiegbeezu nọ ugbua n'ụlọmkpọrọ Pọtakọt nyụrụ ihe na-esi."
Ha kpọburu wee na-amaja anyị sị na udo agaghị adị n'obodo anyị ma ọ bụrụ na a tọghapụghị onyeisi ha."
Abueh kwuru na ụbọchị a wakporo ha, na ụmụ okoroọbịa ahụ gara tụọ ogbunigwe n'ụlọ ya nakwa ụlọ eze obodo ha ma gbụọ ndị ọrụ ise na-arụ ọrụ ebe a na-ewu ewu mewu n'obodo ha.
Akụkọ kwuru na mwakpo ahụ bidoro n'abalị Tuzde , ebe a wakporo obodo Okwali ma gbaa ụlọ na ụgbọala ọkụ.
Ụbọchị Wenezde n'ụtụtụ, ụmụnwoke ji egbe wakporo obodo ndị agbataobi ha; Taabaa na Nyokuru dịcha n'okpuruọchịchị Khana.

Ebe foto si, Nwazim Barikui Clever
Onye na-anọchite anya mpaghara Khana/Gokana n'Ụlọomeiwu nta bụ Dumnamene Dekor gwara BBC,
N'ezie na e gburu mmadụ ise n'obodo Taabaa ebe a gbara ụlọ eze obodo ahụ bụ Mene Nule Jnr, na nke ndị ọzọ ọkụ.
Na Nyokhuru, ụlọ onyeisi otu na-ahụ maka ọganihu ndị Ogoni nke a kpọrọ 'Movement for the Survival of Ogoni People" MOSOP bụ Legborsi Pyagbara so na ndị a gbara ọkụ.
ebe ndị e merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ a nara ọgwụgwọ.
Pyagbara gwara BBC na ya ka si mba ọzọ lọta Naịjirịa wee nụ na a gbara ụlọ ya ọkụ.

Ebe foto si, Nwazim Barikui Clever
"Ihe a bụ ihe ikikiri eze mana ọ gara n'ihu igosi ihe anyị na-etibu mkpu ya na e nweghị ezi nchekwa na mpaghara a."
"Naanị otu ogige ndị uweojii bụ nke dị na Bori bụ ihe dị ebe a. Ọ bụrụ na ndị uweojii gbatara ọsọ enyemaka oge ihe a bidoro n'agbataobi anyị, ọ garaghị emetụta obodo ndị nọ ya nso."
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Nnamdi Omoni kwuru na ihe ahụ mere n'ezie mana ọ bụ naanị mmadụ abụọ nwụrụ.
Okwuru na nnyocha na-aga n'ihu n'ọdachi ahụ nke ha chere bụ ndị otu nzuzo mere ya.
Ọ gara n'ihu kpọ oku ka ndị gbara ọsọ ndụ lọghachị n'ihi na obodo ederela jụụ.
Lee akuko ga-amasị gị









