May 29, 2019 in Nigeria: Taa ka ọchịchị ga-esi aka fere aka

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aṅụ iyi ọkwa oche onyeisiala Naịjirịa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Taa bụ abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee ka ọchịchị ga-esi n'aka fere aka dịka Naijiria na-abanye agba ọhụrụ n'ọchịchị onyekwuocheya.

Buhari

Ebe foto si, @bashirahmad

Taa ka onyeisiala Muhammadu Buhari na-abanye agba nke abụọ dịka onyeisiala dịka o merichara na ntuliaka 2019.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Buhari banyeburu agba nke mbu ya na Mee 29, afọ 2019.

Ndị gọvanọ steeti na-aloghachi gụnyere; Dave Umahi (Ebonyi), Ifeanyị Ugwuanyi (Enugwu), Okezie Ikpeazu (Abia), Ifeanyị Okowa (Delta), Nyemso Wike (Rivers) na Emmanuel Udom (Akwa Ibom).

Umahi,Ugwuanyi,Ikpeazu

Ebe foto si, Umahi,Ugwuanyi,Ikpeazu/Facebook

Nkọwa foto, Umahi,Ugwuanyi,Ikpeazu so na ndị gọvanọ na-alọghachi agba nke abụọ ha

Ndị ọzọ bụ:

Samuel Ortom na Benue

Simon Lalong - Plateau

Atiku Bagudu - Kebbi

Nasir El-Rufai bụ gọvanọ ọhụrụ nke Kaduna

Ben Ayade - Cross River

Darius Ishaku - Taraba

Aminu Masari - Katsina

Mohammed Badaru nke Jigawa ga-abanyekwa agba nke abụọ ha dịka gọvanọ steeti ha dị iche iche.

E nwekwara ndị ga-abanye oche ọchịchị mbụ ha dịka gọvanọ ọhụrụ taa.

Emeka Ihedioha

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook

Nkọwa foto, Emeka Ihedioha so na ndị ndị ga-abanye oche ọchịchị mbụ ha dịka gọvanọ ọhụrụ taa

Ha gụnyere mmadụ dịka:

Emeka Ihedioha nke PDP (Imo)

Babajide Sanwo-Olu nke APC (Legọs)

Muhammad Inuwa Yahaya nke APC (Gombe)

Seyi Makinde nke PDP (Oyo)

Dapo Abiodun nke APC (Ogun)

Abdulrahman Abdulrazaq nke APC (Kwara)

Babagana Zulum nke APC (Borno)

Abdullahi Sule nke APC (Nasarawa) nakwa Muktar Idris nke APC (Zamfara).

Obiano

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook

Nkọwa foto, Anambara steeti, ebe Willie Obiano nwetara meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017,so na steeti enweghị ntuliaka gọvanọ n'afọ 2019

Mana a gaghị enwe ndị ga-abanye ọkwa gọvanọ n'Anambra, Edo, Ekiti, Bayelsa, na Ondo na Osun dịka ha merela ntuliaka ha tupu ugbua n'ihi nsogbu gbaso ntuliaka e meburu na steeti ndịa n'oge gara aga.

Taa, dịka Mịnịsta Mgbasaozi bụ Lai Mohammed siri gbaa n'ama, a ga-eme emume mnyefe ọchịchị na nwayọọ, na-emeghị mkpatụ ọbụla.

Dịka o siri kọwaa, nke a bụ n'ihi na gọọmenti ebupụla emume ncheta ọchịchị onyekwuoucheya gaa ụbọchị Juun 12, n'iji kwanyere MKO Abiola bụ onye nwụrụ dịka ọ na-alụ ọgụ maka mmeri o meriri na ntuliaka Juun 12, afọ 1993.

Cheta na n'afọ 2000, ọchịchị Olusegun Obasanjo mapụtaburu ụbọchị May 29 dịka ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya iji cheta ndị uwe kakị iwere ọchịchị nyefee n'aka ndị nkịtị mana n'afọ 2018, ọchịchị Buhari higharịrị ya bụ emume buga ya n'abalị Juune 12 kwa afọ.

Akụkọ ga-amasị gị: