Ezekwesili: Ebe ọ wụsala ngwa ọgụ ya, patị ya na-akwadozi Buhari
Otu ndọrọndọrọ ACPN bụbu ebe Ezekwesili rịgọrọ a zọ ọkwa ọchịchị akachapụla ihe o meere n'ịwụsa ngwa ọgụ ya.
Iwe ha bụ na Ezekwesili agwaghị ha maọbụ jụọ ha ọha tupu o kwụsị njem ị bụ onyeisiala.
Nke a mere na ACPN ekwekọrịtala ịkwado onyeisiala Muhammadu Buhari na ntụlịaka n'abịa.
N'otu aka ahụ ngalaba Inec ekwuola na ha anabataghị omume Ezekwesili n'iihi na ọ mejọrọ iwu kwuru na ọnye ọbụla chọrọ ịkwụsị ịzọ ọkwa onyeisiala ga-eme ya tupu o rue ụbọchị 45.

Ebe foto si, Oby2019.com
Ọ bụ n'ụtụtụ a ka Oby Ezekwesili bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati ACPN chịsara ngwa ọgụ ya.
O kwuru na ọ kwekọrịtara nke a n'onwe ya dịka emechara ndọrịtaụka n'etiti ya na ndị ọzọ.
Ọ zipụtara ozi a site n'akara Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O kwuru na ọ ga-akwado ọgbakọ ndị ọzọ a kpọrọ PACT bụ nke o so na ya mbụ.
Buhari hibere iwu maka ọrụsị

Ebe foto si, Doris Akonanya/Facebook
Onyeisiala Mohammadu Buhari ebinyela aka n'iwu ga-amachị ịgbachapụ ndi nwere ọrụsị .
Iwu a sị na ụlọ ọrụ ọbụla kpasara mmadụ oke maka ọrụsị ga-akwụ nde naịra, ka onye nkiti mere ya ga-akwụ puku narị naira, maọbụ ga mkpọrọ ọnwa isii
Ndị agha egbuola ndi omekome na Zamfara

Ebe foto si, Nigerian Army
Ndị agha naịjirịa nọ n'atụmatụ ọrụ akpọrọ Sharan Daji na Zamfara steeti sị na ha gbụrụ ndị omekome iri ise na asatọ ma gbapụta mmadụ iri asaa na ise n'aka ha.
Ndị agha sị na ha zutere ndị a n'ime ọhịa Dumburum na Gando ma kwuo na isi ndị agha abụọ nara na ọgụ ahụ
Venezuela achụpụla ndị Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Venezuela bụ Nicholas Maduro akagbuola mmekọ mba ahụ na Amerịka , ma nyekwa ndị ọrụ mmekọ Amerịka abalị atọ iji si na mba ha pụọ.
Nke a n'abịa na azụ ka onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwadoro onyeisi pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Juan Guaido dịka onyeisiala mba ahụ.
N'egwuregwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Naomi Osaka na Karolina Pliskova na-asọmpị iji mara onye ga ezute Petra Kvitova na agba nke ikpeazu iko Australian open.
Petra Kvitova meriri Daniella Collins iji tozuo iga asọmpị ikpeazu.
Gee nkeji a ebe a:












