Third Mainland Bridge: Nwoke a mabara na mmiri dị afọ '75'
Otu nwoke na-arụ ọrụ n'ụlọntaakụkọ Radio Nigeria aha ya bụ Oladejo O.R, makpuru n'oke mmiri igbu onwe ya n'ụtụtụ Fraịde bụ ụbọchi nke abụọ n'ọnwa Novemba, 2018.
Maazi Yemisi Nubi, bụ onye kwọ Oladejo n'ụgbọala mgbe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC nọ mgbe ihe a mere na ha nọ na-akpa nkata mgbe ọ gwara ha ka ha kwụsị ka ọ nyụọ mamịrị.
Ka ụgbọala ahụ kwụsịrị, Oladejo buru onwe ya tuba n'ime osimiri.
Tupu ọ nwụọ, Oladejo na-arụ ọrụ dịka ọkwọ ụgbọala na FRCN.

Onye ọ na-akwọ n'ụgbọala bụ Oriakụ Ajanaku Aina, bụ osote onyeisi n'otu ngalaba na FRCN nke Legọs gwara BBC na Oladejo alaala ezumike nka, mana e nyere ya ọrụ n'ụdị Bekee kpọrọ "contract" ka ọ na-eche ka ego ngwụcha ya rue ya aka.

Oriakụ Aina kwukwara na ọ bụ ya gwara Oladejo ka ha banye ụgbọala enyi ọrụ ya bụ Maazi Nubi.
Ọ sị, "ụgbọala o ji akwọ m nọ na be m ugbua."
Oriakụ Aina sị na Oladejo nwereike ịdị afọ 75.

Ndị ọrụ gbata gbata mechara gụpụta Oladejo n'mmiri ma kwuo na ọ laala mmụọ.
Nke bụ ọzọ n'ime ọtutụ mgbe ndị mmadu na-amaba n'ime mmiri na Third Mainland Bridge.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:











