Nwata akwụkwọ akwụọla ụdọ na mahadum Nsugbe

Ebe foto si, Getty Images
Nwata akwụkwọ akpọrọ Phillips Chinedu dị afọ iri abụọ na itoolu akwọola ụdọ na Mahadum ndị nkuzi bụ "College of Education Nsugbe."
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed kwuru na enyi nwoke Chinedu bụ Obinna Joseph were ha mkpesa na ọ hụrụ ozu Chinedu ka ọ kwụrụ ụdọ n'ime ulọ ya.
Mgbe ndị uwe oji nwetara ozi a, ha gara ebe ihe a mere ma buru ozu Chinedu gawa ụlọ ogwu ebe dọkita kwuru na ọ nwụọla.
E bugara ozu ya n'ụlọ ebe a na-echekwa ozu ebe a ga-eme nyocha ihe mere ya.
Ndị uweojii kwuru na ha ka na-enyocha ya bụ ihe mberede ka ha wee chọpụta ebe ya bụ mmiir sị banye opi ụgbụghịrị.
Akụkọ ndị ga-amsị gị:





