Enugu State LG election: ENSEIC sị na PDP meriri n'ọkwa onyeisioche n'okpuru ọchịchị 17

ENSIEC

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka n'Enugwu Steeti bụ Enugu State Independent Electoral Commission(ENSIEC) akpọpụtala mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisioche okpuru ọchịchị e mere na steeti ahụ.

Dịka Ensiec siri kwuo, otu PDP nwetara oche onyeisioche okpuru ọchịchị 17 dị na steeti ahụ nakwa ọkwa ndị nnọchiteanya wọọdụ 260 dị na steeti ahụ.

Cheta na tigbuo-zọgbuo soo ntuliaka okpuru ọchịchị ime obodo nke e mere n'Enugwu steeti ụbọchị Wenezde, abalị 23 nke ọnwa Febụwarị, afọ 2022 dịka ndị bu egbe gbagburu ndị mmadụ ma merụkwa ọtụtụ ahụ na Nkanu-West.

Mana ntuliaka gara nke ọma na mpaghara ndị ọzọ.

Anyị akụsala ndị butere ọgbaahara na ntuliaka okpuruọchịchị Enugwu Steeti - Ndị Agha Naijirịa

Egbe anapụrụ ndị omekome

Ebe foto si, Nigerian Army

Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naijirịa bụ Onyema Nwachukwu ekwuola na n'ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Aprel ekwuola na ha na ndị uweojii awakpool a otu ha sị bụ ndị Ipob/ESN bụ ndị ha sị butere ọgbaaghara na ntụlịaka okpuruọchịchị emere nsonso a, ọkachasị na wọdu dị na Nkanu west nke Enugwu Steeti.

Okwuru na mwako a nke ha mere na Centenary Estate, Obeagu Uno sitere na nyocha, na ha napụrụ ndị omekome a egbe AK-17 asaa, egbe pump action abụọ, mgbọ egbeiri, mgbọ egbe asatọ agbabeghị, mgbọ egbe 7.62mm, otu ogbunigwe aka, ụgbọala gwongworo bụ ozu mmadụ atọ.

Egbe anapụrụ ndị omekome

Ebe foto si, Nigerian Army

O kwuru na ha enyefeela ndị uweojii ihe ndị a.

Ndị agha gwara ndị bi na mpaghara a na ha atụla ụjọ na ha nọ ịhụ na ezi ncheka dị.

Etu ndị 'unknown gunmen' si wakpoo Obeagu, Amechi dị n'Enugwu steeti, gbuo ndị mmadụ, gbaa ọtụtụ ụgbọala ọkụ

Úgbóala gbara ókú na ndí merúú ahú n'Enugwu

Ndị bu egbe a mabeghị ndị ha bụ awakpoola ọdọ atụmvootu n' Amaagụ Obeagụ ị n'Okpuru Ọchịchị Nkanu-West, Enugu steeti gbụọ mmadụ a mabeghị ọnụọgụgụ ha ma gbaa ọtụtụ ụgbọala ọkụ n'ehihie Wenezde.

Nke a na-eme dịka a na-eme ntuliaka ọkwa onyeisioche ọkpuru ọchịchị obodo 17 dị na steeti ahụ.

Úgbóala a gbara ókú n'Obeagu Enugwu steeti

Otu onye obodo ahụ nọ ebe ihe mere achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na ndị ojiegbe ahụ wuchiri n'ọgbọ atụmvootu n'ebe Elekere Mbụ nke ehihie dịka nttuliaka ka na-aga n'ihu gbawa egbe egbe aghara aghara, nke mere ka oke na ngwere nọrọ ọsọ.

Ọ gara n'ịhụ sị, "Onye ọbụla na ọsọ. Ha gbara mmadụ atọ egbe, e buru ha gawa ụlọgwụ. Ha gbakwara ọtụtụ ụgbọala ọkụ."

Ụgbọala A gbara ọkụ n'Obeagu, Nkanu-West

Mbọ anyị gbara inweta ozi n'aka ndị uweojii steeti ahụ amịtaghị mkpụrụ.

Oge BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe, o kwuru ka a kpọghachi ya.

Mana oge a kpọghachiri ya, ọ zaghị ekwentị ya ruo oge anyị wepụtara akụkọ a.

Cheta na tigbuo zọgbuo so ntuliaka ime obodo ahụ e mere dịka ndị oji egbe wakporo ụfọdụ ebe na ntuliaka ahụ.

Kemgbe otu afọ, ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ n'Ọwụwa Anyanwụ, nke Enguwu steeti so n'steeti ise dị na ya.

dịka oke ogbugbu mmadụ, ntọrị na ịgba ụlọ na ụgbọala ọkụ na-r ị ibe ya eri. na-

Akụkọ ka na-abịa.

Ndị 'unknown gunmen' wakpokwara ndị ntaakụ n'Amechi, Enugwu, merụọ ndị ntaakụkọ atọ ahụ

Ndị ntaakụkọ e merụrụ ahụ

Ndị ojiegbe wakporo ọnọdụ atụmvootu na ntuliaka okpuru ọchịchị Nkanu-West, Enugwu steeti, merụọ ndị ntaakụkọ atọ ahụ, ebe a hụbeghị otu onye n'ehihie Wenezde.

Nke a na-abịa dịka ntuliaka ọkwa onyeisioche na-aga n'okpuru ọchịchị 17 dị n'Enguwu steeti taa bụ abalị 23 nke ọnwa Febụwari afọ 2022.

Ndị ntaakụkọ ahụ bụ ndị ọrụ 'Enugu State Broadcasting Service(ESBS) mmadụ atọ na ọkwọụgbọala na-akwọ ha na-agagharị n'ụgbọala ụlọrụ ha inweta ozi etu ntuliaka okpuru ọchịchị si aga na steeti ahụ oge a wakporo ha.

Otu n'ime ndị ọrụ ESBS ọ metụtara a chọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere nso Ahịa Eke Ọtụ dị n'Amechi dị na Nkanu-West bụ ebe ndị omekome bu ụgbọala abụọ ahụ gbabidoro ha.

Otu onye merụrụ ahụ
Nkọwa foto, Otu onye merụrụ ahụ

Ha kpụpụta n'ụgbọala ha were mma tie ha ihe tinka tiri panụ, ebe ha gbara otu n'ime ha egbe.

"Ka anyị na-erute Amaodo, n'ahịa a ma a na-akpọ Eke Ọtụ, n'Amaechi, anyị chọpụtara n'otu ụgbọala kwụ anyị n'ihu, ebe ụgbọala ọzọ so anyị na-azụ."

"Ka onye ọkwọụgbọala anyị chọzịrị ịgbawa ọsọ, ha wụpụtara buru egbe na mma gbwbido anyị ma kpụpụta anyị niile n'ụgbọala."

" Ha gbupụrụ otu n'ime anyị mkpịụsịaka, gbaa onye nke ọzọ egbe n'ụkwụ."

" Ebe anyị ahụbeghị otu n'ime anyị dịka onye ọ bụla mm=gbapụtara n'agba ọsọ ndụ ya."

Onyeisi ụlọọrụ ntaakụkọ ESBS bụ Chukwuma Ogbonna atụọla arịị maka ọdachi ahụ dagidere ndị ọrụ ya n'ihu ọrụ.

Ogbonna bụ onye sịrị na mwakpo ahụ bụ " Ihe nke a gbagwojuru ya anya", kwere nkwa na ụlọrụ ha ga-ahụ na ndị ọrụ ahụ o metụtara nwetara ezi nleta n'ụlọọgwụ.

Ka ọ dị ugbua e bugala ndị merụụ ahụ n'ụlọ a kpọghị aha ya maka inye ha nleta.

Akụkọ ka na-abịa

Na mmalite ntụlịaka Okpuru Ọchịchị Enugwu Steeti

Ntuliaka
Nkọwa foto, Ndị bịara atụmvootu na New Haven Primary School, Enugwu

Ugo berelna mgbagbu n 'ụtụ taata bụ Wenezde(23/2/2022) dịka ndị Enugwu na-ahọpụta ndị ọchịchị okpuru ọchịchị ime obodo.

E mere ntuliaka ahụ n'okpuru Ọchịchị 17 dị na steeti ahụ.

Okporoụzọ 'Bisalla Road'

Okpuru ọchịchị ndị a gụnyere; Aninri, Awgu, Enugu-East, Enugu-North, Enugu-South, Ezeagu, Igbo-Etiti, IgboEze-North, Igbo Eze-South.

Ndị ọzọ bụ Isi Uzo, Nkanu-East, Nkanu-West, Nsukka, Oji River,Udenu,Udi, Uzo-Uwani.

Bisalla Road, Enugwu

Okporoụzọ niile tọgbọ chakoo n'Enugwu dịka a na-eme ntuliaka.

New Haven, Enugwu
Nkọwa foto, Okporoụzọ New Haven

Na-agbanyeghị nke a ụfọdụ ndị mmadụ pụtara n'uju iji sonye na ntuliaka ahụ.

Ọgbọ atụmvootu na New Haven Enugwu
Ógbó ntuliaka na New Haven Market