Ndị uweojii anwụchiela ojiegbeezu gara zuo agbataobi ya

Ebe foto si, Getty Images
Nwoke a kpọrọ Taoheed Adegbite bụ onyenweụlọ duru ndị otu ya gaa ohi na ngwuru onye agbataobi ya ebe ha buru ụgbọala ya gbaa ọsọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ogun steeti bụ DSP Abimbola Oyeyemi, kwuru na ndị ojiegbeezu zuru ụgbọala SUV nke agbataobi Taoheed ma bụrụkwa onyenweụlọ dịka ya.
Onye ihe ahụ metụtara gwara ndị ntaakụkọ na ndị omekome a wakporo be ya bido na-agba egbe.
"Echere m na ọ bụrụ ma ha bata, na ha nwere ike imerụ m ahụ maọbụ gbuo m.
"Ya mere m jiri jụọ ha ihe ha chọrọ. Ha kwuru na ha chọrọ ụgbọala m.
"Esiri m na mpio ghapụrụ ha igodo ụzọ m.
"Ha gbanyere ya mmanụ ụgbọala kwọrọ ya gbapụ."
Nwoke ahụ bekuru ndị uweojii ndị ji ozi o wetara ha chọwa ndị mere ihe ahụ ma nweta ha.
Ọ bụ oge ha kpọrọ nwoke ahụ oku ka ọ bịa na a hụla ụgbọala ya ka o rutere ọ bụrụ na ọ bụ onyenweụlọ dịka ya ma bụrụkwa onye agbataobi ya kpara mkpamkpa ihe ahụ.
Oge a gbara ya ajụjụ nwoke ahụ a na-enyo enyo, ajụjụ, ọsaghị ya n'ihi na ọ nọ n'ihe mgbu egbe ndị uweojii gbara ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









