Prince Philip: Ụlọụka Canterbury na-akara ya ụka ncheta taa bụ April 11

Ụlọụka St George dị na Windsor Castle

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, A ga-eme akwamozu ya n'ụlọụka St George dị na Windsor Castle

A na-aka ụka pụrụiche n'ulọụka Canterbury taa bụ April 11 maka iji cheta eze Edinburgh dịka mba UK nọ n'iruju ugbua maka ọnwụ ya.

Ọ bụ Archbishop nke Canterbury na-edowe ụka ahụ, ọ bụkwa ya ga-aka ụka n'akwamozu ọkparaeze Philip n'April 17,2021

A ga-eli Prince Philip n'ụbọchị 17 nke ọnwa Epreelụ

A malitela nkwado maka akwamozu Ọkparaeze Philip, di Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ, onye nwụrụ n'ụbọchị Fraịde ka ọ dị afọ 99.

A ga-eme akwamozu ya n'ụlọụka St George, na Windsor Castle, n'elekere atọ nke ehihie n'oge ndị Briten, n'ụbọchị Satọde, 17 nke ọnwa Epreelụ. A ga-egosi ya n'ihe onyonyo.

A ga-ekwuputa usoro e si eme ya bụ akwamozu n'ime ụbọchị ole na ole na-abịa, mana a na-atụ anya na ọ ga-abụ mmemme karịa nnukwu emume na-esokarị ọnwụ onye ezinaụlọ Eze.

Kedụ ebe a ga-eli ozu ya?

Akụkọ kwuru na Ọkparaeze Philip kwuru na ọ chọghị ka e mee oke emume n'akwamozu ya, na a gaghị edebe ya ebe ọha gaara enwe ike ịbịa kwanyere ya ugwu ikpeazụ ma lee akpati ozu ya.

Kama a ga-edebe ya na Windsor Castle ruo ụbọchị a ga-eli ya.

Map of Windsor Castle

A ga-eji ọkọlọtọ duke kee n'elu akpatiozu ya. Ọkọlọtọ ahụ na-egosi mpaghara ndụ ya, site n'etu o si si n'agbụrụ ndị Grik ruo n'echichi ndị Briten ya.

Mgbe duke na Adaeze Elizabeth banyere na nkwa ọlụlụ n'afọ 1946, ọ gbaghapụrụ echichi Grik ya ma bụrụ onye mba Briten, ma malite ịza aha ụka nne ya, Mountbatten.

Ya mere na egosipụtara ezinaụlọ Mountbatten n'elu ọkọlọtọ ya, nakwa ụlọ si n'elu njirimara nke obodo Edinburgh - ọ bụrụzịrị Duke nke Edinburgh mgbe ọ gbara akwụkwọ.

Eserese na-egosi ọkọlọtọ duke, okwu nakwa mma ya

Gịnị ga-eme ụbọchị ahụ?

Duke ga-enweta akwamozu bụ emume karịa nke steeti. E nwere obere ndịiche - akwamozu nke steeti bụ nke a na-enyekarị ndị eze, n'agbanyeghi na e ji akwamozu nke steeti lie Winston Churchill bụ Praịm Minista n'oge agha.

N'ihi iwu mmachi ọgbakọ maka ọrịa coronavirus, ọ pụtara na agaghị eme akwamozu duke ka etu ọ gaara adịbu - n'agbanyeghi na obieze kwuru na ọ bụ etu a ka duke si chọọ ya, ma kwuo na ha ga-akwa ya ma gosipụta ndụ ya o ji rụọ ọrụ.

N'ụbọchị olili ya, a ga-ebuga akpati ozu ya n'ọnụụzọ mbata Windsor Castle. A ga-etinye ya n'ụgbọala Land Rover a rụgharịrị arụgharị, nke duke na onwe ya tinyere aka na nhazi ya, nke a ga-eji buga ya n'ụlọụka St George.

Ndị Grenadier Guards ga-edu ngafe nke ga-ewe nkeji asatọ. Ndị na-ebu akpatiozu si na Royal Marines na ndị gha ndị ọzọ ga-edu ụgbọala ahụ. Ndị agha ga-akwụ n'ahịrị n'ụzọ ebe ndị ezinaụlọ Eze, gụnyere Ọkparaeze nke Wales, ga na-aga ije n'azụ akpatiozu ahụ.

Ezenwaanyị ga-aga nke ya iche, ruo n'ụlọụka ebe a ga-aka ụka.

Egbe ndị agha ga-agbapụ oge a na-aga ije a, ebe mgbịrịgba oge ga-akụ.

Ndị agha na ndị otiịgba si na Rifles ga-anabata akpatiozu ahụ n'ụkwụ West Steps nke ụlọụka ahụ, dịka a ga na-akpọ abụ ala mgbe akpatiozu ahụ ga-abata Horseshoe Cloister.

Site na West Steps, ndị na-ebu akpatiozu asatọ ga-eburu akpatiozu ahụ, nke e ji ọkọlọtọ duke kee, nakwa flawa e kere eke nakwa okpu agha na mma agha duke dị n'elu ya.

Dean nke Windsor na Archbishop nke Canterbury ga-ezute akpatiozu ahụ. A ga-enwe ịgba nkịtị otu nkeji n'elekere atọ nke oge Briten (15:00 BST) tupu a malite ịka ụka.

A kachaa ụka, a ga-eli duke na Royal Vault.

Floor plan of St George's Chapel, Windsor

Onye ga-abịa akwamozu a?

Iwu mmachi e tinyere n'ihi mkpamkpa ọrịa coronavirus n'Ịnglandị pụtara na ọ bụ naanị mmadụ 30, nọsapụrụ anọsapụ ganye ma ha ebikọrọ ọnụ, ka a ga-ahapụ ka ha bịa akwamozu a. Ndị ga-ebu akpatiozu nakwa ndị ụkọchukwu ga-aka ụka esoghi n'ọnụọgụgụ ndị ga-abịa ya bụ akwamozu.

Ekwuputabeghi ndị ọbịa maọbụ ndị ezinaụlọ ga-abịa ya bụ emume. Ọkparaeze Harry ga-abịa mana nwunye ya bụ Meghan dị ime, agaghị esinwu Amerịka bịa n'ihi ndụmọdụ ndị dọkịta. Duke nke Sussex na nwunye ya bụ Duchess nke Sussex bi na mba Amerịka, ha alọghachịtabeghi na mba Briten kemgbe ha rituru n'ọkwa ndị ezinaụlọ Eze ọkwa ha rịrị arị n'afọ gara aga.

N'okpuru nhazi e tinyeburu maka ihe ga-eme n'ụbọchị ole na ole mgbe duke nwụrụ, nke a kpọrọ Forth Bridge, puku kwuru puku mmadụ gaara agbakọ na Lọndọn nakwa Windsor, ebe ụfọdụ ga-atụ ute na-achọ ebe dị mma ha ga-anọ hụ ka ndị agha ga-esi gafee.

Narị kwuru narị ndị agha gaara akwụkwa n'ahịrị n'ụzọ iji kwanyere duke ugwu, n'akụkụ ndị uweojii ga na-achịkọta igwe mmadụ gbakọrọ.

Mana kemgbe ọrịa ozuruụwaọnụ a bidoro, ndị nhazi nọ na-atụpụta atụmatụ ga-ahụ na igwe mmadụ agbakọghị ma ọ bụrụ na duke nwụọ.

Gịnị ga-eme ọzọ?

Mba Briten abanyela n'oge iru uju, nke ga-akwụsị n'ụbọchị a ga-eli duke.

Gọọmentị mba Briten amaala ọkwa ka ọkọlọtọ ha niile gụnyere Union Jack ga-efe n'ọkara osisi n'ụlọọrụ gọọmentị niile ruo ebe elekere asatọ nke ụtụtụ n'ụbọchị na-eso olili ya. Union Jack ndị nke dị n'ụlọ ndị eze, ebe Ezenwaaanyị ebighi, ga-esokwa fee n'ọkara osisi.

Ọkọlọtọ na-efe n'ọkara osisi na Buckingham Palace

Ebe foto si, EPA

Royal Standard, bụ ihe nnọchiteanya ọkaaka na nnọgide ọchịchị eze, anaghị efe n'ọkara osisi maọlị, ọ ga-efekwa na njuputa ya ebe Ezenwaanyị nọ.

A gbara egbe njirimara ọnwụ na mpaghara dị iche iche na mba Briten nakwa Gibraltar, n'ehihie Satọde. Egbe ndị agha gbapụrụ ugboro 41 n'otu oge kwa nkeji n'ime nkeji 40 n'obodo Edinburgh, Cardiff, London, Hillsborough Castle dị na Northern Ireland nakwa n'ebe ndị agha mmiri na-anọ na Devonport na Portsmouth.

Ụgbọmmiri ndị agha nke ezinaụlọ Eze nọ njem n'elu mmiri, nke gụnyere HMS Diamond na HMS Montrose, sokwa gbapụ ya bụ egbe, iji kwanyere ọkparaeze ugwu, n'ihi etu o si rụọ dịka onye agha mmiri n'oge Agha Mbaụwa nke abụọ nakwa etu o si nwee echichi ndị gụnyere 'Lord High Admiral'.

Egbe njirimara ọnwụ nke London

Ebe foto si, Getty Images

Iji kwanye ugwu, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ịnglandị, Skọtlandị nakwa Wales akwụsịtụla achụmnta vootu maka ntuliaka a ga-eme n'ọnwa na-abịa. Ndị ụlọomeiwu ga-agbakọta n'ụbọchị Mọnde ka ndị omeiwu nwee ike ikwanyere ọkparaeze ugwu.

Kedụ etu ọhanaeze ga-esinwu kwanye ugwu nke ha?

Iwu mmachi nnukwu ọgbakọ e tinyere n'ihi mkpamkpa ọrịa coronavirus n'Ịnglandị pụtara na agbanweela atụmatụ e kwesịburu iso maka ụbọchị ole na ole tupu a kwaa ya, nakwa maka akwamozu ahụ na onwe ya.

A rịọla ọhanaeze ka ha ghara ịnwa ịga emume akwamozu ọbụla, dịka ndị na-ahụ maka ahụike ọha si dụọ ọdụ.

Ezinaụlọ Eze arịọkwaala ndị mmadụ ka ha ghara ịhapụ flawa na ihe ndị ọzọ ha ji akwanye ugwu n'ụlọ obibi ndị ezinaụlọ Eze.

Na websaịt nke Ezinaụlọ Eze, a gwara ndị ọhanaeze ka ha nye ndị chọrọ enyemaka onyinye kama ịhapụ flawa n'ihi nkwanye ugwu Ọkparaeze. E mepekwara akwụkwọ iti aka n'obi n'ịntanetị maka ndị ọhanaeze chọrọ idenye nkwanye ugwu ha.

E mechara wepụ ihe e ji ama ọkwa e debere n'ihu Buckingham Palace, nke e ji maa ọkwa ọnwụ ọkparaeze, n'ihi nchekasị na ọ ga-adọta igwe mmadụ. Mana ka o sila dị, ndị mmadụ ahapụla flawa, kaadị nakwa nkwanye ugwu ndị ọzọ n'ihu obieze nakwa na Windsor Castle, n'agbanyeghi na arịọrọ ha emela etu ahụ.

Ihe e ji maa ọkwa ọnwụ duke n'ihu Buckingham Palace

Ebe foto si, PA

Presentational white space

Na nso nso a, ụlọụka St George bụ ebe a nọ nwee emume ezinaụlọ, maka agbamakwụkwọ Ọkparaeze Harry na Meghan Markle nakwa Adaeze Eugenie na Jack Brooksbank n'afọ 2018.

Prince Philip
Black line