Nigeria vs Ghana: A zọgbughị Joseph Kabungo, ọ nwụrụ site n'obi nkoropụ - NFF

Dkta Joseph Kabungo,

Ebe foto si, NFF

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Otu na-achịkọta egwu bọọlụ na Naijiria bụ NFF n'ịchafụ ekwuola na ọ bụghị nzọgbu maọbụ ntigbu ka e tigburu Joseph Kabungo, onye ọrụ CAF, n'asọmpi Naijiria na Ghana gbara n'ụbọchị Tuzde.

Ghana na Naijiria gbara nhatanha (1-1) n'asọmpi ha gbara n'amaegwuregwu Moshood Abiola dị n' Abuja maka onye ga-etozu ịga asompi Iko Mbaụwa nke afọ 2022.

Akụkọ fegharịrị kwuru na e tigburu Kabungo bụ onye ọrụ CAF na tigbuo zọgbuo dapụtara n'ama egwuregwu ahụ ozigbo e gbubiri asọmpi ahụ.

Mana otu NFF kwuru n'akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtara ụbọchị Wenezde, na Kabungo nwụrụ site n'obi nkoropụ dịka o kubituchara mgbe ndị mmadụ na-achọ ụzọ ipụ n'amaegwuregwu ahụ.

Ọgbaghara dapụtara n'ama egwuregwu ahụ dịka ndị mmadụ wujuru n'ọgbọ egwuregwu ahụ malite kpawa aghara.

Dịka Odeakwụkwọ ukwu nke NFF bụ Dr Mohammed Sanusi sị kwuo, "Ozi si n'aka dọkịta anyị bụ Dr Onimisi Ozi Salami, bụ onye FIFa họpụtara dịka onye nlekọta ahụike n'asompi ahụ, kwuru na a hụrụ Kabungo ka ọ na-ekuli ume elu na nso ebe ndị Ghana na-agbanwe uwe. E wetara m ozi, m wee nye ha iwu ka ha buga ya ụlọọgwụ."

"Mana ọ nwụrụ dịka ha na-erute n'ụlọọgwụ."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'otu aka ahụ, Dr Salami kwuru na ọ bụ obi nkoropụ gburu Kabungo.

Dr Salami gwara ngalaba mgbasaozi NFF bụ nff.com na "ọ nwụrụ site n' obi nkoropụ (cardiac arrest)."

Ọ kọwara na ya na-aga n'ebe mgbanwe uwe ndị egwu bọọlụ Naijiria oge "onye nchịkọta si Saụt Afrịka bụ Kabore Hubert Bosilong bekuru ya.

"Ka m bịara, ahụrụ m Dr Kabungo ka ọ na-ekuli ume elu."

"Onye nchekwa Fifa maka asompi a bụ Dixon Adol Okello, onye Uganda, nọ ebe ihe a na-eme.""Anyị gbalịrị ịkpọlite ya ozigbo mana oge anyị hụrụ na ọ mịtaghị mkpụrụ, anyị tinyere ya n'ụgbọala ụlọọgwụ gbara ọsọ buga ya ụlọgwụ Cedar Crest Hospital dị n'Apo ebe ọ nọrọ kubie."

Dr Salami gara n'ihu tụọ arịrị na ụfọdụ mmadụ tụgharịrị akụkọ ahụ na-ekwuzi na a kụrụ ya ihe.

"Nke a bụ asị, Ọ bụ obi nkoropụ gburu ya."

Onye bụdị Joseph Kabungo

  • Joseph Kabungo, nwaafọ mba Zambia bụ dọkịta rụrụ ọrụ inyocha ahụ maka ọgwụike n'asọmpi Naijiria na Ghana nke ụbọchị Maachị 29,afọ 2022
  • Nwa amadi ahụ bụ onye ụlọọrụ 'Confederation of African Football'.
  • Kabungo bụbu dọkịta na-elekọta otu egwu bọọlụ mba Zambia malite 2003 rue 2016.
  • A họpụtara ya n'ime ndị nlekọta ahụike Fifa malite n'ọnwa Jenụwarị afọ 2017

Ndị mmadụ ewerela obi iwe na-akụrisi ihe n'ama egwuregwu Abuja

Ndị mmadụ na-emebi ihe n'ama egwuregwu dị n'Abuja

Ebe foto si, Screengrab

Dịka Ghana gbapụrụ Naịjirịa n'iko mba ụwa afọ 2022 taa bụ Tuzde, Maachị 29, ndị mmadụ ji iwe malite imebi ihe n'amaegwuregwu Moshood Abiola dị n'Abuja, ebe a nọrọ gbaa ya bụ asọmpi.

Onyonyo etu ndị mmadụ si jupụta n'ama egwuregwu ahụ na-akụrịsi ihe na-efesasị ebe niile na soshal midia ugbua.

N'onyonyo ahụ, a hụrụ ebe ndị mmadụ na-akụwasị ihe, hụkwa ka anwụrụ ọkụ na-alali elu n'ime ama egwuregwu ahụ.

Anwụrụ a dịka ọ bụ ikuku ose nke ndị ọrụ nchekwa na-eji achụsasị ndị mmadụ na-akpa aghara.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ghana na Naịjirịa gbara nhatanha site n'inye onwe ha otu goolu otu goolu.

Mana Ghana tozuru iso gbaa asọmpi Qatar 2022 n'ihi na ha nyere goolu n'Abuja mana Naịjirịa enyeteghị goolu oge ha gara Kumasi n'ụbọchị Fraịde, Maachị 25.

Ghana ewerela azịza zapụ Naịjirịa n'iko mba ụwa Qatar 2022

Nigeria na Ghana

Ndị Super Eagles nke Naịjirịa akwarala ngwongwo ha laa maka na ha agaghị eso agba asọmpi iko mba ụwa nke ga-adị na mb Qatar n'ọnwa Nọvemba afọ 2022.

Ọ bụ mba Ghana ji azịza zapụ Naịjirịa n'asọmpi a dịka ha nyere onwe ha otu goolu otu goolu.

Naíjiría na Ghana

Ebe foto si, CAF

Naịjirịa na Ghana nyere onwe ha otu goolu otu goolu n'agba nke mbụ nke asọmpi itozu oke maka iko mbaụwa nke afọ 2022, n'ama egwuregwu dị n'Abuja.

Mba Ghana bu ụzọ nyete goolu na nkeji iri na otu nke asọmpi ahụ, site n'aka Thomas Partey.

Mana Naịjirịa nyere goolu nke ha site na penariti nke William Troost-Ekong gbara, dịka a gbaturu Ademola Lookman n'ime obi goolu ndị Ghana.

Cheta na Naịjirịa enyetaghị goolu oge ha gara Ghana n'ụbọchị Fraịde, abalị 25 nke ọnwa Maachị 2022.

Ọ pụtara na dịka Ghana bu ụzọ nyete goolu n'Abuja, ndị Naịjirịa kwesịrị imeri ha emeri iji gafere, maka na nhatanha ọbụla agaghị enwe isi.

Fifa nwere iwu a na-akpọ 'away goals rule', nke bụ na ọ bụrụ na a gbaa nhatanha n'asọmpi, ndị ọbụla kacha nyeta goolu n'ụlọ ndị nke ọzọ, ga-enwe mmeri.

Ihe ị kwesịrị ịma maka asọmpi Naịjirịa na Ghana

Black Stars nke Ghana na Super Eagle nke Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Naịjiria na Ghana ga-achịpụ ya taa bụ Tuzde, abalị 29 nke ọnwa Maachị afọ 2022 n'ama egwuregwu Moshood Abiola dị n'Abuja, n'asọmpi itozu oke maka iko mbaụwa nke afọ 2022.

Cheta na Naijiria na Ghana gbaburu onwe ha onye lawa onye lawa n'asọmpi nke ha sọrọ na Kumasi Ghana n'ụbọchị Satọde gara aga.

Ka ọ dị ugbua, ndị Black Stars nke Ghana awụchielarị maka egwuregwu a ịma mbe na abọ nke bụ oke.

Ndị mmadụ na-atụ anya na asompi ahụ ga-akpụ ọkụ n'ọnụ n'ihi na mba abụọ a na-apụ ọkụ n'egwu bọọlụ n'Afrika.

Ọ bụ n'ihi nke a mere ụfọdụ ji ekwu na ọ hịara ahụ ikwu kpomkpwem onye ga-emeri n'asompi taa.

Ugboro ole Naijiria na Ghana zutere

Naịjirịa na Ghana

Ebe foto si, CAF

Naijiria na Ghana ejighị anya ahụ onwe ma a bịa n'okwu egwuregwu bọọlụ.

Mba abụọ a ezutela onwe ha n'asọmpi iri ise na isii (56).

N'ime ndị a, Ghana meriri na iri abụọ na ise (25), Naiijiria meriri iri na abụọ (12), ebe ha gbara nhatanha n'asọmpi iri na itoolu (19).

Ma lee asọmpi Iko mbaụwa ha zutere na onwe ha:

  • Na Septemba 10, afọ 1960, Naijiria na Ghana zutere maka asọpi onye ga-etozu ịga asompi Mba ụwa na Legọs. Ha gbara onwe ha abụọ abụọ.
  • Na Mee 10 afọ 1969, Naijiria na Ghana zutere na Legọs maka asompi itozu asompi Iko mbaụwa nke afọ 1970. Naijiria gbara ha ọkpụ abụọ, a sara otu.
  • N'otu ọnwa ahụ, n'abalị Mee 18 afọ 1969, ha zuekwara onwe ha ọzọ n'Accra, maka otu asompi ahụ. Ha gbara onwe ha onye lawa onye lawa.

Iwu Fifa dịka o si metụta ịnọ n'ụlọ gbaa asọmpi

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Kemgbe Naijiria na Ghana zutewere onwe ha n'asọmpi bọọlụ, Naijiria agbaala ha n'ụlọ ugboro iri abụo (20), merie n'asatọ (8), e merie ha n'atọ, ebe ha gbara nhatanha n'itoolu(9).

N'aka nke ọzọ, Ghana agbaala Naijiria n'ụlọ ha ugboro iri abụọ na atọ (23), merie n'iri na isii(16), e merie ha n'otu, ebe ha gbara onye lawa, onye lawa isii(6).

Ndị otu egwu bóólú Ghana na-amasí

Ebe foto si, Getty Images

Ugbua, ọ bụ n'ihu ama Naijiria ka a ga-asọ asọmpi a, kedụ ihe iwu Fifa kwuru?

Mpaghara 20.10, ihu akwụkwọ 29 nke Iwu Fifa kwuru sị, "Ọ bụrụ na otu egwu bọọlụ abụọ nweta ọkpụ bọọlụ ha nhatanha na asọmpi abụọ, ọkpụ ọbụla e nwetara n' asọmpi abụghị n'ụlọ a ga agụ ya abụọ."

Ọzọ, "Oge mgbakwụnye (extra time) bụ oge dị nnukwu mkpa n'agba nke abụọ...) Ọ bụrụ na otu egwu bọọlụ abụọ enye goolu ha nhatanha n'oge mgbakwụnye, otu bọọlụ bịara abịa ka a ga-akpọpụta dịka onye meriri n'asompi ahụ iji gbado ụkwụ n' iwu ịgụ otu goolu dịka abụọ."

Ihe ọ ga-eri Naijiria imeri n'asompi a

Dịka otu onye egwu bọọlụ doro anya bụ Andrew Ekejiụba siri kọwara BBC Igbo, " Ihe o ga- eri Naijiria bụ inweta 1-0 maọbụ 2-0 maọbụ 3- iji tozuo ịga iko mbaụwa."

"Ha ekwela ka Ghana nye goolu ọbụla n'ihi na ọ bụrụ na ha nye goolu ọbụla a ga-agụrụ ha ya ka e si agụ goolụ agbaghị n'ụlọ."

Ihe asọmpị a ji dị ụmụ Naijiria mkpa?

Ndí otu egwu bóólú Naijiria na-amasí

Ebe foto si, Getty Images

Obi na anya ọtụtụ ụmụ Naijiria dị n'asọmpi Naijiria na Ghana nwere taa.

A na-atụ anya n'ọtụtụ ndị mmadụ ga-apụta n'igwe dịka ụfọdụ otu pati YPP na ndị ọzọ egwu bọọlụ na-amsị zụọrọla ọtụtụ ndị ntorobịa akwụkwọ ikike ịbanye kirie ya n'amaegwuregwu Moshood Abiola.

Dịka Ekejiụba si kwuo, ihe o ji dị Naijiria mkpa imeri n'asompi a bụ na ọ bụ ya ga-ekwu onye ga-aga asompi iko mbaụwa.

"Asompi iko mbaụwa bụrụ otu egwu bọọlụ ọbụla maọbụ onye egwu bọọlụ nnukwu n'ihi na-eji isonye na ya agụkọ onye maọbụ mba bụ ọkaibe n'egwu bọọlụ n'ụwa."

"Ọ bụrụ na isonye n'iko mbaụwa dịka ọgba bọọlụ, ego ole ị na-ada ga-arị karịa."

Akụkọ ka na-abịa