Mba Ghana ga-ewepụ Milovan Rajevac dịka onye nkuzi otu bọọlụ ha

Cheta na Rajevac du mba Ghana ruo ntozu oke 'quater finals' n'asọmpị iko mbaụwa 2010

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cheta na Rajevac du mba Ghana ruo ntozu oke 'quater finals' n'asọmpị iko mbaụwa 2010

Mba Ghana ga-ewepụ Milovan Rajevac dịka onye nkuzi otu bọọlụ mba ha dịka ha achịtaghị aja n'asọmpị Afcon 2021.

Mba Comoros jị ọkpụ goolu atọ asatara abụọ chụpụ na manye Ghana ihere n'asọmpị ahụ n'ụbọchị Tuzde.

Cheta na mba Ghana họpụtara Rajevac ka ọchịkọta otu egwu bọọlụ ha ọzọ n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2021.

Akụkọ na-ekwu na mba ahụ ga-etinye onye nkuzi nnọchịteanya ga-ahazị otu bọọlụ ma kuziere ha dịka ha na-akwado isonye asọmpị iko mbaụwa nke Qatar 2022.

Cheta na Rajevac du mba Ghana ruo ntozu oke 'quater finals' n'asọmpị iko mbaụwa 2010.

Ndịagha mba Ukraine na-agagharị dịka a na-atụ anya agha.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndịagha mba Ukraine na-agagharị dịka a na-atụ anya agha.

Mba Amerịka ezigarala mba Ukraine ngwaagha pụrụiche dịka a na-atụ anya agha ịda n'etiti mba ahụ na mba Russia.

Ozi ngalaba na-anọchite anya mba Amerịka na Ukarine zipụtara n'akara Facebook ha dere:

"Nke a gosiri nkwado anyị nye mba Ukarine dịka ha na-agba mbọ ichekwa mba ha"

Cheta na odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Anthony Blinken kwuru n'izu okwyu gosiri na mba Amerịka nwereike ịkwado mba Ukraine ma mba Russia buso ha agha.

N'izu a, mba Russia wụchịrị n'oke mba Ukraine na nke ha mgbe mbido izu a agbanyeghi na ha gọrọ atụmatụ ime mwakpoo maọbụ buso ha agha.

Prịam minista mba Briten bụ Boris Johnson

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Prịam minista mba Briten bụ Boris Johnson

Ụfọdụ ndị omeiwu mba Briten anọ na nsogbu maka ịrụ Boris Johnson aka?

Otu onye n'ime ndị otu omeiwu mba Briten a na-akpọ ndị "Conservative" agaala izute ndị uweojii mba ahụ maka ebubo na Downing Street bụ ebe e mere oringo na-ese okwu, na-agba mbọ imesi ụfọdụ ndị omeiwu ike.

Ebubo a na-ekwu na Downing Street na-achọ isi n'ụzọ mmebiaha wee mesie ndị a ike.

William Wragg bụ otu onye n'ime ndị omeiwu a kwuru na ọ na aga izute ndị uweojii Met na mbido izu a na-abịa abịa.

Cheta na ọtụtụ ndị omeiwe mba ahụ ọkachasi ndị otu "Conservation" rụrụ Prịam minista mba ahụ bụ Boris Johnson aka ma na-ekwu ka o rituo n'ọkwa oche ya dịka ọ gara emume oringo emere na Downing Street n'afọ 2020 mgbe iwu nchekwa ọrịa Covid-19 megidere nke a.

Arnold Schwarzenegger, onye ejije Hollywood mba Amerịka a ma ama

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Arnold Schwarzenegger, onye ejije Hollywood mba Amerịka a ma ama

Onye ama ama n'ihe onyonyo nakwa ejije mba America bụ Arnold Schwarzenegger so n'ihe mberede okporoụzọ ahụrụ na Los Angeles n'ụbọchị Fraịde dịka ndị uweojii ebe ahụ kwuru.

Ndị uweojii steeti ahụ sị na otu onye meruru ahụ mana ọnweghị ihe mere Schwarzenegger.

O nweghị onye e jidere gbasara ya bụ ihe mberede dịka ndị uweojii gụpụrụ ọgwụike na mmanya dịka ihe nwereike ibute ya bụ ihe mberede okporoụzọ.