Ghana vs Cameroon: Thomas Agyepong agaghị eso na asọmpi nke taa

Eric Maxim na Andre Ayew

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyendu ndị otu egwu bọọlụ Black Stars nke Ghana bu Andre Ayew nakwa Thomas Agyepong esoghị na njikere ndị otu ha nwere iji kwadoo maka asọmpi ha na Cameroon taa.

Ndị na-elekọta ha kọwara na ahụ esichaghị Agyepong ike iso gbaa asọmpị ha na Cameroon, ebe a na-ele anya na Dede Ayew nwere ike i so gbaa ya bụ asọmpi.

Onye mgbasa ozi na ọnụ n'ekwuchitere ndi Black Stars bụ Dan Kwaku Yeboah kwuru sị na "Ndị nlekọta ahụike otu Black starts si na ha ka na atule ahuisiike Dede nke ha ga-eji mara ma ọ ga eso na asọmpi nke taa."

Otu egwuregwu bọọlụ Ghana

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Otu egwuregwu bọọlụ Ghana na-akwado asọmpị ha na Cameroon

Ayew na Agyepong merụrụ ahụ na asọmpi izizi nke dị n'etiti Ghana na Benin Republic mgbe mba abụọ ahụ gbara onwe ha 2-2.

Ihe onyonyo na-egosi na Andre Ayew nọ n'oche ka ndị otu ya na-eme njikere ụnyaahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'aka nke ọzọ, ndị otu egwu bọọlụ 'Indomitable Lions' nke Cameroun bụ ndị nke mbụ n'otu "Group F" dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie Guinea Bissau na asọmpi izizi ha.

Cameroun, bụ ndị buru iko AFCON n'afọ 2017, na-ele anya imeri Ghana taa iji wee gafee n'agba nke abụọ.

Clarence Seedorf bụ ọgba bọọlu a ma ama nke larala ezumike.

Ebe foto si, CAF/Twitter

Nkọwa foto, Aka na-achịkọta otu egwu bọọlụ Cameroon, Clarence Seedorf

Aka na-achịkọta otu egwu bọọlụ Cameroon bụ Clarence Seedorf kwuru na ha ga-agbali imeri Ghana ma gakwaa n'ihu buo iko AFCON ọzọ n'afọ a.

Asọmpi Ghana na Cameroon ga-ebiri ọkụ n'elekere isii nke uhuruchi taa, Satọde abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun 2019.

Otu egwuregwu bọọlụ Cameroon

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Otu egwuregwu bọọlụ Cameroon na-akwado asọmpị ha na Ghana
Ndo, ihe a akwadoghị brawụsa gị.

Akk ga-amasị gị: