"Ọ bụ ebe 2:30 ụzụ ụtụtụ ka akpọrọ m na ahịa m na-agba ọkụ"

Ọ bụ n'ụbọchị Monde ka ọkụ gbara n'ọtụtụ akụkụ ahịa Main Market dị n'Ọnịcha.
BBC laghachiri n'ahịa ahụ ịgba ụfọdụ ndị ahịa ajụjụ gbasara etu ya bụ ọkụ sị metụta ha.
Otu onye n'ime ndị gwara onye ntaakụkọ anyị okwu aha ya bụ Samson Odiagu kọrọ etu e si kpọọ ya n'ekwentị na ụlọahịa ya na-agba ọkụ.
Ọ sị "ọ bụ ụlọahịa m dị ihe a, a kpọrọ m ebe 2:30 nke ụzụ ụtụtụ, m gbara ọsọ bịa, tupu m na-abịa ọ bụrụ na ọkụ agbachaala ụlọahịa m"
Onye ntaakụkọ BBC ji anya ya hụ ụlọ abụo akpọo 'Plaza' nwere ọtụtụ ọdọ ahịa n'elu nakwa n'ala chọpụtara na ọdọahịa ndị gbara ọkụ karịrị iri ise.
Gbasara enyemaka gọọmentị na-enye ndị ahịa ahụ, Odiagu sị na ọ nụrụ na osote Gọvanọ Anambra steeti bụ Gilbert Ibezim bịara nleta n'ahịa ahụ mana o jighi anya nke ya hụ ya.

Ebe foto si, ABS
Gọvanọ Chukwuma Soludo ezipụtala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ nakwa ndị niile ihe ọdachị a metụtara.
Ozi ya kọwara “Ndị ọrụ gbata gbata mmenyụ ọkụ gbara mbọ menyụọ ọkụ a melitere ịgba ebe awa nke mbụ n’isi ụtụtụ Mọnde.”
“Anyị na-agba mbọ ịhụ na anyị tinyere usoro nchekwa maka ọkụ ndị a na-agba kwa mgbe kwa mgbe”
Soludo gara n’ihu kwuo na onyela Osote ya bụ Onyekachukwu Ibezim iwu na kọmịshọha ọkụ latrịka na mmiri bụ Julius Chukwuemeka nakwa Kọmịshọna ọrụ pụrụiche bụ Sly Ezeokenwa ka ha mee njem nleta gaa ebe ya bụ ihe mere ma zigara ndị ahụ ozi n’iti aka n’obi zuruoke.
Ihe BBC Igbo ma maka ọkụ gbara
Dịka naanị izuụka abụọ gachara ka ọkụ gbara ahịa n’Ogbogwu dị n’Onitsha Anambra Steeti, aọkụ agbaala akụkụ Kano steeti nke ahịa Main Market nke Onitsha.
A na-ekwu na ya bụ ọkụ gbara ọtụtụ ngwa ahịa ndị mmadụ ma gbatuo ọtụtụ ụlọ ahịa ebe ahụ.
Ndị ọrụ gbata gbata awụchịela dịka a na-agba mbọ imeyụ ya bụ ọkụ.
Odeakwụkwọ ukwu ngalaba gbata gbata nke State Emergency Management Agency (Sema) n’Anambra bụ Paul Odenigbo gbara BBC Igbo ama ọnọdụ ọkụ ọgbụgba a ma kwuo:
“Ya bụ ọkụ gbara n’ezie. Ọ malitere ịgba n’ime abalị dịka ndị nọ ebe ahụ siri kwuo.”
“Ndị ọrụ anyị awụchiela dịka ọkụ a gbara n’ọdụ ahịa ebe a na-ere ihe ndị nwereike ịgba ọkụ ngwa ngwa dịka ntutu isi ụmụnwaanyị, ihe ntacha nakwa ihe ndị ọzọ”
O kwuru na ka ọ dị ugbua na enweghi onye ya bụ okụ gbagburu maọbụkwanụ onye ọ merụrụ ahụ n’ihi ya bụ ọkụ gbara oge ndị mmadụ anọghị n’ahia.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ebe foto si, ABS
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kọwara ya bụ okụ gbara ngwa ahịa ndị mmadụ ọnụego ya ruru nde kwur nde.
Ọ gara n’ihu kwuo
“Nnyocha anyị gosiri na o nwereike ịbụ ọkụ latrịk kpatara ya bụ ọkụ ọgbụgba”
Ikenga kwukwara na ndị orụ ka nọ ebe ahụ ugbua na-enyocha ya bụ ọnọdụ nakwa isi ọkụ ahụ.

Ebe foto si, Ndị uweojii Anambra steeti
Akwa arịrị na-arị ibe ya elu n’akụkụ Kano street nke ahịa a bụ ebe ya bụ ọkụ malitere ịgba n’ime abali Sọnde.
Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ nakwa ndị agha Naịjirịa nọ n’ọrụ ebe ahụ dịka amabeghị ma e nwere ya bụ ọkụ merụrụ ahụ maọbụ gbagbuo.

Ebe foto si, Soludo TV










