Gịnị ka iwu Naịjirịa kwuru maka asambodo adịgboroja?

ihe ngosi e ji mara ụlọịkpe nọ n'ihu ụzọ esi abanye ụlọịkpe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọịkpe etiti Naịjiria nọ na Abuja
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mgbe ọbụla a nụrụ maka onye nwere akpụrụakpụ maọbụ asambodo adịgboroja, otu ihe ndị mmadụ adịghị ajụ ngwangwa bụ kedụ ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ya?

Ajụjụ ọzọ a dịghị ajụ bụ kedụ ntaramaahụhụ dịrí onye nwe asambodo akpụrụakpụ?

N'akụkọ a BBC Igbo gbara onye ọkaiwu ajụjụ ọnụ ma nweta nkọwa ihe iwu Naịjirịa kwuru maka asambodo adịgboroja nakwa ihe ndị ọzọ mmadụ kwesiri ịmara maka ya.

Kedụ ihe asambodo adịgboroja bụ?

Tupu anyị agawa gị ihe iwu Naịjiria kwuru gbasara asambodo adịgboroja, kedụ ihe asambode adịgboroja bụ?

Ramadan Abisodun Hammed onye ọkaiwu kwuru na iwu Naịjiria megidere onye ọbụla ji asambodo adịgboroja arụ ọrụ.

Iwu mpu afọ 2007 nke a kpọrọ 'Criminal code' ngalaba 465 ma ọ bụ iwu nke Naịjiria akpọrọ Laws of Federation of Nigeria afọ 2004 kọwara ihe bụ asambodo adịgboroja.

Hammed si asambodo adịgboroja dịka iwu abụọ ndị ọkpọrọ aha ha si kwuo bụ ihe ọbụla ekwupụtara ma ọ bụ ihe edeere na akwụkwọ nke mmadụ chọrọ I ji duhe ndị mmadụ ebe onye ahụ ma na ihe ahụ bụ ụgha bụ adịgboroja. Ọ gara n'ihu kwuo na ihe ọ bụla emere na akwụkwọ iji tugharịa ya etu okwesịrị isi adị na mbụ dịka igbanwe akara ya, mbinye ya nakwa stampụ ya.

"Onye ọ bụla na-eme akwụkwọ ụgha ma ọ bụ mgbanwe ọ bụla na akwụkwọ ọ bụla na-ebumnobi imebi ma ọ bụ ịmerụ ọha ahụ ma ọ bụ iduhe mmadụ ma ọ bụ ime aghụghọ, a na-akpọ akwụkwọ ahụ adịgboroja"

Gịnị bụ ntaramaahụhụ dịrị asambodo adịgboroja?

Onye ọkaiwu Ramadan Abisodun Hammed

Ebe foto si, BBC/Ramadan Abisodun Hammed

Nkọwa foto, Mpu asambodo adịgboroja bụ mkpọrọ afọ atọ.

Dịka ọkaiwu Hammed si kwuo, Iwu mpu afọ 2007 nke Naịjiria ngalaba 467, ntaramaahụhụ dịrị onye mere mpu asambodo adịgboroja bụ ịtụ onye ahụ mkpọrọ afọ atọ.

Ya bụrụ onye ahụ ji asambodo adịgboroja ahụ arụ ọrụ, a ga-achụ onye ahụ n'ọrụ n'agbanyeghị ọkwa ọnye ahụ ma ọbu ebe onye ahụ na-arụ.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro anyị