June 12: Ọkpụrụkpụ okwu Onyeisiala Tinubu kwuru n'ozi 'Democracy Day'

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
Dịka Naịjirịa na-eme emume ncheta ụbọchị ọchịchị onyekwuoucheya nke Bekee kpọrọ 'Democracy Day', Onyeisiala Bola Tinubu gwara ndị Naịjirịa okwu n'ọgbakọ ụlọomeiwu Sineti na ụlọomeiwu nta nke e kesara n'onyonyoo TV.
N'okwu ya, Onyeisiala Tinubu kelere Muhammadu Buhari bụbu onyeisiala maka ịgbanwe ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ka ọ bụrụ na Juun 12 iji kwanyere Moshood Abiola meriri ntuliaka Juun 12, 1993 ugwu.
Onyeisiala Tinubu kelekwara ọtụtụ ndị ọzọ gbara mbọ n'ụzọ dị iche iche iji hụ na ọchịchị onyekwuoucheya nọsiriike na Naịjirịa.
Ndị ahụ gụnyere Alhaja Kudirat Abiola, Pa Alfred Rewane, Anthony Enahoro, Dan Suleiman, Abraham Adesanya, Ayo Adebanjo, Gani Fawehinmi, Balarabe Musa, Bagauda Kaltho, Ndubuisi Kanu na ọtụtụ ndị ntaakụkọ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nke ọchịchị ndịagha nwụchiri ma tụọ mkpọrọ.
O kwuru na ọchịchị na-echeta mbọ mmadụ ndị a na ndị ọzọ rụrụ ọrụ iji hụ na Naịjirịa nọ n'ogogo ọ nọ taa.

Ebe foto si, Screenshot
Onyeisiala kwuru na gọọmenti ga-aga n'ihu ihụ na ọchịchị onyekwuoucheya guzosiriike na Naịjirịa ma kelee ụlọomeiwu Sineti na ụlọomeiwu nta Naịjirịa maka mbọ ha na-agba iweta ọganihu Naịjirịa.
Maka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa, Onyeisiala Tinubu kwuru na mbọ ọchịchị ya na-agba amalitela ịmịta mkpụrụ. Ọ gara n'ihu kwuo na ọnụego nri dịka osikapa, agwa na ihe ndị ọzọ ebelatala nke ukwuu.
O kwuru na n'ọnwa Julaị 2025, gọọmenti ya ga-ewepụta atụmatụ ga-enye ndị ntorobịa ruru puku narị anọ ohere inweta mgbaziye ego iji nyere ndụ ha aka ma, kwe nkwa ịkwalite ọnọdụ agụmakwụkwọ, ime ka ndị ntorobịa nwee ọrụ ma weta ọzụzụ n'aka ọrụ dị iche iche site n'atụmatụ NELDUND.
Banyere nchekwa, Onyeisiala Tinubu kwuru na gọọmenti ya na-enweta mmeri na n'agha ha na-ebuso ndị na-eyi ọha egwu na ndị omekome dị iche iche iji hụ na ezi nchekwa laghachitara na Naịjirịa. O kwuru na ugbua, enwere ezi nchekwa n'okporoụzọ ma kelee ndịagha Naịjirịa maka ezi mbọ ha na-agba ichekwa Naịjirịa.
Onyeisiala Tinubu kpọrọ oku ka onye ọbụla jikọọ aka ọnụ iji hụ maka agamnihu Naịjirịa nke o kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị onye Naịjirịa ọbụla.

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
Banyere akụkọ na-ekwu na APC chọrọ itinye onwe ya dịka naanị pati nọ na Naịjirịa, Onyeisiala Tinubu kwuru na okwu ahụ abụghị eziokwu ma kọwaa ya dịka aka ọrụ ndị na-agba ya mgba okpuru.
O kwuru na ya ekwenyeghị maọbụ nwee atụmatụ ime ka Naịjirịa nwee naanị otu pati maka na ọ bụghị ihe ziri ezi.
Ọ gara n'ihu kwuo na pati ya bụ All Progressives Congress (APC) dị njikere ịnabata onye ọbụla si pati ọzọ chọrọ isonyere ha. Nke a bụ dịka ọ nabatara Gọvanọ Sheriff Obroevwori na-achị Delta Steeti na Gọvanọ Akwa Ibom bụ Umo Eno na ndị omeiwu ndị ọzọ batara na pati APC na nso nso a.
O kwuru na enweghị oge ọ gwara INEC ka ha ghara idebanye aha maọbụ kagbuo aha pati ọbụla.
Ndị Onyeisiala Tinubu nyere 'National Honor'

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisiala Tinubu gara n'ihu kwanyere ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa mere oke ihe dị iche iche n'oge gara aga ụfọdụ n'ime ha bụ ndị larala mụọ ugwu mba 'National Honor'.
Ndị ahụ gụnyere nwunye MKO Abiola nwụrụ anwụ bụ Kudirat Abiola, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka Humphrey Nwosu na onye bụbu onyeisiala Shehu Yar' Adua.
Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ dị mkpa ugbua ọchịchị onyekwuoucheya gbara afọ 26 ikwanyere ndị a gbara mbọ dị iche iche ịhụ na Naịjirịa nọ ebe ọ nọ taa ugwu.
Onyeisiala Tinubu nyere Rear Admiral Ndubuisi Kanu (CON), Alhaji Balarabe Musa (CFR), Pa. Alfred Rewani (CFR), Bagauda Kaltho (OON), Chima Ubani (OON), Dr. Beko Ransome-Kuti (CON), Alao Aka Bashorun (CON), Frank Kokori (CON), Emma Ezeazu (OON), Bamidele Aturu (OON) na Fredrick Fasehun (CON) ugwu mba Naịjirịa.
Ndị ọzọ bụ Ọkankụzi Festus Iyayi (CON), Dr John Yima Sen (OON), Alhaja Sawaba Gambo (CON), Dr Edwin Madunagu (CON), Dr Alex Ibru (CON), Bola Ige (CFR), Pa. Reuben Fasoranti (CFR), Sen. Ayo Fasanmi (CON), Sen. Polycarp Nwite (CON) na Dr Nurudeen Olowopopo (CON) ya na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ihe mere June 12 ji bụrụ ụbọchị dị oke mkpa na Naịjirịa

Ebe foto si, Facebook/Getty Images
Juun 12 afọ ọbụla bụ ụbọchị dị oke mkpa na Naịjirịa maka na ọ bụ ụbọchị e ji echeta ọchịchị onyekwuoucheya, mana ọ bụghị etu ọ dịbu na mbụ.
N'ọnwa Mee 29, 1999, Naịjirịa banyere n'ọchịchị onyekwuoucheya. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka ndịagha nyefere ọchịchị n'aka Olusegun Obasanjo.
Kemgbe ahụ, Naịjirịa na-echeta ụbọchị ọchịchị onyekwuoucheya n'ọnwa Mee 29. Mana na Juun 6, 2018, Muhammadu Buhari bụbu onyeisiala nyere iwu ma kwuo na Juun 12 bụ ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya n'agbanyeghị na a ga-edu Onyeisiala na ndị Gọvanọ n'iyi ọrụ na Mee 29.
Buhari kwuru na Juun 12 bụ ụbọchị dị oke mkpa na Naịjirịa karịa Mee 29 na Ọktoba 1 bụ ụbọchị ncheta nwereonwe Naịjirịa n'aka ndị ọcha.
Gịnị mere na Juun 12, 1993?

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ na Juun 12, 1993 ka e mere ntuliaka iji họpụta onyeisiala ga-ewere ọchịchị n'aka Ọchịagha Ibrahim Babangida.
Buhari kwuru na Juun 6, 2018 na 'Ntuliaka Juun 12, 1993 bụ naanị ntuliaka e mere n'ụzọ kwụrụ ọtọ kemgbe Naịjirịa nwereonwe ya n'afọ 1960' n'agbanyeghị na ọchịchị ndịagha nke Babangida nọ n'isi ya kagburu mpụtara ntuliaka ahụ.
Babangida jụrụ ịnabata mpụtara ntuliaka ahụ nke ọ bụ Moshood Abiola meriri. Ọ bụ nke mere ọgbaaghara malite na Naịjirịa. Ọgbaaghara ruruafọ isii butere ọnwụ Abiola na nwunye ya Kudirat Abiola.
Moshood Abiola bụ onye ji ego achụego zọrọ ọkwa onyeisiala na pati Social Democratic Party (SDP). Ọ bụ onye maara ihe ekwe na-akụ banyere akụnaụba nke achụmnta vootu gbadoro ọkwụ n'ịchụ ụbịam ọsọ ụkwụ eru ala na Naịjirịa.
Abiola meriri Bashir Tofa nke pati National Republican Convention (NRC) na ntuliaka ahụ. O meriri Tofa na steeti ya bụ Kano, ọ bụ nke mere ka ọtụtụ kwuo na o mere ntuliaka ahụ n'ụzọ kwụrụ ọtọ.

Ebe foto si, Getty Images
Babangida kagburu ntuliaka ahụ ma kwuo na ụlọikpe nyere iwu ka a ghara ime ntuliaka ahụ.
Ọ bụ n'afọ 1993 ka Sani Abacha nwere ọkwa dịka onyeisiala mana o kweghị ịnabata mpụtara ntuliaka ahụ. Nke butere ọtụtụ ngagharịiwe na Naịjirịa nke Onyeisiala Bola Tinubu nọ n'ọchịchị ugbua so na ya.
Juun 12, 1994, Abiola kwupụtara onwe ya dịka onyeisiala Naịjirịa. Nke a mere ka Abacha nwụchie ma tụọ ya mkpọrọ.
Abiola nwụrụ na Julaị 7, 1998. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka e kwesịrị ịtọhapụ n'ụlọmkpọrọ dịka Abacha nwụrụ. Akụkọ kwuru na e nyere Abiola nsi iji gbuo ya n'ụlọmkpọrọ.









