E liri ozu Gentleman Mike Ejeagha n'ime otu ụbọchị ọ nwụrụ

Ebe foto si, Ejeagha Family
E liri ozu otiegwu a ma ama bụ Gentleman Mike Ejeagha n'ụbọchị Satọde 7 Juun 2025 n'ụlọ ya dị n'Owa Imezi nke Okpuruọchịchị Ezeagu, Enugwu Steeti.
Nke a na-abịa dịka Mike Ejejagha nwụrụ n'ụbọchị Fraịde 6 Juun n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị dịka nwa ya si kwuo.
Di ọkpara ya bụ Emmanuel Ejeagha gwara BBC Igbo na nna ya nyere ha ndụmọdụ banyere olili ozu ya tupu ọ nwụọ.
"Nna m gwara anyị na ọ chọghị ka e tinye ozu n'ọba ozu ma ọ nwụọ, ọ bụ ya mere anyị ji eli ozu ya taa bụ Satọde 7 Juun, 2025" ka Emmanuel Ejeagha gwara BBC Igbo.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha emecha olili ozu ya, na ezinaụlọ Ejeagha ga-ewepụta ozi banyere ụbọchị a ga-eme emume akwamozu Gentleman Mike Ejeagha nakwa ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ.
Ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma maka Gentleman Mike Ejeagha

Ọkpara Mike Ejeagha bụ Emmanuel Chibuike Ejeagha akọwaala na ọ bụ eziokwu na nna ya anwụọla.
O kwupụtara nke a oge ya na onye ntaakụkọ BBC News Igbo nwere mkparịtaụka n'ụlọ ha dị n'Abakpa Nike n'Enugwu steeti.
Maazị Emmanuel kwuru na ugboro ugboro ka ndị mmadụ na-ebugharị akụkọ ụgha na nna ya anwụọla mana ọ bụ ugbua ka ọ nwụrụ n'eziokwu.
Dịka o siri kwuo, nna ya bụ onye a ma ama ma bụrụkwa onye a pụghị ikpuchi ọnwụ ya.
Ọ kọọrọ anyị ụfọdụ ihe ọ maara gbasara nna ya nwụrụ anwụ.
Lee ihe ụfọdụ i kwesịrị ịma maka otiegwu Mike Ejeagha
- Mike Ejeagha bụ onye Owa Imezi dị n'okpuru ọchịchị Ezeagu nke Enugwu steeti.
- A mụrụ ya n'afọ 1930.
- Ọ bụ otiegwu highlife mana ihe mere nke ya jiri pụọ iche bụ na ọ na-eji egwu ya akọ akụkọ ifo n'ụdị 'akụkọ n'egwu'.
- Ọ gara akwụkwọ pramarị n'ụlọakwụkwọ St Patrick dị n'ogbete Enugwu.
- N'afọ 1945, ọ banyere otu egwu 'Coal Camp Boys' a maara dịka ndị na-eti egwu igbo nke ọma.
- A maara ya nke ọma dịka 'Gentleman'.
- Ụfọdụ egwu ya gụnyere "Ka e si ree onyeisioche", bụ nke wuru ewu dịka "gwo gwo gwo ngwo", "Ụwa Mgbede", "Obiako", na ọtụtụ ndị ọzọ.
- O mechara rụọ ọrụ n'ụlọmgbasaozi Nigeria Broadcasting Service dịka onye nhazi mmemme Guitar Playtime a na-eme na redio.
- O hiwere otu egwu Premier Dance Band mana o mechara ghasaa ya n'oge agha Bịafra malitere.
- N'afọ 1972, Mike Ejeagha rụrụ ọrụ n'ụlọmgbasaozi Nigeria Television Authority dịka onye na-achịkọta mmemme asụsụ igbo a kpọrọ Akụkọ n'Egwu. O mere ka mmemme ahụ bụrụ ọkaibe.
- Mike Ejeagha nyere aka kwalite egwu asụsụ Igbo
- Dịka ọkpara ya siri kwuo, a wara ya ahụ n'ọnwa Mee maka ọrịa ọ kpọghị aha.
- Ọ nwụrụ n'ụbọchị Fraịde 6 Juun 2025 n'ụlọọgwụ 82 Division Hospital Enugwu.
- Ọ gbara afọ iri itoolu na ise (95) tupu ọ nwụọ.
Ihe Onyeisiala Tinubu, Gọvanọ Peter Mbah na Atiku Abubakar kwuru maka ọnwụ ya

Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/Facebook
Aka na-achị Enugwu steeti bụ Gọvanọ Peter Mbah akọwaala ọnwụ Gentleman Mike Ejeagha dịka ihe mwute nye ya, ezinaụlọ ya, ndị Enugwu Steeti, ala Igbo na Naịjirịa niile.
N'akwụkwọ ozi o wepụtara ụbọchị Satọde 7, Juun, 2025, Gọvanọ Petere Mbah kọwara Mike Ejeagha dịka nwoke nwere obi umeala, na-akpa ezi agwa ma hụ asụsụ Igbo n'anya.
O kwuru na egwu Ejeagha bụ ọpụrụiche kwalitere egwu akụkọ ifo a maara n'ụwa niile taa.
Gọvanọ Mbah gara n'ihu zigara ezinaụlọ Ejeagha ozi iti aka n'obi ma kwe ha nkwa na gọọmenti Enugwu steeti ga-enye ha nkwado zuruoke n'oge iru uju ma hụ na a na-echeta mbọ ọ gbara iwulite asụsọ Igbo nakwa egwu akụkọ ifo. Ọ rịọrọ ka Chukwu kasie ezianụlọ Ejeagha obi.

Ebe foto si, Social Media
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisiala Bola Tinubu na ndị ọzọ a ma ama ezigala ozi iti aka n'obi nye ezinaụlọ otiegwu Gentleman Mike Ejeagha lara mmụọ ụbọchị Fraịde 6 Juun, 2025.
N'ozi onye ndụmọdụ onyeisiala bụ Bayo Onanuga binyere aka, Onyeisiala Tinubu kọwara Mike Ejeagha dịka otiegwu tọrọ ntọala egwu akụkọ ifo na Naịjirịa. O kwuru na egwu ya kwalite omenaala na asụsụ Igbo.
Onyeisiala Tinubu toro Gọvanọ Peter Mbah na-achị Enugwu steeti maka mbọ ọ gbara icheta Mike Ejeagha na ndụ.
O tiri ezinaụlọ Ejeagha aka n'obi ma rịọ ka mkpuru obi ya zuo ike na ndọkwa.
Onye bụbu Osote Onyeisiala Naịjirịa Atiku Abubakar kwuru na egwu Mike Ejeagha wetara ma kwalite egwu akụkọ ifo. O tokwara Brain Jotter na-eme ihe ntọọchị maka ime ka egwu 'Gwo gwo gwo ngwo' bụrụ nke wuru ewu na nso nso a tupu Mike Ejeagha laa mmụọ.
Peter Obi toro Mike Ejeagha ma kwuo na egwu ya bụ nke a ga-echeta ruo ọtụtụ afọ na-abịa n'ihi na ọ bụ egwu na-akwalite eziokwu, omenaala, asụsụ Igbo ma bụrụ nke na-akụzi ọtụtụ ihe mmụta.
Gentleman Mike Ejeagha anwụọla

Mike Ejeagha a maara nke ọma maka "akụkọ n'egwu" anwụọla ka ọ gbachara afọ 95.
Ochie dike ahụ bụụrụ onye aha ya na-ada ụda maka egwu Highlife ndị o ji akọ akụkọ ifo dị iche iche.
Ọkpara ya bụ Emmanuel Ejeagha kọọrọ BBC News Igbo na nna ya nwụrụ n'ụlọọgwụ 82 Division Hospital dị n'Enugwu mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere asatọ nke abalị n'ụbọchị Fraịde 6 Juun 2025.
Ejeagha nwụrụ ka ọ rịachara ọrịa were ogologo oge, bụ nke ezinaụlọ ya akpọghị aha.
Aha Mike Ejeagha wuru ewu na Naịjirịa n'ime afọ ndị 1980 n'ihi ụdị egwu pụrụiche ọ na-eti.
Na nso nso a ka nwaafọ Naịjirịa na-eme ihe ntọọchị aha ya bụ Brain Jotter jiiri otu egwu Mike Ejeagha mepụta ihe ngosi.
Ihe ngosi ahụ a maara dịka "gwo gwo gwo ngwo" fesara ebe niile ma meekwa ka ụmụ ọgbọ ọhụrụ mata onye bụ Mike Ejeagha.









