Etu nwaanyị gbara alụkwaghịm si mụnye nwunye nwanne di ya ọkụ n’Owerri

Ebe foto si, Nwaokoro Uchechukwu/Facebook
Ọtụtụ akụkọ apụtala ihe banyere nwaanyị a sị gburu nwunye nwanne di ya n’Owerri, Imo steeti.
Ọnwụ nwada Uchechukwu Faith Nwaokoro so n’ọnwụ ndị na-agbawa obi merela na mbido afọ 2023 a.
N’ajụjụọnụ BBC Pidgin jụrụ di nwaanyị a bụ Emmanuel Nwaokoro na nwanne ya nwaanyị bụ Nwanneka Ifurunna, ha sị na ha aghọtaghị ihe butere o jiri gbuo nwaanyị a.
Ha kwuru na ha amaghị ma o nwere ihe na-esere Uche na nwaanyị a gburu ya, bụkwanụ onye ndị uweojii na-achọ ugbua.
Uchechukwu nwụrụ site nnukwu ọkụ gbara ya mgbe nwunye nwanne di ya mụnyere ụlọ ha ọkụ.
Etu ihe si mee
Ihe a mere n’ụbọchị 5 Jenụwarị afọ 2023 n’obodo Mgbirichi dị n’okporoụzọ Owerri gawara Port Harcourt dị n’akụkọ ebe a kpọrọ ‘Abuja bus stop’ nke Owerri, Imo steeti.
O mere n’ụlọ ha nwere ọnụ mkpuka atọ (3 bedroom) ebe nwaanyị gburu Uche na di ya bi n’ọnụ ụlọ abụọ ebe Uche na di ya bi n’otu ọnụ ụlọ.
“Nwanne m nwaanyị na nwaanyị a lụrụ di n’ime otu ezinaụlọ. Nke bụ na ha lụrụ ụmụnne nwoke abụọ, ha niile bikọta n’ime otu ụlọ (flat),” ka Nwanneka Ifurunna kwuru.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ kwuru na nwaanyị a bụ onye ya na di ya gbara alụkwaghị n’ọnwa Ọktoba, 2022 lọghachịrị ịbịa kwara ngwo ngwo ya n’ụlọ ha dị na Mgbirichi.
Nwaokoro kwuru “Nwaanyị a bịara mgbe di ya anọghị n’ụlọ. Anyị kpọrọ di ya bụ nwanne m nwoke, gwa ya na nwunye ya bịara.
“Ọ sị ka anyị mepeere ya ụzọ ka ọ kwara ngwo ngwo ya ndị ọ chọrọ.
“Dịka o mechara nwaanyị a alaghizi maka na chi ejiela. Kama ọ ga-ehi n’ime ụlọ ha o bupụtere akwa ha n’ime ‘parlour’ bịa dinaa.
“N’ihe dịka elekere otu nke ụtụtụ, nwunye m Uchechukwu hụrụ ka anwụrụọkụ batara n’ime ụlọ anyị. Mgbe anyị tetara ka anyị hụrụ ọkụ na-agba.
“Emere m ngwa ngwa buru mmiri menyụọ ọkụ ahụ, ọ nyụchaghị ọfụma mana o belatara.
“Nwunye m gbapụtara n’ime ụlọ mana o tiri mkpu ozugbo ma sị na mmadụ wụrụ ya ihe n’ahụ. Na-egbughi oge ahụ nwunye m nwuuru ọkụ.
“Amaghịzi m ihe m ga-eme, ọ bụ m chụwa nwaanyị a ọsọ ka ọ bụ m ịzọpụta nwunye m.
“Ekpebiri m ịzọpụta nwunye m ma chọta ụzọ menyụọ ọkụ ahụ na-agba ya, mana ọkụ ahụ erepịala ya ahụ.”
‘Nwunye nwanne m nwoke riri mbọ mbọ ọsọ’

Ebe foto si, Nwaokoro Uchechukwu/Facebook
Nwoke e gburu nwunye sị na ọ ka na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya etu nwaanyị kpara arụ a si gbaa ọsọ.
O kwuru “anyị bi n’ụlọ elu ogogo atọ ebe ọnụ ụlọ anyị dị n’ogogo nke atọ ahụ.
Dịka ọkụ a na-agba anyị ahụzighi nwunye nwanne m nwoke. Ọ bụzi ndị agbataobi anyị kwuru na ha hụrụ ka o si n’ogogo nke mbụ wutuo maka na o cheere na a gbachiri ụzọ e si agbatu n'ala (staircase).
“rute ugbua anyị ahụbeghi nwaanyị a anya. Anya agaala n’obodo anyị ebe o si bịa mana a hụghị ya ebe ahụ.”
Nwoke a sị na o buuru nwunye ya gaa n’ụlọọgwụ dị iche iche mana nwunye ya mechara nwụọ.
Ihe nwereike ibute mwakpo a
Nneka Ifurunna bụ nwanne Uchechukwu kwuru na ọ maghị ihe nwunye nwanne di ya jiri gbuo ya.
O kwuru na nwanne ya nwaanyị abụghị onye na-achọ okwu na ụka, na aka ya adịghị na nkewa nwaanyị a na di ya.
Emmanuel Nwaokoro sị nwaanyị a gburu nwunye ya na-eche na ọ bụ nwunye mere ka ya na di ya gbaa alụkwaghịm.
“Mana ọ bụ asị. Ịkwa gị eziokwu ọ bụ anyị na-ekpeziri ha ma ha na-ese okwu.
“Nwanne m nwoke na nwunye ya mụrụ ụmụ atọ mana anyị amụtabeghi. Anyị ka na-anwa na-ekpere Chineke maka nwa.
“Ọ bụ eziokwu na anyị na ha bikọta n’ụlọ mana anyị na-akwụ ụgwọ ụlọ, ọ bụghị n’efu.”
Mbọ niile a gbara ịnụta n’ọnụ ndị uweojii Imo steeti amịtaghị mkpụrụ ọbụla - ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam azaghị oku a kpọrọ ya.
Mana ngalaba ndị uweojii Umuagwo ji okwu ahụ sị na na-elebasi okwu a anya ike.









