Etu nwaanyị gbara alụkwaghịm si mụnye nwunye nwanne di ya ọkụ n’Owerri

Nwaanyị nwunye nwanne di ya mụnyere ọkụ

Ebe foto si, Nwaokoro Uchechukwu/Facebook

Ọtụtụ akụkọ apụtala ihe banyere nwaanyị a sị gburu nwunye nwanne di ya n’Owerri, Imo steeti.

Ọnwụ nwada Uchechukwu Faith Nwaokoro so n’ọnwụ ndị na-agbawa obi merela na mbido afọ 2023 a.

N’ajụjụọnụ BBC Pidgin jụrụ di nwaanyị a bụ Emmanuel Nwaokoro na nwanne ya nwaanyị bụ Nwanneka Ifurunna, ha sị na ha aghọtaghị ihe butere o jiri gbuo nwaanyị a.

Ha kwuru na ha amaghị ma o nwere ihe na-esere Uche na nwaanyị a gburu ya, bụkwanụ onye ndị uweojii na-achọ ugbua.

Uchechukwu nwụrụ site nnukwu ọkụ gbara ya mgbe nwunye nwanne di ya mụnyere ụlọ ha ọkụ.

Etu ihe si mee

Ihe a mere n’ụbọchị 5 Jenụwarị afọ 2023 n’obodo Mgbirichi dị n’okporoụzọ Owerri gawara Port Harcourt dị n’akụkọ ebe a kpọrọ ‘Abuja bus stop’ nke Owerri, Imo steeti.

O mere n’ụlọ ha nwere ọnụ mkpuka atọ (3 bedroom) ebe nwaanyị gburu Uche na di ya bi n’ọnụ ụlọ abụọ ebe Uche na di ya bi n’otu ọnụ ụlọ.

“Nwanne m nwaanyị na nwaanyị a lụrụ di n’ime otu ezinaụlọ. Nke bụ na ha lụrụ ụmụnne nwoke abụọ, ha niile bikọta n’ime otu ụlọ (flat),” ka Nwanneka Ifurunna kwuru.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ kwuru na nwaanyị a bụ onye ya na di ya gbara alụkwaghị n’ọnwa Ọktoba, 2022 lọghachịrị ịbịa kwara ngwo ngwo ya n’ụlọ ha dị na Mgbirichi.

Nwaokoro kwuru “Nwaanyị a bịara mgbe di ya anọghị n’ụlọ. Anyị kpọrọ di ya bụ nwanne m nwoke, gwa ya na nwunye ya bịara.

“Ọ sị ka anyị mepeere ya ụzọ ka ọ kwara ngwo ngwo ya ndị ọ chọrọ.

“Dịka o mechara nwaanyị a alaghizi maka na chi ejiela. Kama ọ ga-ehi n’ime ụlọ ha o bupụtere akwa ha n’ime ‘parlour’ bịa dinaa.

“N’ihe dịka elekere otu nke ụtụtụ, nwunye m Uchechukwu hụrụ ka anwụrụọkụ batara n’ime ụlọ anyị. Mgbe anyị tetara ka anyị hụrụ ọkụ na-agba.

“Emere m ngwa ngwa buru mmiri menyụọ ọkụ ahụ, ọ nyụchaghị ọfụma mana o belatara.

“Nwunye m gbapụtara n’ime ụlọ mana o tiri mkpu ozugbo ma sị na mmadụ wụrụ ya ihe n’ahụ. Na-egbughi oge ahụ nwunye m nwuuru ọkụ.

“Amaghịzi m ihe m ga-eme, ọ bụ m chụwa nwaanyị a ọsọ ka ọ bụ m ịzọpụta nwunye m.

“Ekpebiri m ịzọpụta nwunye m ma chọta ụzọ menyụọ ọkụ ahụ na-agba ya, mana ọkụ ahụ erepịala ya ahụ.”

‘Nwunye nwanne m nwoke riri mbọ mbọ ọsọ’

Nwaanyị e gburu na di ya Emmanuel

Ebe foto si, Nwaokoro Uchechukwu/Facebook

Nwoke e gburu nwunye sị na ọ ka na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya etu nwaanyị kpara arụ a si gbaa ọsọ.

O kwuru “anyị bi n’ụlọ elu ogogo atọ ebe ọnụ ụlọ anyị dị n’ogogo nke atọ ahụ.

Dịka ọkụ a na-agba anyị ahụzighi nwunye nwanne m nwoke. Ọ bụzi ndị agbataobi anyị kwuru na ha hụrụ ka o si n’ogogo nke mbụ wutuo maka na o cheere na a gbachiri ụzọ e si agbatu n'ala (staircase).

“rute ugbua anyị ahụbeghi nwaanyị a anya. Anya agaala n’obodo anyị ebe o si bịa mana a hụghị ya ebe ahụ.”

Nwoke a sị na o buuru nwunye ya gaa n’ụlọọgwụ dị iche iche mana nwunye ya mechara nwụọ.

Ihe nwereike ibute mwakpo a

Nneka Ifurunna bụ nwanne Uchechukwu kwuru na ọ maghị ihe nwunye nwanne di ya jiri gbuo ya.

O kwuru na nwanne ya nwaanyị abụghị onye na-achọ okwu na ụka, na aka ya adịghị na nkewa nwaanyị a na di ya.

Emmanuel Nwaokoro sị nwaanyị a gburu nwunye ya na-eche na ọ bụ nwunye mere ka ya na di ya gbaa alụkwaghịm.

“Mana ọ bụ asị. Ịkwa gị eziokwu ọ bụ anyị na-ekpeziri ha ma ha na-ese okwu.

“Nwanne m nwoke na nwunye ya mụrụ ụmụ atọ mana anyị amụtabeghi. Anyị ka na-anwa na-ekpere Chineke maka nwa.

“Ọ bụ eziokwu na anyị na ha bikọta n’ụlọ mana anyị na-akwụ ụgwọ ụlọ, ọ bụghị n’efu.”

Mbọ niile a gbara ịnụta n’ọnụ ndị uweojii Imo steeti amịtaghị mkpụrụ ọbụla - ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam azaghị oku a kpọrọ ya.

Mana ngalaba ndị uweojii Umuagwo ji okwu ahụ sị na na-elebasi okwu a anya ike.