Ihe ndị otu Tinubu sara make ebubo iwakpo ndị Igbo bi na Legọs ma ọ daa ntuliaka

Ndị na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu Bola Tinubu ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ekwuola na ozi ahụ na-efegharị na soshal midia nke sị na ha na-akpa nkata ibuso ndị Igbo bi na Legọs agha n’oge ntuliaka bụ asị ọcha.

Dele Alake bụ onyeisi otu achụnta vootu Tinubu gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ na-atụ egwu na Tinubu ga-emeri onye nke ha na-ekesa ozi ịkpa oke agbụrụ a.

Ọ sị na nke a abụghị mbụ ha na-ekesa ụdị ozi a jupụtara n’asị iji mebie aha ọma onye ndu ha Bola Tinubu n’ọkwa ọ na-azọ.

Alake sị na ndị Naịjirịa maara nke ekwe na-akụ agaghị aṅa ntị n’ozi ụgha a ha na-agbasa.

Ozi a na-amaghị ebe o si malitere igbasa n’ọbaozi soshal midia ‘Whatsapp’, nke kwuru na e nyere ndị ekperima iwu ka ha wakpoo ndị Igbo bi na Legọs ma ọ bụrụ na Tinubu emerighi na ntuliaka Onyeisiala.

Kedụ ihe ozi a kwuru?

Ndị na-eme ngharịiwe

Ebe foto si, Reuters

Ozi ahụ kwuru na e bunyere ndị a ngwa ọgụ ma sị ha wakpoo mpaghara Legọs dị iche iche bụ ebe ndị Igbo kachasị biri.

Ihe ọzọ nọ n’ime ozi bụ na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụfọdụ ndị agboro na-enwe nzuko ma na-akpa nkata etu mwakpo ahụ ga-esi gaa n’ime otu izuụka.

Mana ndị nkwado Tinubu apụtala kwuo na o nweghi ihe dị etu a, na ozi ahụ bụ asị ọcha si n’aka ndị pati ọzọ na-achọghị ka Tinubu merie.

N’otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Benjamin Hundeyin sị na ndị uweojii agaghị etinye ọnụ n’akụkọ ụgha ahụ.

O kwuru na ọ baghị uru ileba ya anya chaa chaa, ka ndị mmadụ ghara ịkwalite ya bụ okwu.

Cheta n’ụbọchị 25 ọnwa Febụwarị 2023, na a ga-eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa bụ nke Bola Tinubu so na-azọ.

Ndị ọzọ so na-azọ ọkwa gụnyere; Peter Obi nke Labour Pati, Atiku Abubakar nke PDP, Rabiu Kwankwaso nke NNPP nakwa ndị ọzọ.