Ihe EFCC boro Cubana Prime Minister

Ebe foto si, Cubana Prime Minister/Facebook
Akụkọ ọhụrụ apụtala n’isi nwaamadị Lucky Uchechukwu Ndukwe, onye e ji Cubana Prime Minister mara, bụ otu n’ime ndị nlekọta ụlọọrụ Cubana Group.
Nwa amadị a nọ n’aka ngalaba 'Economics and Financial Crime Commission' (EFCC), bụ ụlọọrụ na-egbochi mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa.
Ndị EFCC boro Ndukwe na otu onye ọzọ aha ya bụ Precious Omonkhoa Ofure ebubo ibuba ego ruru $164, 000.00 n’ụzọ ezịghị ezi.
A kpụpụrụ ha abụọ ụlọikpe dị n’Ikeja Legọs n'ụbọchị Wenezde, Ọgọst 24, 2022.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Cubana Prime Minister/Facebook
Oge ya bụ ikpe malitere, Ofure kwuru na o mere ya bụ ihe, mana Ndukwe kwuru na aka ya dị ọcha.
Ọkaikpe Fadipe nyere iwu ka a tụọ Ofure mkpọrọ afọ atọ maọbụ daa ya nha ịkwụ nde naịra abụọ nakwa ntaramahụhụ ịrụ ọrụ ọha n’efu ruo awa otu narị.
Ikpe nke gbasara 'Cubana Prime Minister' ka na-aga n'ihu ugbua.
Nnwụchi Ndukwe mere ka ndị mmadụ cheta ndị ọzọ metụtara Cubana Group nakwa onyeisi ya bụ Obi Cubana, bụ ndị ọrụ nchekwa nwụchịrịla, kpọrọla oku maọbụ kpụrụla ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka.
Obi Cubana n'onwe ya

Ebe foto si, Obi Cubana/Facebook
Obinna Iyiegbu nke ọtụtụ ma dịka Obi Cubana adanyebuola n’aka ndị EFFC dịka ha kpọrọ ya ka ọ bịa zara ọnụ ya n’okwu ịgbajọ ịkwụ ụtụ isi.
N'oge ahụ, akụkọ fesara na a nwụchiri Obi Cubana anwụchi, mana EFFC kọwara na ọ bụ naanị oku ka ha kpọrọ ya ka ọ bịa kọwaa ụfọdụ ihe.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Obi Cubana kọwara ihe niile gbasara ebubo na ọ na-eji klọb ndị ahụ asa ego a kpaghị n'ụzọ ziri ezi ma kwuo na aka ya dị ọcha.
Cubana Chief Priest

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest/Facebook
Pascal Okechukwu bụ otimkpu a ma dịka Cubana Chief Priest danyere n’aka ụlọọrụ EFCC n'ọnwa Eprel 2022.
Ha jichiri ya ruo otu izu ụka n'ihi ebubo isa ego, na ịgbajọọ ịkwụ ụtụ isi.
EFCC kwuru na 'Chief Priest' azaghị oku ha kpọrọ ya ugboro ugboro nke mere ha ji nwụchie ya.
Cubuna Chief Priest mechara dee n'akara Instagram ya ma sị: "EFCC anwaala m ma kwete, ezinaụlọ m unu emeela. Agaghị m echefu."
Abba Kyari

Abba Kyari bụbu osote komishona ndị uweojii Naijiria onye ndị mmadụ ma na ya na Obi Cubana bụ enyi.
Mana ka ọ dị ugbu, Abba Kyari nọ na mkpọrọ n'ihi ebubo nrụrụaka nakwa ibu ọgwụ ike.
Ngalaba mgbochi ọgwụike bụ National Drug Law Enforcement Agency nwụchiri Kyari n’afọ 2021 maka ebubo ịkpa nkata ibupụ ọgwụ ike nakwa ịna aka azụ iji tọhapụ onye buru ọgwụ ike.
Mana tupu nke ahụ e mee, a kpọbuola Abba Kyari aha n'okwu gbasara Ramon Abbas, onye e ji Hushpuppi mara, bụkwa onye nọ na mkpọrọ ugbua na mba Amerịka maka izu ohi ịntaneetị.
Ngalaba uweojii mba Amerịka bụ Federal Bureau of Investigation (FBI) kwuru na ha nwere ihe akaebe gosiri na Abba Kyari na Hushpuppi na-arụkọ ọrụ.









