Bọjet afọ 2026 ga-abụ a na-ekwu ekwu, a na-eme eme – Onyeisiala Tinubu

Ebe foto si, Nigeria's Presidency
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwuola na malite n'ọnwa Maachị afo 2026, Najịrịa ga-akwụsị iwepụta ọtụtụ bọjet n'otu afọ.
Tinubu onye kwuru nke a n'Ụlọọmeiwu dị n'Abuja dịka ọ gara bunye ndị omeiwu akwụkwọ bọjet afọ 2026 ka ha omeiwu binye ya ụbọchị Fraide sịrị na ọ ga-abụzi otu bọjet ga-esosi ihe a ga-akparta na nke a ga-emefu n'otu afọ.
Ọ sịrị, "Malite n'ọnwa Maachị afo 2026, Najịrịa ga-akwụsị iwepụta ọtụtụ bọjet n'otu afọ, ma laghachi n'usoro iji ego a tụrụ anya ịkpata n'afọ rụọ ihe a tụrụ anya ịrụ n'otu afọ ahu."
Tinubu kwekwara nkwa na ọchịchị ya ga-etinye uchu na nchekwa, agụmakwụkwọ, ahụike,ewumewu, ọrụugbo nakwa nchekwa nri n'afọ 2026.

Ebe foto si, Nigeria's Presidency
Ọ gara n'iwu sị," 2026 ga-abụ omume omume, ịchụta ego nakwa igosi etu e si mefuo ego."
" Anyị ga-akwalite ntụkwasịobi site na a na-ekwu ekwu, a na-eme eme."
O kelere ụmụ Naijiria maka ndidi ha na nkwado ha nyere ọchịchị ya.
Bọjet afọ 2026 nke ọnụego ya a dị tarị 58.18(N58.18 tn) bụ nke Tinubu kpọrọ "Bojet maka iwulie nke a na-arụ arụ' bu nke a gbakorọ ọnụ ego ya n'ọnụ N1400 maka otu dọla, ebe ọ bụbụ N1500 maka otu dọla n'afọ 2025.
N'ọsịsa ya, Onyeisi Ụlọomeiwu Sineti bụ Godswil Akpabio kwuru sị, "Onyeisiala, ụlọ bụ ụlọ gị. O nweghị ihe na-eme. Anyị kwụ gị n'azụ."
Ngwa lee ego ole a mapụtara maka ọrụ dị iche iche na bọjeti a.
Nchekwa
A mapụtara ego dị tarị ise na ụma iri anọ na otu N5.41tn ($3.9bn) maka nchekwa na bọjeti a. Nchekwa bụ ihe nwetara ego kachasị na bọjeti a. Nke a na-egosi na gọọmenti dị njikere ibu agha megide ajọ ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
Onyeisiala Tinubu mere ka o doo anya na ọ mapụtala atụmatụ usoro nchekwa ọhụrụ. O kwuru gọọmenti ga-ahụta onye maọbụ otu ọbụla e jidere na-agba nchekwa obodo mgba okpuru dịka ndị na-eyi ọha egwu bekee kpọrọ 'terrorist'.
O kwuru na ndị di etu a gụnyere ndị ojiegbe, ndịagha nnupuisi, ndị otu nzuzo nakwa ndị na-akwado ha.
Ọ gbakwụnyere na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-akwado esemokwu n'obodo sokwa na ndị ahụ.
Onyeisiala Tinubu kwuru na o mere nke a iji hụ na e kpochapụrụ ndị omekome ma weta ezi nchekwa na Naịjirịa.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu kọwara na enweghị nchekwa bụ otu ihe na-adọghachi aka elekere azụ na Naịjirịa ọkachasị abịa n'ihe oriri nakwa ọnọdụ akụnaụba.

Ebe foto si, Dolusegun/X
Ọnọdụ akụnaụba
Onyeisiala Tinubu kwuru na gọọmenti agbaala mbọ iwulite ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ma kwuo na atụmatụ ụfọdụ ha chepụtara na-amịta mkpụrụ.
O kwuru na ka ọ dị ugbua, nri amalitela ịdị ọnụ ala ebe ndị ụlọọrụ mba ofesi amalitela ịbịa rụọ ụlọọrụ ha na Naịjriịa.
N'okwu ya 'Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwere obi aṅụrị ugbua maka na ọnụahịa ihe oriri adaala nke ukwuu nakwa ego mbite gọọmenti na-enye ụmụakwụkwọ mahadum.
Ego ndị ọzọ a mapụtara gụnyere
Ịrụpụta ihe (Infrastructure): Nwetara tarị atọ na ụma iri ise na isii N3.56tn
Aguamkwụkwọ: Tarị atọ na ụma iri ise na abụọ N3.52tn
Ahụike: Tarị abụọ na ụma iri anọ na asatọ N2.48tn
Ego a na-atụ anya inweta (Total expected revenue): Tarị iri atọ na anọ na ụma iri atọ na atọ N34.33tn
Ịkwụ ego mbibi: Tarị iri na ise na ụma iri ise an abụọ N15.52tn
Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na gọọmenti ya ga-etinye anya n'ala banyere ego ọbụla a mapụtara maka ọrụ ọbụla n'ime bọjeti a.








