2025 Bọjet na ihe kwesiri ichu ụmụ Naịjirịa ụra

Ebe foto si, President Bola Tinubu / X
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Kemgbe onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu wegachara ndị omeiwu atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2025, ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ịmara mịnịstrị kacha nweta ego ma ọ bụrụ na ndị omeiwu mee ka bọjet ahụ bụrụ iwu.
Etu ọnọdụ si dị ugbua, a na-atụ anya na ndị omeiwu nwereike ịkpatụ aka maọbụ gbanwee ọtụtụ ihe na Bọjet ahụ.
Mana ugbua, ego niile gọọmenti Naịjirịa chọrọ imefu n'afọ 2025 bụ tarị naịra iri anọ na itolu na ụma asaa (49.7tn) bụ nke onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu kwuru na ọ ga-enye aka na mmepe obodo.
Nyocha BBC Igbo tinyere anya na mịnịstrị ndi nwetere nnukwu ego na bọjet ahụ.
Mịnịstrị kacha weta ego na 2025 Bọjet

Ebe foto si, President Bola Tinubu / X
Mịnịstrị na-ahụ maka ego, mịnịstrị nchekwa obodo, mịnịstrị agụmaakwụkwọ na mịnịstrị ahụike so na ndị nwetere nnukwu ego na bọjet 2025.
Mịnịstrị na-ahụ maka ego
Mịnịstrị na-ahụ maka ego bụ mịnịstrị kachasị nweta ego na bọjet 2025 nke onyeisiala Tinubu wegaara ndị omeiwu.
Ha nwetere ego ruru tarị naịra iri na asaa na ụma iri ise na abụọ (17.52tn). Ego ndị a gụnyere ego e ji akwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.
Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ
Mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ wetere tarị naịra anọ na ụma isii (4.06tn) maka ọrụ mmepe obodo dị icheiche.
Otu n'ime ya bụ okporoụzọ awaraawara si Legọs na-aga Kalaba nakwa ụzọ si Sokoto na-aga Badagry.
Tinubu kwuru na okporoụzọ abụọ ahụ ga-enye aka kwalite akụnụba Naịjirịa.
Mịnịstrị nchekwa obodo
Mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa obodo wetere tarị naịra anọ na ụma iri itolu na otu (4.91tn) bụ ego e ji akwado nchekwa Naịjirịa.
Ndịagha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche ga-erite erere n'ego ahụ.
Mịnịstrị agụmaakwụkwọ
Mịnịstrị agụmụakawụkwọ sokwe na mịnịstrị ọzọ nwetere akatamkpo ego ruru tarị naịra atọ na ụma iri ise na abụọ (3.52tn) na bọject 2025.
Mịnịstrị Ahụike
Mịnịstrị ọzọ bụ mịnịstrị na-ahụ maka ahụike nwetere ego ruru tarị naịra abụọ na ụma iri abụọ na asatọ (2.28tn).
Ebe Gọọmenti etiti ga-esi nweta ego nkwado bọjet 2025
Ọtụtụ ndị mmadụ na-aju ebee ka gọọmenti ga-esi nwete ego ha ga-eji kwado mmefu ego nke afọ 2025.
Mana ọkammụta maara ihe gbasara akụnụba bụ Desmond Okechukwu Echeta tinyere ọnụ "Ị lee anya nke ọma, ị ga-ahụ na e dere mmefu ego nke afọ 2025 dịka etu ọnọdụ akụnụba Naịjirịa si dị n'afọ a.
"Bọjet 2025 kwesịrị ịkwalite akụnụba Naịjirịa mana echeghị m na a hazịchaala ihe kwesịrị inye aka mee ka akụnụba Naịjirịa too.
"ihe gbasara ọnọdụ nchekwa Naịjirịa na-agba anyammịrị. Kedụ ka ndị ọrụ ugbo ga-esi gaa kọọ ugbo ma wepụta nri ma ọ bụrụ na ndụ ha enweghị ezi nchekwa?
Echeta kwuru na ọnọdụ nchekwa na ihe niile na-enye obodo aka imepe so n'ihe mere gọọmenti ga-eji na-aga agbaziri ego.
Ọ kwuru na ọ bụ naanị ịgbazịta ego na ire mmanụ agbịdị bụ ụzọ abụọ gọọment ga-esi weta ego ha ga-eji kwado mmefu ego nke afọ 2025.

Ebe foto si, President Bola Tinubu / X
Ihe ndị kwesịrị ichu ụmụ Naịjirịa ụra maka Bọjet 2025
Ọkammụta Echeta kwuru na ụmụ Naịjirịa kwesiri inwe echum ụra maka ihe dị icheiche gbasara bọjet 2025 nakwa etu ọnọdụ akụnụba Naịjirịa si dị.
Ọ sị na ihe dịka ebe gọọmenti ga-esi nwete ego ahụ bụ ihe kwesịrị ichu mmadụ niile ụra.
Ihe ndị ọzọ bụ:
- etu akụnụba Naịjirịa si eto,
- etu ọnụahịa ihe niile sị arị elu, na
- mgbanwe ego naịra na dọla.
Ọ kọwara na ihe mere ego dọla ji ada mba ugbua bụ na ọtụtụ ụmụ Naịjirịa si mba ụwa dị icheiche na-alọta nke mere ha ji agbanwe ego ha site na dọla ka ọ bụrụzie naịra maka na ọ bụ naịra ka ha ga-eji zụrụ ihe.
Ọ kwuru na ihe dịka n'ọnwa Janụwarị n'afọ 2025 mgbe ndị si mba ofesi ga-alaghachi azụ na naịra ga-ada mba.









