Etu anyị si kụọrọ ndị ntọ ahịa, memila ndị otu IPOB na ESN n'Imo steeti- Ndịagha Naijiria

Ndịagha Naijiria

Ebe foto si, Nigerian Army/X

Ndịagha egbochiela atụmatụ ndị ntọ, gbuo ndị otu IPOB na ESN

Otu ndịagha 'Operation 'Udoka' nke nọ ọrụ pụrụ iche n'Ọwụwa Anyanwụ ndiagha Naịjirịa ekwuola na ha nọrọ ụbọchị Fraịde abalị 17 nke ọnwa Mee afọ 2024 gbochie nkata ndị ntọ kpara ịtọrọ otu onye a kpọghị aha na mpaghara Ụmụaka dị n'Ọkpuru ọchịchị Njaba nke Imo steeti.

Ndịagha ahụ nwetara ozi atụmatụ ahụ mgbe ha nọ n'ọrụ n'akụkụ okporoụzọ si Ọlụ-Owere.

Ndịagha ahụ chụrụ ndị ntọ ahụ n'ọkụ n'ọkụ ngwangwa oku gbatagbata ahu bịara.ahụ bịara.

Dịka ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Lefụtụnat Kọnel Jonah Eromosele Unuakhalu nke ndịagha 'Operation Udoka' siri kwu, ndịagha ahụ gburu otu onye ntọ ahụ,ebe mmadụ abuọ merụrụ ahụ mgbe ha na ndị ntọ ahụ kwarịtara mgbọ.

Unuakhalu mere ka a mata na e nwetara otu egbe AK47, mgbọ egbe na otu okada n'aka ndị omekome ahụ.

N'otu aka ahụ, ndịagha na ndị ọrụ na 'Naval Base' dị Ugwuta gburu onye otu IPOB/ESN na-eyi ọha egwu n'obodo Amagberedere dị n'Ọkpuru Ọchịchị Ugwuta nke Imo steeti.

E nwetara otu egbe n'aka ya.

Egbe e nwetara n'aka

Ebe foto si, Nigerian Army/X

Onyeisi otu ndịagha 'JTF SE Operation Udoka' Majọ Generalụ Hassan Dada toro ndị obodo Umuaka na Ugwuta maka mbọ ha gbara, maa kpọọ oku ka onye ọbụla tinye aka ịkpochapụ ndị omekome n'Imo steeti na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ọ gwara ha ka ha kpọ akara ekwentị 193 maa pịa akara 2 maka enyemaka gbatagbata ndịagha.