E mechaala lụnye ụmụagbọghọ ahụ ruru 100 na-enweghi nne na nna di na Niger Steeti

Foto ụfọdụ ụmụagbọghọ ahụ a chọrọ ịlụnye di na Niger Steeti
Nkọwa foto, Foto ụfọdụ n'ime ụmụagbọghọ 100 ahụ a chọrọ ịlụnye di na Niger Steeti

A lụnyela ụmụagbọghọ karịrị 100 di, nke gụnyere ndị na-enweghi nne na nna na Niger Steeti na-agbanyeghi esemokwu pụtara n’okwu ilụmdi ahụ.

E mere agbamakwụkwọ ndị a n’ụbọchị Fraịde 24 Mee, 2024 na-agbanyeghi na mịnịsta na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Uju Kennedy-Ohanenye gbaburu akwụkwọ n’ụlọikpe megide ya ma kwuo na ụfọdụ n’ime ha erubeghi afọ ịlụ di.

Mana o mechara chigharịa na mkpebi ahụ ma kwee ka alụmdi ahụ gaa n’ihu dịka ya na Abdulmalik Sarkin-Daji bụ onyeisi ụlọomeiwu Niger Steeti na-akwado atụmatụ a nwechara nkwerikọta.

“Ebumnobi m abụghị ịkwụ alụmdi ahụ kama ọ bụ ịhụ na ụmụnwaanyị a tozuru n’ogogo afọ e ji alụ di,” ka nwada Kennedy-Ohanenye kwuru n’ozi o wepụtara.

BBC chọpụtara na otu n’ime ihe mere ka agbamakwụkwọ ndị a gaa n’ihu bụ na nwagbọghọ ahụ ga-etozu n’afọ e ji alụ di na Naịjirịa bụ afọ iri na asatọ (18yrs).

Mịnịsta Kennedy-Ohanenye kwuru na ọ ga-enye ụmụagbọghọ ndị a nturuugo agụmaakwụkwọ, nakwa ụgwọ ọnwa ruo ọnwa isii ha lụchara di.

Nne na nna otu n’ime ụmụagbọghọ ndị a bụ Mallama Amina Mariga gwara BBC na emume ịlụkọta di ọnụ ahụ bụ “iji kwanyere ụmụagbọghọ ndị a ugwu nakwa igosi na ha so n’ihe a na-eme”.

E nyere ọtụtụ ezinaụlọ a ngwo ngwo e ji edu nwa ha nwaanyị ụlọ nke gụnyere akwa ndina, igwe e ji adụ uwe bụ nke si n’aka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ọtụtụ n’ime ụmụagbọghọ ndị a bụ ndị e gburula ezinaụlọ ha nakwa ụmụnne ha site na mwakpo ndị ekperima na-eme na mpaghara Niger Steeti.

‘Ọ kaara mma ịlụnye nwa m nwaanyị di karịa ndị ekperima ị lụrụ ya n’efu’

Nwada Asamau Abdullahi na nwa ya nwaanyị dị afọ 22 so na ndị a chọrọ ịlụnye di
Nkọwa foto, Nwada Asamau Abdullahi na nwa ya nwaanyị dị afọ 22 so na ndị a chọrọ ịlụnye di

Otu nwaanyị a kpọrọ Asamau Shehu si n’obodo Guibin Boka bụ nne otu n’ime ụmụagbọghọ a chọrọ ịlụnye di kwuru na ọ kwadoro ka a lụnye nwa ya nwaanyị di.

Nwaanyị a bụ ajadu kwuru na ọ gaghị echetenwu afọ ole ọ dị kama na nwa ya ahụ dị afọ 22 ma bụrụ onye tozuruoke ịlụ di.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ ọnọdụ ha hụtara onwe ha mere ha jiri mee mkpebi ahụ.

Nwada Shehu kwuru na ndị ekperima na-enye ha nsogbu n’obodo na ọ bụ ha bịara gbuo di ya na kamgbe ahụ o nweghi onye enyemaka.

O kwuru na ọ kaara ya mma ịhụ ma maara ebe nwa ya nwaanyị lụrụ di karịa ndị ekperima ịkpọrọ ya gawa ebe ọ maghị.

Foto ụfọdụ ụmụagbọghọ a chọrọ ịlụnye di

Ụlọikpe kwụsịburu alụmdi ụmụagbọghọ ndị a

Aka nwaagbọghọ na Minista Ụmụnwaanyị bụ Uju Ohaneny

Ebe foto si, Getty Images/Uju Ohanenye/x

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọikpe dị na Niger Steeti nyere iwu ka akwụsị alụmdi a chọro imere ụmụnwaanyị 100 bụ ndị enweghi nne na nna na Niger steeti.

Agbamakwụkwọ ahụ bụ nke Abdulmalik Sarkindaji na-akwado butere nnukwu nkatọ.

Ndị mmadụ na-ebo ndị na-ahazị alụmdi ahụ ebubo na e nwere ụmụaka ụmụnwaanyị na-etorubeghi ịlụ di so n’ime mmadụ 100 ahụ.

Ọtụtụ na ndị a chọrọ ịgbakwụkwọ ahụ gunyere ụmụaka enwe nne bụ ndị e gburu nne na nna ha oge awakporo obodo ha.

Ọtụtụ na-ekwu na ụmụaka ụfọdụ n’ime ndị ahụ ka ana amanye amanye maka ego na ihe ndị ọzọ ha ga-erite.

Nkatọ ndị mmadu nyere agbamakwụkwọ ahụ mere Abdulmalik Sarkindaji gị sị na ya ama nkwadọzị agbamakwụkwọ ahụ.

Mịnịsta na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwanyị bụ Uju kenedy-Ohanenye bụ onye katọrọ alụmdi ahụ ma kwụọ na ya ga eje ụlọikpe iwete ikike ịkwụsị agbamakwụkwọ ahụ.

Ndị na akwadọ ikike mmadụ dekwara akwụkwọ ka akwụsị agbamakwụkwọ ahụ.

Mana onye isi ekpupere alakụba na Niger steeti kwụrụ na agbamakwụkwọ ahụ ga aga n’ịhụ na ụbọchị 24 Mee, ma na ekwu na ụmụaka ahu etorugo ịnụ dị.

Mana a mabeghi afọ ole ụmụaka ahụ dị ụgbụa.

Mana ọtụtụ na ụmụaka ahụ nọ na-akwadọ alụm dị ha.

Na mgbago Ugwu Naịjirịa, ịme agbamakwụkwọ na ọha abụghị ihe a na ahụ kwa mgbe kwa mgbe maka na ekpukpere ha na ọdịnala ha na akwado nwoke ịnụ nwanyị karịa otu nwanyị.