Lee aha ndị a na-eche mere mwakpo ụlọụka Katọlịk St Francis, Owo

Ndị agha Naịjirịa akpọpụtala aha ma gbaa n’anwụ ndị a na-eche mere mwakpo ụlọụka Katọlịk St. Francis nke Owo, Ondo steeti.
N’akwụkwọ ozi ha nke otu ọnụ na-ekwuru ha bụ Jimmy Akpor binyere aka, ọ depụtara na aha ndị a bụ Idris Abdulmalik Omeiza (nke e ji Bin Malik mere), Momoh Otohu Abubakar, Aliyu Yusuf Itopa na Auwal Ishaq Onimisi.
Akpor kwuru na ọ bụ atụmatụ ndị ọrụ nchekwa jịkọrọ aka ọnụ mee bụ ihe mitara mkpụrụ a.

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu
Etu e si nwuchie ndị gburu ndị ụka Katọlik dị n'Owo Ondo Steeti
Gọvanọ na-achị Ondo Steeti bụ Arakunrin Oluwarotimi Akeredolu sị na ọ bụ eziokwu na a nwuchiela ndị gburu ọchụ n'ụlọuka St. Francis Katọlik dị n'Owo.
O kwuru nke a nwa obere oge onyeisi ndị nchekwa na Naịjirịa bụ Lucky Irabor kwupụtachara nke a n'Abuja.
Gọvanọ sị na onye nwe ụlọ ebe ndị ahụ nọ tupu ha emee mwakpo a sokwa na ndị a nwuchiri.
Ọ sị na gọọmenti egbughi oge ọbụla isi imi n'ala iji chọpụta ndị oyi ndụ egwu kamgbe ha kpachara arụ a n'ụbọchị 5 Juun 2022.
Etu ndịagha si gbakọọ aka ọnụ nwuchie ndị kpara arụ a
Onyeisi ọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ Leo Irabor kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde mgbe ya na ndị ụlọọrụ ntaakụkọ na-akpata nkata.
Ọ sị na a nwuchiri ndị a site na njikọ aka ndịagha, ndị DSS nakwa ndị uweojii.

Irabor sị na a ga-agba ndị a n'anwụ ma ọ bụrụ na e mechaa nyocha ha na-eme banyere ya.
N'okwu ya "Anyị anwụchiela ndị kpara arụ ọjọọ a n'Owo.
"Ọ bụ ebumnobi m igosi ndị a n'ihu ọha mana n'ihi na nyocha ka na-aga n'ihu, a gbanwere obi m."
Etu ihe a si mee n'Owo

N'ụbọchị 5 nke ọnwa Juun afọ 2022, njinji jiri n'Owo Ondo Steeti mgbe ndị ojiegbe wakporo ụlọụka Francis Katọlik ebe ndị na-aka ụka dịka Fada Andrew Abayomi si kwuo.
Ndị a malitere ịgba egbe nakwa ịtụ ogbunigwe aghara aghara nke butere ọnwụ mmadụ ruru iri anọ.
Gọvanọ Akeredolu nyere ụbọchị asaa dịka ụbọchị akwa na ọnụma maka ndị egburu egbu.
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari katọrọ mwakpo ma sị na ọ bụ aka ọrụ ndị obi tara mmiri.
N'otu aka ahụ onyeisi ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Francis kpeere ndị a ekpere ma sị ka mkpụrụ obi ha laa na ndokwa.
Site mgbe ahụ rute ugbua ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ na-achọ ndị kpara arụ a n'ike.
Gọọmentị Naịjirịa sị na ọ bụ ndị oyi ndụ egwu a kpọrọ Islamic State West Africa Province carry out di deadly attack (ISWAP) kpara arụ a.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Rauf Aregbesola gbara ama a mgbe ha na Onyeisiala Buhari mechara nzukọ banyere nchekwa.









