Lee ihu ndị nwụrụ na mwakpo ndị omekome mere n'Owo

Ndị nwụrụ mgbe ndị omekome wakporo Owo

Ebe foto si, Others

A matala aha ụfọdụ ndị nwụrụ na mwakpo ndị omekome wakporo ụlọụka St. Francis Xavier Katọlik dị n'Owo, Ondo steeti.

Ndị uweojii kwuru na ndị omekome ahụ gbagburu ọtụtụ mmadụ n'ụbọchị ise nke ọnwa Juun, 2022, jikere ka ndị bịara ụka, tụọ ogbunigwe ma kwaa ndị mmadụ mgbọ.

Ka ọ dị ugbua, ya bụ mkpamkpa ataala isi ihe ruru mmadụ 40, ebe ọtụtụ ndị ọzọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ.

Na ya bụ mwakpo mere n'ime ụlọụka riri ọtụtụ ndị mmadụ ọnụ, ọkachasị dịka ọ na-abụghị ụdịrị ihe a na-ahụkarị anya na mpaghara Ndịda Naịjiria.

Lee ụfọdụ ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo

Caroline Agboola

Caroline Agboola

Ebe foto si, Caroline Agboola

Caroline Agboola so na ndị nwụrụ n'ime ụlọụka mgbe ndị omekome na-agba egbe aghara aghara.

Nwa ya nwaanyị gwara BBC Pidgin na ọ bụ onye oghee akara tupu o zute ọnwụ ya.

O kwukwara na Caroline esorola di ya bụ onye ọnwụ kpọrọla afọ ole na ole gara aga.

Ọ dị naanị afọ 68 mgbe o zutere ọnwụ ya n'aka ndị omekome a.

Virginus Ani

Virginus Ani

Ebe foto si, Virginus Ani

Virginus Ani na Chidiogo nwa ya bụ otu n'ime nna na nwa nwụrụ na mwakpo ahụ.

Diọkpara ya na ụmụnne ya abụọ ndị ọzọ sokwa ha nọrọ n'ime ụlọụka ahụ, mana enweghi ihe ọbụla mere ha.

Akụkọ kwuru na ọ bụ nwa ya nwoke a maburu nwanne ya nwaanyị si n'ụlọụka gawa ụlọọgwụ ka a gbachara ya egbe, ebe a nọ kwuo na ọ nwụọla.

Chidiogo dị naanị afọ 11 mgbe o zutere ọnwụ ya.

Chidiogo Nwani

Ebe foto si, Chidiogo Nwani

Umunna Okafor

Umunna Okafor

Ebe foto si, Umunna

Ahụ ha merụrụ n'ihi mgbọ egbe tụrụ Umunna na nwa ya nwoke bụ ihe butere ọnwụ ha.

Ka ndị omekome a kwachara mgbọ laa, a hụrụ ebe Umunna ji ahụ ya kpugide nwa ya, mana ha abụọ abụrụla ozu mgbe ahụ.

Akụkọ ndị mmadụ na-akọ kwuru na ọ nọ na-achọ iji ahụ ya kpuchite nwa ya nwoke mana ndị ojiegbe ahụ gbagburu ha abụọ.

Tupu o zute ọnwụ ya, Umunna bụ onye azụmahịa 'electronics'.

Ọ dị naanị afọ 37 mgbe o zutere ọnwụ ya.

Ozurumba Bridget

Bridget Ozurumba

Ebe foto si, Bridget Ozurumba

Bridget Ozurumba nwụrụ n'ime ụlọụka ka ndị omekome a na-akwa mgbọ.

Nwa ya nwoke nọ n'ụlọọgwụ na-anata ọgwụgwọ n'ihi ahụ o merụrụ oge mkpamkpa a na-akpa.

Nwa ya nwoke na ezinaụlọ ya nọ n'ime ụlọụka mgbe ya bụ mkpamkpa na-akpa, mana ọ bụ naanị Bridget ka ya bụ ihe tara isi ya.

Maazị na oriakụ Onuoha

Maazị na Oriakụ Onuoha

Ebe foto si, Onuoha

Maazị Chukwudi Onuoha na oriakụ ya Deborah, nwụrụ mgbe mgbọ ndị omekome a tụgburu ha n'ụlọụka.

Ha na Chinedu, nwa ha nwoke so bịa ụka mana ọ lara na nta ụbọchị ahụ.

Maazị Onuoha na-arụbu ọrụ dịka onye nlekọta ubi (gardener) na mahadum, ebe nwunye ya bụ onye azụmahịa, tupu ha ezute ọnwụ ha.

Chinedu kwuru na o kwenyere na nne ya gaara adị ndụ ugbua maọbụghị akụkọ ụgha ha nụrụ na ụlọọgwụ dị nso ebe ahụ anaghị anabatazị ndị mmadụ, nke mere na ọ nataghị ọgwụgwọ n'oge.

O kwuru na nne na nna ya nọkọrọ ọnụ mgbe ndị ojiegbe a batara ụlọụka ahụ.

Maazị Onuoha dị afọ 60 ebe nwunye ya dị afọ 54 mgbe ha zutere ọnwụ ha.

Ndị nwụrụ na mwakpo Owo
Ndị nwụrụ na mwakpo Owo
Ndị nwụrụ mgbe ndị omekome wakporo Owo
Ndị nwụrụ mgbe ndị omekome wakporo Owo

Gọọmentị Naịjria 'na-eche' na ọ bụ ISWAP kpara mkpamkpa a

Gọọmentị Naịjiria ekwuola na ha na-eche na ọ bụ ndị oyindụegwu a kpọrọ Islamic State West Africa Province (Iswap) kpara mkpamkpa a n'ụlọụka St. Francis Xavier Katọlik dị n'Owo, Ondo steeti n'ụbọchị ụka gara aga.

Rauf Aregbesola bụ minista na-ahụ maka ihe na-eme n'imeụlọ na Naịjiria, kwuru na ihe ruru mmadụ 40 nwụrụ ebe ọtụtụ merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo.

O kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe ha na Onyeisiala Muhammadu Buhari mechara nzukọ ndị nchekwa, n'obi gọọmentị dị n'Abuja.

A chọpụta n'ezie na ọ bụ ndị Iswap kpara mkpamkpa a, nke a ga-eme ya mbụ ndị otu ahụ - ha na otu oyindụegwu IS nwere mmekọ - na-eme mwakpo na mpaghara Ndịda Naịjiria, nke gosiri etu mwakpo a si abawanye.

Otu ahụ na-akpakarị mkpamkpa na mpaghara Ugwu Naịjiria.

Ruo ugbua, otu ahụ ekwubeghi ihe ọbụla iji nabata maọbụ gọnarị aka ha n'okwu mwakpo a.

A ka na-etinye foto na aha ndị mmadụ n'akụkọ a.