Ndịagha asaala ebubo sị na aka ha nọ na ntọrị ndị mmadụ n’Ọwụwa Anyanwụ

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ozi ọhụrụ ndịagha Naịjirịa zipụtara asaala ebubo sị na aka nọ na ntọrọ ndị mmadụ na-arị elu n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa ngalaba 82 Division n’Enugu steeti bụ Jonah Unuakhalu zipụtara ozi ma kọwaa na akụkọ ahụ na-efegharị bụ akụkọ ụgha.

O kwurua na ụlọọrụ Inter Society na-agbasa ozi ahụ na-arụrụ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ọrụ n'ịgbasa ozi ụgha na ozi aghụghọ.

N'okwu ya “Ọrụ nchekwa anyị n’Ọwụwa Anyanwụ akụsaala ọrụ otu a a machiri amachi, ọ bụ ya mere ụlọọrụ Intersociety ji wepụta akụkọ ụgha ndị na-enweghị nkọwa zuru, nke na-enwekwaghị isi”

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Iji kwado nke a, o kwuru etu ndị agha si anwuchi ma na-enyochapụta ngwa ọgụ ndị omekome nakwa ogige ha n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke gụnyere egbe nakwa ogbunigwe.

“Akọkọ pụtara na Facebook na twitter na-ewu na otu onyeisi ndị agha bụ ‘General Officer Commanding’ nke 82 Division si Kaduna bịa Enugwu, nke a bụ akụkọ ụgha dịka ya o si na 81 Division Lagos bịa Enugwu, ọ bụghị Kaduna ka o si bịa”

Ọ gara n’ihu kwuo:

“Ndị agha Naijiria anaghị arụ ọrụ na-emetụta ịkpa oke agbụrụ dịka ndị a siri boo ebubo. Anyị bụ ndịagha na-akwụwa aka ọtọ n’ọrụ ma bụrụ ndị ṅụrụ iyi ọrụ ịgbara Naịjirịa odibo n’ụzọ ziri ezi.”

Ndị agha Naịjirịa nọ n'ọtụtụ ọrụ nchekwa dị iche iche n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa maka iweghachite udo ebe ahụ.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị agha Naịjirịa nọ n'ọtụtụ ọrụ nchekwa dị iche iche n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa maka iweghachite udo ebe ahụ.

Ọ gara n’ihi chetere ndị ụlọọrụ ahụ na ndịagha Naịjirịa eleghị anya n’ihu mgbe ha mere njem nlekọta ahụike na nso nso a n'obodo Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Ipob nke n’Afarakwu, Umuahia, Abia Steeti, iji nyere ndị obodo ya aka ma leta ahụike ha n’efu.

Dịka Unuakhalu kwupụtara ụfọdụ ihe ndehie aka dị n’ozi ya bụ ụlọọrụ zipụtara, ọ dọrọ ọha aka na ntị ka ha mara na ha na-arụrụ ESN/Ipob ma kụchapụ ebubo ndị ha boro.

N'ihi ọnọdụ enweghị nchekwa ka na-arị elu n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, akụkọ ntọrị nakwa ogbugbu ndị ndị mmadụ bụzi chi bọọ a nụ ọzọ.

Ụlọọrụ Intersociety na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye pụtara na nso nso a ma kwuo na ndị agha Naịjirịa sị na ha ma ụma gba nkịtị ka ya bụ ọnọdụ ọjọọ na-arị elu.

Ozi ndị a zipụtara rụkwara otu onyeisi ndịagha e zigara n’Enugu steeti aka n’okwu a.

Ha kwukwara na ndị agha Naịjirịa na-erite uru n’aka ndị ntọrị a dịka ọtụtụ oge ndị ezinaụlọ ndị a tọrọ na-akwụ ụgwọ mgbapụta.