Etu ndị Afaraukwu, obodo Nnamdi Kanu si rite nlekọta ahuike n'efu n'aka ndịagha Naijiria

Ebe foto si, Nigeria Army 14 Brigade Ohafia
Ọtụtụ ụmụafọ Afaraukwu dị n'Abia steeeti, obodo Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob), agbaala akaebe etu ndị agha Naijiria si nwetara ha nlekọta ahụike n'efu na nsonso a.
Na ngwụcha izu gara aga, ndị agha Naijiria gara n'Afaraukwu nke Abia steeti ebe ha nọrọ nye mmadụ ole amabeghị ọnụọgụgụ ya nlekọta ahụike.
Nke a na-abịa dịka afọ ise gachar ka ndịagha Naijiria ji ụgbọagha na ngwaọgụ ndị ọzọ wakpoo Afraukwu dịka ha na-achụ Nnamdi Kanu.

Ebe foto si, Nigeria Army 14 Brigade Ohafia

Ebe foto si, Nigeria Army 14 Brigade Ohafia
Eze Afarakwu bụ Eze Edward Ibeabuchi gwara onyentaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ ụbọchị Monde a, na afọ juru ya maka ihe ahụ ndịagha mere bụ nke o kwuru bụ mbụ ha na-eme ụdị ihe ahụ n'obodo ha.
O kwuru na ndịagha ahụ kpọtara ndị dọkịta ndị nyochara ndị mmadụ ahụ n'efu, gbaa ha ọgwụ ma nyekwa ndị nwere nsogbu anya ugegbe anya.

O kwuru: "Obi dị m ụtọ. Anọlam ohu afọ (20) n'oche Eze ndị be anyị. Ihe m hụrụ n'obodo anyị na Satode tụrụ m n'anya."
"Ndị amịị bịara be anyị, mana ọ bụghị ịluso mmadụ ọgụ, ha bu ihe karịrị dọkịta iri na ndị nọọsụ bịa ala anyị, buru nnukwu ọgwụ..."
"O nwere ndị ha lekọtara, nwee ndị ha nyere ugegbe anya." "Ha nyere ọtụtụ nlekọta nke mere ndị be anyị ji na-ajụ na-ha abụkwa ndị amịị n’ezie."

Ebe foto si, Nigeria Army 14 Brigade Ohafia
Eze Ibeanuchi gara n'ihu tọọ ndịagha maka agwa ha kpasara ha ma sị na ọ bụ etu a ka ha si eme na udo ga-adị.
Mmadụ abụọ na-arụ ọrụ na nso Afaraukwu Technical Secondary School, bụ ebe ya bụ nleta ahụ n'efu mere bụ Chijioke Emenikena na Uhesinulo Ogbenna gwara BBCIgbo na ọtụtụ ndị mmadụ bịara ya bụ ihe. Ochịagha 14 Brigade Nigeria Army, Ohafia bụ Brig. Gen. Adegoke Adetuyi, kọwara na ya bụ atụmatụ so n'agba nke abụọ atụmatụ 'GOLDEN DAWN' nke ndịagha na-eme n'Ọwụịwa Anyanwụ Naịjirịa iji kwalite ezi mmekorita n'etiti ndịagha na ndị obodo.

Ebe foto si, Nigeria Army 14 Brigade Ohafia
Adetuyi, gwara ndị ntaakụkọ sị, “Nlekọta ahụike n'efu a bụ iji gwa ndị Afaraukwu na ihe ha na-amasị ndịagha Naijiria nakwa na ndịagha dị njikere inye ha ezi nchekwa dịka mmemme Ekeresimesi na-atụnye n'ụkwụ." Generalụ Adetuyi gara n'ihu sị na ndịagha Naijiria "dị njikere mgbe abụla mgbe ịrụ ọrụ ha dịka ọ dị n'iwu ịkwado ndị ọchịchị obodo ihu na ihe na-aga dịka o kwesịrị dịka ntuliaka 2023 na-atụnye n'ụkwụ."

Ebe foto si, Nigeria Army 14 Brigade Ohafia
O kwuru na nleta ahụike n'efu ahụ bụ maka ụmụaka, ndị agadi nakwa ndị enweghị ka ọ ha ha.
E nyochara ahụ maka ọbara mgbalielu, ọrịa suga , anya mgbu , HIV ma kesakwa ihe eji enyere ndụ aka nke rutere ọtụtụ ndị mmadụ.
Cheta...

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'abalị 17 nke ọnwa Septemba, afọ 2017, ndịagha Naijiria bu ụghọagha na ngwa ọgụ ndị ọzọ wakporo ụlọ onye ndu otu Ipob bu Nnamdi Kanu n'obodo ya bụ Afara-Ukwu dị n'Abia steeti ebe ha kwara mgbọ ma merụkwa ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.
Nnamdi Kanu mechara ka afọ ole na ole gachara gbaa ama na ọ bụ mwakpo ahụ mere ya ji gbaa ọsọ ndụ gbapụ na Naijiria.
N'abalị asatọ nke ọnwa Oktoba, ndịagha wakpokwara ebe ahụ ahụ ọz ma were akọọngwa ụfọdụ dịka nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu si boo n'ebubo..dịka ha na-achọ ihe mmadụ amaghị.
Cheta na n’ebe ọnwa Ọktoba 2017 na akụkọ pụtara na-ebubo ebubo na ndị agha Naịjirịa ji atụmatụ iji ọgwụ na-agbagbu ndị mmadụ n’aha atụmatụ nlekọta ahụike.
Ọtụtụ ndị mmadụ boro ebubo na ndịagha Naịjirịa ji ụzọ ịgba ndị mmadụ ọgwụ mgbochi ọrịa Monkeypox na-agbagbu ndị mmadụ ọgwụ.
Gọọmentị Naịjirịa kụchapụrụ ya bụ ebubo dịka minista ahụike oge ahụ bụ Isaac Adewole kwuru na ya bụ akụkọ bụ ụgha.
Adewole gbara ama na ihe ndị agha na-eme bụ otu ọrụ ha n’ileta ndị obodo nke gụnyere nleta ahụike ndị obodo ebe ha na-arụ ọrụ.








