Gịnị ga-emezi ma ndịagha France si na mba Niger pụọ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Yusuf Akinpelu
- Ndị mere akụkọ a, West Africa Journalist
Mba France pịachiri anya mgbe ha kpebiri ịkpọpụ ndịagha ha ruru 1,500 nọ na Niger dịka nghọtahie dapụtara n’etiti Paris na ndịagha mba Niger weere ọchịchị n’ike n’ọnwa Julaị.
Onyeisiala Emmanuel Macron kwuru na mkpebi ahụ bịara maka na ndịagha Niger “enweghizi mmasị ibuso iyi ndụ egwu agha” maa gaa n’ihu ịkpọchi Onyeisiala Mohamed Bazoum, bụ onye ọ hụtara ka “ezigbo onyeisiala” mba Niger.
Iro na ekworo ejupụtala n’obi ndị Niger n’ebe France nọ kamgbe a chụpụrụ Bazoum. Ndị mmadụ eburula ngagharịiwe gaa n’ogige ndịagha France nakwa ụlọọrụ nnọchiteanya ha dị Niamey bụ isioboso Niger.
Macron n’onwe ya anataala ọtụtụ nkatọ na mba dịka ndị ụlọomeiwu ha rụrịtaraụka ma ha ọ ga-aga n’ihu inwe ọnọdụ na mpaghara ọzara Sahel.
Niger bụ mba nke atọ nọbụ n’aka mba France na mpaghara Sahel ga-ahụta ọnọdụ iwere ọchịchị n’ike nke ndịagha ma sị ka ndịagha France pụọ kamgbe afọ 2020. Otu ihe a mere na mba Mali na Burkina Faso.
Ndị ndu ndịagha a na-eji ohere iwe dị ndị mmadụ n’obi megide mba France n’oge a chịrị ha na-enweike iweghara ọchịchị n’ike.
Na Niger, e ji n’ihi ebubo na Onyeisiala Mohamed Bazoum na-aracha ndị France ike ma kụnye aka na ya wepụ ya n’ọchịchị. Ndịagha a nke ọchịagha Abdourahmane Tchiani bụ onyeisi ha akagbuo nkwekọrịta ise banyere Niger na France nwere n’okwu nchekwa.
Ikike akpọmasị ndịagha a kpọrọ mba France mere ka o siere ndịagha France ike ịnọgide na mba Niger dịka Bram Posthumus onye ọkachamara na Sahel nke Afrịka si kwuo.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
“Onweghi ihe ọzọ ha nwereike imenwu, nke a bụ atụmatụ iji wepụ onwe ha ihere n’anya. Ọ bụ eze a ma na-aga echi. Mana France mere ka ọ bụrụ mgbe ha chọrọ ya na-abụghị mgbe ndịagha a weere ọchịchị n’ike choro ya.” Ka o kwuru.
Ọtụtụ ndị mmadụ na Niger na-ewesi France iwe maka etu ha siri sie ọnwụ megide ndịagha weere ọchịchị n’ike.
Ha kwuru na ọ dị iche etu France siri kpaa agwa mgbe ndịagha weere ọchịchị n’ike na mpaghara etiti Afrịka dịka Gabon na Chad bụcha ebe ndị ha chịrịla na 2021.
Otu onye nkuzi okpukperechi Alakụba bụ Abdoulaziz Abdoulaye Amadou kwuru sị “Gịnị mere Emmanuel Macron agaghị anabata ndịagha weere ọchịchị na mba anyị ebe ọ nabatara ndịagha weere ọchịchị n’ike na Gabon nakwa Chad. Nke a bụ ihe were anyị iwe, anyị chere na mba France na-ahụta anyị dị ka ndị iberibe.”
Ndịagha mba France nọ na Niger na-ebuta ihu n’ọgụ mbaụwa megide ndị oyi ndụ egwu na mpaghara Sahel.
Mana agbanyeghi ọtụtụ nkwado n’ụzọ ego nakwa ngwaaha, ọgụ a nke ndịagha mba France na-edu amaala afọ n’ala dịka ndị a na-eyi ndụ egwu ka kpachiri ọtụtụ ebe na mpaghara ahụ.
Na-agbanyeghi ndịagha mba France emebeghi ọfụma ka a tụrụ anya n’aka ha mana ha agbaala mbọ n’ibelata ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na mpaghara ahụ dịka Bram Posthumus kwuru.
N’afọ gara aga ndị nwụrụ na mba Niger n’ihi iyi ndụ egwu ji pasenti 79 gbadata ala. O doghi anya etu ndịagha France si nye aka na nke a mana ndị mmadụ na-ekwu na ọnọdụ nchekwa nwereike ịkakwu ọjọọ.

Ebe foto si, Reuters
Na Mali na Burkina Faso bụ ebe ndịagha ji ọchịchị kamgbe, ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ ebe ahụ. Ndị mmadụ kwuru na ọnọdụ nwereike ịdị etu a na Niger.
Dịka ndị wechara ọchịchị n’ike, e nweela ụfọdụ akụkọ nwakpo ndịagha na ndị nkịtị na Niger ọkachasị na mpaghara Tillaberi dị nso n’okeala Niger na Burkina Faso.
Ọpụpụ ndịagha mba France ga-ewete ohere nke ndị na-eyi ndụ egwu na ndị ekperima ndị ọzọ ga-achọ ịnọchi, ka Posthumus kwuru.
“Ihe ị hụrụ na Mali ka ị ga-ahụ na Niger maka na ndịagha enweghi ikike ichekwa okeala niile nke mba ndị a,” ka o kwuru.
Enweghi ikike ichekwa ogige ndị a ga-emetụta ọrụ ngwupụta ọnatarachi, ọkachasị n’ime ime obodo.
Kamgbe afọ iri gara aga naanị mba Kazakhstan ji 27 pasentị kachasịa bubata uranium na mba France karịa mba Niger ji 20 pasenti. E ji akụrụngwa ‘radioactive’a emepụta ikike nuklịa bụ nke e ji emepụta ọkụ latrik pasenti 70 na mba France.
Ụlọọrụ mba France a na-akpọ Orano nwere ogige ebe a na-egwupụta Uranium n’obodo Airlit dị na Niger kwuru na ha ga-aga n’ihu igwupụta na-agbanyeghi ihe na-eme na Niger.
Posthumus kwuru na ndịagha nwereike inwe nkwekọrịta ọhụrụ banyere nke ahụ ma sị na ndị na-eri uru n’ụdịrị nkwekọrịta ahụ bụ ndị ndọrọ ndọrọ na ọ bụghị ndị nkịtị.

Ọtụtụ mmanụ agbidi na uranium dị na Niger apụtabeghi ihe dịka akụnaụba na ndụ ndị mba a ọnụgụgụ ha dị nde 25.
Ihe karịrị pasenti 40 n’ime ka na-ebi ndụ n’ụbịam ebe mba ahụ bụ ndị 189 n’ime 191 n’ogogo mba ndị mepere emepe nke otu United Nations wepụtara n’afọ 2022.
Mba agwabeghi ndịagha mba Amerịka ruru 1,000 ka ha pụọ dịka ogbo ha Mali na Burkina Faso jiri sị ndịagha mba ndị ọzọ laa.
Nke a mereka ohere ndịagha Niger na mba Russia inwe nkwekọrịta jiri dị obere na-agbanyeghi na ha ndị ogbo ha nke Mali na Burkina Faso na Russia adịla mbụ nwee nkwekọrịta.
Ndị ọkachamara kwuru na ibelata aka France nwere na mba Niger abụghị ihe ga-eme ka e nwee udo na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha.
N’ọtụtụ afọ na-abịa abịa, ndị ndu ndịagha ọhụrụ nwere ikpebi iwepu aka ndị Russia nwere na mba ha” iji gosi ihe mere ha jiri were ọchịchị n’ike.









