Ọkụ gbara n'ahịa Eke-Ukwu dị n'Afikpo agbawala ndị mmadụ aka

Ebe foto si, PRO Afikpo LGA
Ngwongwo ndị mmadụ lara n'iyi dịka ọkụ gbara ahịa Eke-Ukwu dị n'okpuruọchịchị Afikpo, Ebonyi steeti.
Ya bụ ọkụ gbara n'abalị Tuzde, 12 nke ọnwa Julaị afọ 2022, repịara ụfọdụ akụkụ ahịa ahụ ma maebie ngwongwo ndị mmadụ.
Enweghi onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na ya bụ ọkụ ọgbụgba, dịka ndị hụrụ ka ihe mere si kwuo.
Amabeghi ihe kpatara ya bụ ọkụ gbapịara ngwaahịa ndị mmadụ.
Mbọ ụfọdụ ndị gbara ịzọpụta ụfọdụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'efu dịka ya bụ ọkụ ji ike na-agba.
Oby Oko Enyim bụ onyeisi okpuruọchịchị ahụ, tiri ndị ọkụ a metụtara aka n'obi mgbe ọ garuru ebe ahụ, ma kwe ha nkwa na gọọmentị ga-agba mbọ ịgbatara ha ọsọ enyemaka.
Omezue Johnson Inya Oka bụ onyeisi otu jikọrọ ndị ahịa Afikpo, Afikpo Market Traders Association (AMATA), kpọkuru gọọmenti ka ha gbaa mbọ hụ na ụdịrị ọdachi a emeghi ọzọ, site n'itinye ihe ndị e ji alụso ọkụ ọgụ.

Ebe foto si, PRO Afiikpo LGA

Ebe foto si, PRO Afiikpo LGA





