Ọkụ ọ na-agba n’ụlọụka St Anthony Catholic Church Amansea nke Anambra steeti?

Akụkọ ụgha

Ebe foto si, Screengrab

Ọ bụghị eziokwu na ọkụ gbara ụlọụka Katọlik St Anthony dị n’Amansea nke Anambra steeti taa bụ Sọnde, ụbọchị 10 nke ọnwa Julaị, dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia si kwuo. Ndị mmadụ gwara onye ntakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ na ọ bụ n’izu gara aga ka otu tanka gbara ọkụ n’ihu ụlọụka ahụ.

Onye ntaakụkọ anyị garuru ebe ahụ ji anya ya hụ na ya bụ akụkọ na-efegharị bụ akụkọ ụgha dịka enweghị ọkụ na-agbe ebe ahụ taa.

Ndị uweojii n’Anambra steeti gwakwara BBC Igbo na ọ nweghị akụkọ ọbụla ha natarala maka ọkụ a sị na-agba n’ụka ahụ.

Akụkọ malitere na-efegharị na soshal midia taa na-ekwusike na ọkụ na-agba ụlọụka St Anthony Catholic Church, Amansea nke Anambra steeti.

Otu ihe onyonyo nke ọtụtụ na-ekesa gosiri ebe ọkụ na-agba na nso ụlọ ahụ dịka olu onye na-ese nọ na-eti 'Leekwa na ọkụ na-agba ụlọụka St Anthony Catholic Church Amansea ugbua'.

Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kọwaara BBC Igbo na ihe dị etu a anaghị eme na steeti ahụ taa.

Tanka a gbara ọkụ n'ihu ụlọụka ahụ n'izu gara aga
Nkọwa foto, Tanka a gbara ọkụ n'ihu ụlọụka ahụ n'izu gara aga
Ụmụaka nọ n'ime ụka St Anthony Catholic Church egwu egwu
Nkọwa foto, Ụmụaka nọ n'ime ụka St Anthony Catholic Church egwu egwu

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ hụrụ na ụmụaka nọ n’ime ogige ụka ahụ na-egwu egwu dịka akacharala ụka nke taa bụ Sọnde.

Ndị nọ ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ ahụ sị: “E nwere ụgbọala ukwuu nke tanka gbara ọkụ n’ihu ụka a, mana ọ bụ n’ịzụ gara aga ka ya bụ ihe mere”.

Lee ke ogige ụka ahụ dị taa bụ Sọnde ụbọchị 10 nke ọnwa Julaị, 2022.

Ka ụka St Anthony Catholic Church nke Amansea, Anambra steeti dị taa bụ 10/7/2022
Nkọwa foto, Ka ụka St Anthony Catholic Church nke Amansea, Anambra steeti dị taa bụ 10/7/2022
Ka ụka St Anthony Catholic Church nke Amansea, Anambra steeti dị taa bụ 10/7/2022
Nkọwa foto, Ka ụka St Anthony Catholic Church nke Amansea, Anambra steeti dị taa bụ 10/7/2022