Etu ndị 'unknown gunmen' si gbuo ndị uweojii atọ n'Enugwu

Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala ịhụ na ha chọtara ndị omekome bu egbe gbagburu ndị uweojii nọ nche n'ihu ogige ndị uweojii Area Command di n'Agbani, n'Okpuru ọchịchị Nkanụ-West dị na steeti ahụ.
Ndị omekome bu ụgbọala Lexus Jeep nakwa Toyota Tundra wakporo ma gbagbuo ndị uweojii atọ nọ ọrụ ebe ha na-akwụsị ma nyocha ndị na-eme njem n'ụzọ ụtụtụ Satọde n' Agbani Roundabout dị n'obodo Agbani n'Okpuru Ọchịchị Nkanu-West n'ụtụtụ Satode.
Ndị uweojii n'Enugwu steeti kwuru na ha na-enyo na ndị omekome ahụ ruru mmadụ iri na ise bụ ndị otu Ipob nakwa alaka ọgụ ha bu ESN.
Ka ọ dị ụgbụa ,Komishọna ndị uweojii steeti ahụ b Ahmed Ammani, onye garala njem ileta ebe ihe ahụ mere ṅụrụ na ndị ọrụ ha ka esipụta ndị kpara mkpamkpa ahụ.
Daniel Ndukwe kwuru n' ozi mgbasaozi o binyere aka sị, " Kọmishịọna ndị uweojii Enugwu steeti bụ Ahmed Ammani, gara n'ụbọchị 19 nke ọnwa Novemba afọ 2022 n' Agbani Roundabout dị n' Agbani dị n'Okpuru Ọchịchị Nkanu West bụ ebe ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu Ipob /ESN wakporo ma gbuo ndị uweojii atọ nọ ọrụ akwụsị, enyocha , n'ụtụtụ ụbọchị ahụ."
"Ndị omekataraihedaaụjọ ahụ bu ụgbọala 'Lexus Jeep' nakwa Toyota Tundra."

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Mwakpo a na-abịa ka ọ gachara otu abalị ndị omekome a gbara otu onye na-elekọta ọdọ mmanụ ụgbọala egbe n'Ibagwa-Nike, tọrọ otu nwoke ọzọ , ebe ha napụkwara onye ọzọ ụgbọala n'Alulu-Nike dịkwa na steeeti ahụ n'abalị 17 nakwa 18 nke ọnwa Novemba afọ 2022. Cheta 'abalị 18 nke ọnwa Novemba, afọ 2022, ndị omekome a ndị uweojii si si Anambra steeti wakporo ma gbuo otu nwoke bụbu Komishona Enugwu steeti bụ Gabriel Onuzulike na nwanne ya nwoke.
Ndị uweojii na ndị omkome ahụ kwarịtara mgbọ n'Inyi tupu ha gbalaga Anambra Steeti.

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Kemgbe Jenụwarị afọ 2021, tigbuo-zogbuo na-arị ibe ya elu n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.
Ndị bu egbe awakpoola ọtụtụ ogige ndị uweojii, suo ụfọdụ ọkụ, ma gbagbukwa ọtụtụ ndị uweojii.
E gbukwala ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị nwere agba na Naijiria.
Gọọmentị Naijiria na ndị isi ọrụ nchekwa boro otu Ipob na alaka ọgụ ha bụ Easter Security Network ebubo aka ha ịdị na mwakpo ndị a nile.
Mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.
Ipob bụ otu na-agba mbọ ka e kewapụta mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie na Naijiriia kpọọ ya obodo ya, Biafra.













