Lee ihe Bishop Katọlik Enugu kwuru ga-eme dịka ụka Adoration Ministry na-emepe ọzọ

Ebe foto si, AMEN/Facebook
Ụlọụka Adoration Ministry Enugu ewepụtala ozi kwuru na ha ga-amalite ịkawa ụka ọzọ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba, 2022.
Fada Ejike Mbaka bụ onyeisi ụka ahụ, binyere aka na ya bụ ozi e ziputere na Facebook ha.
BBC kpọtụrụ Katọlik Dayọsis nke Enugwu steeti, nke Fada Mbaka nọ n'okpuru ya ma bụrụkwa ndị nyere ya mmachi a machiri ha kemgbe ọnwa Juun, 2022.

Ebe foto si, Screenshot
Ha gwara BBC na n'ezie, Fada Mbaka ga-aka ụka ahụ n'ụbọchị ha ga-emepegharị ya bụ ụlọụka Adoration.
Fada Benjamin Achi bụ ọnụ na-ekwuru Katọlik Dayọsis nke Enugwu steeti, gakwara n'ihu kwuo na ihe ndị ọzọ ga-eso ya ga-abịazị mgbe a kachara ụka ahụ n'ụbọchị Sọnde.
Mgbe a kwụsịrị Adoration Ministry ịka ụka
N'ụbọchị 17 nke ọnwa Juun ka Bishop Callistus Onaga, bụ Bishọp Enugwu Katọlik Dayọsis, nyere iwu ka e mechie ụlọụka Adoration Ministry nke Enugwu steeti.
N'ozi o ziputere ka ọ na-amachi ụlọụka ahụ, Bishọp kwuru na ha ga-eme nnyocha n'isi Fada Mbaka.
O kwuru sị “N’ihi ọtụtụ ihe ndị na-eme n’Adoration Ministry nke megidere okwukwe na nkuzi ndị Katọlik; a dọọla Fada Mbaka aka na ntị ọtụtụ oge mana o geghi ntị na ntuziaka ndị a.
Site n'ikike na ọrụ m dịka onyeisi ọzụzụ atụrụ nke Katọlik Enugwu Dayọsis, amachiela ndị Katọlik (ụkọchukwu, ndị ụka) ịga n’Adoration Ministry efe ofufe ruo mgbe e mechara nnyocha ndị ndu Katọlik na-eme n’isi Fada Mbaka”.
Cheta na n'afọ 2021, Fada Mbaka jikwa aka ya mechie Adoration Ministry otu ọnwa na Mee, ka ọ gara ikpe ekpere otu ọnwa.
Nke a mere dịka ọ rịọchara Bishọp Onaga mgbaghara maka ngagharịiwe nke ndị ụka ya mere nke butere ọgbaghara na mmebi ngwongwo ndị ụka.
Onye bụ Fada Mbaka?
Fr Ejike Camillus Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik na-arụ ọrụ na Dayọsis nke Enugwu, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Ọ bụkwaya ya bụ onyeisi ụlọ ekpere a na-akpọ 'Adoration Ministry Enugwu, Nigeria' (AMEN).
E chiri ya ụkọchukwu n'ọnwa Julaị nke afọ 1995, nke pụtara na ọ rụọla ọrụ dịka ụkọchukwu ihe ruru afọ 27 ugbua.
Otu ihe e ji mara Mbaka bụ na ọ na-ebukarị amụma gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ntuliaka, nakwa ndị ga-emeri ntuliaka.









