Ịdọ aka na ntị Shell leghaara anya gbasara 'chandum' nsacha mmanụ

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Simi Jolaoso
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Ogoniland
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Nnyocha BBC mere achọpụtala ebubo a na-ebo na ụlọorụ mmanụ agbịdị Shell jụrụ ọtụtụ ịdọ aka na ntị na atụmatụ ịsacha mpaghara ndị mmanụ agbịdị mebiri na mpaghara ndịda Naịjirịa bụ nke jupụtara na nsogbu na nrụrụaka.
Isi ụlọorụ Shell dị na Lọndọn na gọọmenti Naịjirịa ekwuputala ugboro ugboro na ọrụ ịsacha ogbe ndị lara n'iyi n'Ogoni bụ nke malitere ihe dịka afọ asatọ gara aga na-aga nke ọma.
Mana BBC chọpụtara ihe akaebe na-egosi na a dọrọ ha aka na ntị ugboro ugboro n'ime afọ ole na ole gara aga na ihe omume ahụ gọọmenti hibere ma bụrụkwa nke ụlọorụ mmanụ agbịdị dị iche iche ji ego ruru otu ijeri dọla (£805m) na-akwado bụ nke nwere ọtụtụ nsogbu.
Otu onye nọ nso ahụ ka ya bụ ihe si aga kọwara atụmatụ nsacha ahụ dịka "aghụghọ" na "chandum" e jiri laa ego n'iyi ma hapụ ndị Ogoni dị na mpaghara Niger Delta ka ha gaa n'ihu na-agabiga mmetụta nke nsogbu mmanụ agbịdị.
Shell gwara BBC sị "gburugburu ebe anyị na-arụ ọrụ na Niger Delta bụ nke nwere nsogbu n'ihi omume ndị iwu akwadoghị, dịka izu ohi mmanụ agbịdị.
"Ọ bụrụ na mmanụ site n'akụrụngwa anyị kwafuo, anyị na-asacha ya ma dozie ọnọdụ na-agbanyeghị ihe butere ya. Ọ bụrụ nke mere oge anyị na-arụ ọrụ, anyị na-eti ndị mmadụ na obodo ndị o metụtara aka n'obi."
A na-ebo ebubo ahụ dịka ikpe ga-amalite n'ụbọchị Tọzde n'Ụlọikpe ukwu dị na Lọndọn, ebe ndị Ọkaiwu na-anọchite anya obodo Ogoni abụo nwere ihe ruru mmadụ puku iri ise (50,000) bi n'ime ya ga-ekwu na Shell kwesịrị ịnabata na ọ bụ ha kpatara mmetọ mmanụ mere na-agbata afọ 1989 na 2020, nke a na-ebo ebubo si n'akụrụngwa ha.
Ndị obodo ahụ na-ekwu na ya bụ mfesa mmanụ emeela ka ha ghara inwe ezigbo mmiri, gharakwa ịkọ ugbo maọbụ ịkụ azụ ma butekwa nsogbu nke ahụike ọhanaeze.
Shell ekwuputala na ha ga-azara ọnụ ha n'ebubo ndị ahụ.
Ha gọrọ agụgọ ma kwuo na ihe butere mfesa mmanụ na mpaghara ahụ bụ mgba okpuru, izu ohi mmanụ agbịdị na ishipụta mmanụ n'ụzọ iwu akwadoghị bụkwanụ nke Naịjirịa kwuru na o sighị ha n'aka.
BBC garuru na mpaghara ahụ dị na Niger Delta ya bụ ọnọdụ metụtara bụ ebe ụlọọrụ Shell chọpụtara mmanụ agbịdị afọ iri isii na asatọ (68) gara aga.
UN kwuru na opekatampe barel mmanụ agbịdị nde iri na atọ efesaala kemgbe afọ 1958 opekatampe ugboro puku asaa na mpaghara Niger Delta.
Most of the children - from the drinking water - have got diseases. Many have died. I've lost eight kids. My husband is sick"
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ụlọorụ okwu iwu mba UK na-anọchite anya ndị obodo ahụ bụ Leigh Day siri kwuo, Grace Audi gbara afọ iri atọ na asaa (37), di ya na nwa ha gbara afọ abụọ bi n'Ogale ebe ha hụtarala opekatampe mfesa mmanụ ugboro iri anọ site n'akụrụngwa Shell.
Ihe na-eru ndị ezinaụlọ nakwa ndị agbataobi ya aka bụ mmiri adịghị ọcha, nke na-amanye ha ịzụta mmiri dị ọcha maka ọṅụṅụ, isi nri, ịsa akwa nakwa ịga mposi n'ọnụego puku naịra anọ na narị naịra ise (N4,500, $3, £2.40) otu ugboro kwa ụbọchị.
Ọ bụ akụkọ metụtara ọtụtụ mmadụ n'Ogoni
N'afọ 2011, ihe omume otu mbaụwa na-ahụ maka gburugburu bụ Environment Programme (UNEP) bipụtara nnyocha ha mere gbasara mmetụta mmetọ gburugburu n'a mpaghara ahụ mmanụ agbịdị jupụtara.
Nnyocha ahụ chọpụtara na ndị bi n'otu obodo n'Ogoni na-aṅụ mmiri e metọrọ emetọ bụ nke nwere akụrụngwa ọjọọ ji ogogo narị itoolu karịa nke otu ahụike mbaụwa (WHO) wepụtara. A chọpụtakwara kemikal ahụ bụ benzene n'ikuku ha.
Ọ chọpụtakwara na ogige ebe ụlọorụ Shell kwuru na ha asachaala ka bụkwa nke metọrọ emetọ ebe usoro ha jiri sachaa mpaghara ahụ erughị ogogo a chọrọ.
Nnyocha ahụ kwuru na ọ ga-ewe afọ iri abụọ na ise ruo afọ iri atọ iji sachaa mpaghara ahụ nke ọma. Ọ bụkwa nke a mere e ji hibe atụmatụ Hydrocarbon Pollution Remediation Project (Hyprep).

Ka ọ dị, BBC ahụla akwụkwọ na-egosi na a dọrọ ndị nnọchiteanya Shell na gọọmenti Naịjirịa aka na ntị ọtụtụ oge gbasara ebubo nrụrụaka a na-ebo ngalaba ụlọorụ ahụ.
Otu onye maara maka ihe omume ahụ kọorọ BBC gbasara mmetụta ha ma rịọ ka a ghara ịkpọ aha ya n'ihi ụjọ ịlụso ya ọgụ.
"Onye niile kwesịrị ịma na ihe anyị na-eme bụ chandum. Ọtụtụ n'ime ha bụ iji ghọrịa ndị Ogoni," ka onye mgbaama ahụ kwuru.
"Ọ bụ aghụghọ a ghọrọ iji hụ na akwụnyere ọtụtụ ego n'ime akpa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na mmadị ndị ọzọ ji ọkwa ọchịchị."
Ebubo gbasara ịkụ afọ n'ala na Hyprep gụnyere:
- Inye ọrụngo n'aka ụlọorụ na-amaghị nke ha riri
- Ịkụ akụrụakụ nnwale - oge ụfọdụ, idepụta na aja maọbụ mmiri adịghị mma dị ọcha
- Ibuli ego ọrụngo
- Igbochi ndị nnyocha sitere n'ụlọorụ ọzọ ịtụle ma e mere nsacha ahụ nke ọma
Na ndekọta otu nzukọ e nwere n'afọ 2023 nke ndị nnọchiteanya ụlọorụ Shell na Naịjirịa, UNEP na Hyprep gara, a rụtụrụ aka na ndị ọrụngọ amaghị nke ha riri bụ ndị "e nyere ọrụ ọzọ" ma rịọ ka "a ghara inye ha ohere ibibi gburugburu ọzọ."
N'ozi ọzọ gbara n'anwụ nke BBC hụrụ n'afọ ahụ, e kwuputara na mpụtara nnyocha ahụ bụ nke "a na-agwakọta nnu na ose".
N'afọ 2022, UN degaara ministri Naịjirịa na-ahụ maka gburugburu akwụkwọ dọo ha aka na ntị na ọ bụrụ na e nweghị ihe e mere "ogogo nsacha ahụ dị ala" ga-aga n'ihu.
BBC gwara Hyprep na gọọmenti Naịjirịa ka ha kwuo okwu gbasara ebubo ahụ mana ha enyeghị nzaghachi.
Mana nnyocha anyị ekpuheela ihe akaebe na Shell maara maka nsogbu ahụ.
Na ndekọ nzukọ dị n'etiti nnukwu onye kọmịshọna Briten na Naịjirịa n'ọnwa Jenụwarị afọ gara aga bụ nke e nwetara site n'ikike nnwereonwe mgbasaozi, ndị nnọchiteanya Shell kwetara na e nwere ihe mkpọbiụkwụ n'ụlọọrụ na-ahụ maka nsacha ahụ.
Shell gwara BBC sị "Hyprep bụ ngalaba ụlọorụ nke gọọmenti etiti Naịjirịa hiwere ma na-elekọta, nke ihe mejupụtara ya bụ ndị nnukwu minista na ndị ọrụ gọomenti, tinyere ndị nnọchiteanya obodo ise na ụlọorụ abụghị nke gọọmenti nakwa otu onye nnọchiteanya Shell.

Ebe foto si, AFP

Ụfọdụ ndị bi n'Ogoni eboola Shell ebubo ịgba ọsọ n'ọrụ ịsachasị ala na mmiri a na-ebo ha ebubo imetọ.
Ha na-atụkwa ụjọ na Shell nwereike ịga n'ihu na-erite uru site n'ire mmanụ agbịdị ndị ha mịpụtara na mpaghara ahụ n'ọdịnihu.
Akụrụngwa ọnatarachi dịka mmanụ agbịdị na gaasị bụ 90% ngwaahịa akachasị atụpụ na Naịjirịa bụ ndị sitere na mpaghara Niger Delta.
Ndị obodo ahụ na-ebi ndụ site n'ọrụ ugbo na ịkụ azụ gwara BBC na kemgbe a chọpụtara mmanụ agbịdị, ụlọorụ mmanụ agbịdị dị iche iche, ndị ohi mmanụ na ndị na-egwu ndọrọndọrọ ọchịchị erikpọola ala ha.
Ha kwuru na ha ahụbeghị uru ọbụla, naanị nhụjuanya - dịka Patience Ogboe onye tara ụta na mfesa mmanụ ahụ mere akụmakụ ya ji agba ọnyụpa.









