Lee ndị ga-enyere Rishi Sunak aka n’ọchịchị mba Briten

Ndị minista Rishi Sunak họpụtara

Dịka Rishi Sunak malitere ọchịchị dịka Praịm Minista ọhụrụ nke mba Briten, ọ hazigharịala ma họpụta ndị ya na ya ga-eso arụ ọrụ ọchịchị mba ahụ.

Sunak bụ onye banyere ọchịchị n’ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba 2022, mgbe o zutechara Eze Charles nke atọ, họpụtara ndị otu pati ya dị 30 dịka ndị minista ya na ha ga-arụkọ.

Ụfọdụ bụ ndị rụburula ọrụ n’ọkwa dị iche iche ọ kpọghachịtara, ebe ndị ọzọ bụ ndị nkwado ya.

Sunak họpụtara mmadụ 14 - n’ime ndị rụburu Liz Truss ka gbara arụkwaghịm dịka Praịm Minista - ọrụ.

Ndị ọ họpụtara na ọkwa ha

  • Dominic Raab - Osote Praịm Minista: Raab arụbuola ọrụ n’okpuru Boris Johnson dịka minista Ikpe. Ọ rụbukwara dịka minista mmekọrịta mba na mba
  • Jeremy Hunt - Minista na-ahụ maka ego nakwa Onyeisi ụlọakụ mba Briten. Hunt arụbuola ọrụ dịka minista na-ahụ maka omenala na egwuregwu nakwa minista ahụike nakwa minista mmekọrịta mba na mba.
  • Suella Braverman - minista na-ahụ maka mbịarambịara, uweojii na ihe ndị ọzọ. N’ọkwa a ka ọ nọbu n’okpuru ọchịchị Liz Truss, tupu ọ gbaa arụkwaghịm ka naanị otu ọnwa gachara.
  • James Cleverly - Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba.
  • Ben Wallace - Minista na-ahụ maka nchekwa.
  • Nadhim Zahawi - Minista na-enweghi ọrụ ọ na-elekọta.
  • Oliver Dowden - ‘Chancellor’ nke Duchy nke Lancaster. Ọrụ ya bụ ilekọta ngalaba na-akwado Praịm Minista ma na-enyere ngalaba dị iche iche aka ịrụkọ ọrụ karịrị otu ngalaba.
  • Therese Coffey - Minista na-ahụ maka gburugburu. Ọ rụburu dịka osote Praịm Minista n'okpuru Liz Truss ma rụkwaa dịka minista ahụike
  • Grant Shapps - Minista na-ahụ maka iji ego achụ ego. Ọ rụburu dịka minista njem n'okpuru Boris Johnson.
  • Penny Mordaunt - Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu. Ọ rụburu dịka minista azụmahịa mba na mba n’okpuru Boris Johnson.
  • Mel Stride - Minista na-ahụ maka ọrụ na ụgwọ ezumike nka. Ọ bụ ezigbo onye nkwado Sunak. Ọ rụburu dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu n’okpuru Theresa May.
  • Gillian Keegan - Minista na-ahụ maka Agụmakwụkwọ. Ọ rụbuola dịka minista ahụike n’okpuru Boris Johnson.
  • Steve Barclay - Minista ahụike. Ọ rụtụrụ ọrụ a nwa mgbe nta n'okpuru Boris Johnson. Ọ rụbuola dịka ‘Chancellor’ nke Duchy nke Lancaster nakwa minista na-ahụ maka ndị ndụmọdụ na ngalaba gọọmentị ndị ha na Praịm minista na-arụkọ.
  • Mark Harper - Minista na-ahụ maka njem. Ọ rụbuola dịka minista na-ahụ maka ṅogharị iwu obodo n'okpuru David Cameron.
  • Michael Gove - Minista na-ahụ maka Mwulite, Ụlọ na Obodo. Ọ rụkwara ọrụ a n'okpuru Boris Johnson. Ọ rụkwara ọrụ dịka minista agụmakwụkwọ nakwa minista Ikpe.
  • Kemi Badenoch - Minista na-ahụ maka azụmahịa n'etiti mba na mba nakwa minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị na nhatanha. Ọ rụkwara ọrụ a n'okpuru Liz Truss. Ọ rụbụọla dịka minista na-ahụ maka Mwulite, Ụlọ na Obodo.
  • Michelle Donelan - Minista na-ahụ maka Omenala. Ọ rụkwara ọrụ a n'okpuru Liz Truss. Ọ rụkwara dịka minista agụmakwụkwọ naanị ụbọchị abụọ tupu ọ gbaa arụkwaghịm iji gosi iwe ya ma mee ka Boris Johnson rituo n'ọkwa.
  • Chris Heaton-Harris - Minista na-ahụ maka mba Northern Ireland. Ọ rụkwara ọrụ a n'okpuru Liz Truss.
  • Alister Jack - Minista nke steeti na-ahụ maka Scotland. Ọ nọ n'ọkwa a kemgbe Boris Johnson banyere ọkwa Praịm Minista n'afọ 2019.
  • David TC Davies - Minista nke steeti na-ahụ maka Wales.
  • Lord True - Onyeisi ụlọomeiwu nta. Ọ rụkwara ọrụ a n'okpuru Liz Truss. Ọ rụbukwara dịka minista na-ahụ maka ndị ndụmọdụ na ngalaba gọọmentị ndị ha na Praịm minista na-arụkọ.
  • Simon Hart - Onyeisi ndị pati ha ka n'ụlọomeiwu.
  • Victoria Prentis - Ọkaiwu gọọmentị etiti.
  • John Glen - Minista na-ahụ maka akpaego gọọmentị.
  • Jeremy Quin - Minista na-ahụ maka ndị ndụmọdụ na ngalaba gọọmentị ndị ha na Praịm minista na-arụkọ nakwa ọkwụụgwọ gọọmentị etiti.
  • Johnny Mercer - Minista na-ahụ maka ọdịmma ndị agha lara ezumike nka. Ọ rụbuola ọrụ a n'okpuru Boris Johnson, ma rụkwaa dịka minista na-ahụ maka nchekwa.
  • Tom Tugendhat - Minista na-ahụ maka nchekwa ime mba.
  • Gavin Williamson - Minista na-enweghi ọrụ ọ na-elekọta. Ọ rụbuola dịka minista nchekwa.
  • Robert Jenrick - Minista na-ahụ maka mbịarambịara n'ime 'Home Office'.
  • Andrew Mitchell - minista na-ahụ maka mwulite obodo, n'okpuru ụlọọrụ mmekọrịta mba na mba.