Ndị uweojii akọwaala ihe mere n'Izombe nakwa Agwa, Imo steeti

Ụgbọala ndị a gbara ọkụ n'Izombe

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ụgbọala ndị a gbara ọkụ n'Izombe

Ndị uweojii Imo steeti ezipụtala ozi gbasara mwakpo mere n'Izombe nakwa Agwa dị n'Imo steeti.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam wepụtara, ọ sị na ndị echeere bụ ndị otu Ipob nakwa ESN wakpọrọ ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Agwa n'abalị ụbọchị Fraịde.

Ozi ahụ sị na ha ndị uweojii kwara mgbo ụfọdụ oge tupu ndị ahụ agbapụ mana ndị uweojii mmadụ anọ nwụru na ya bụ ihe.

Kọmịshọna ndị uweojii bụ Mohammed Ahmed Barde gara ebe ahụ ịleta ka ihe si kwụrụ ka ndị obodo ahụ gba mbọ nyochapụta onye ọbụla na-agwọ mgbọ tụrụ ha.

O gakwara leta Eze obodo ahụ bụ I.O. Asor ma gwa ya ndị obodo ya na ha bụ ndị uweojii na-agba mbọ ịhụ na eweghachitere udo n'obodo ha ma nwụchie ndị kpata mkpa mkpa a.

Ihe anyị ma maka mwakpo mere n'Izombe nakwa Agwa, Imo steeti

Naanị awa ole m ole gacharala dịka ndị ojiegbe wakporo obodo Agwa nke okpuruọchịchị Oguta, n'Imo steeti, akụkọ si Izombe nọkwa n'otu okpuruọchịchị ahụ ekwuola na ndị ojiegbe wakporo obodo ahụ n'ụtụtụ Satọdee.

Ndị be ebe ahụ kọwara na ha na-eche ndị a wakporo be ha bụ ndị kpara mkpa mkpa n'Agwa n'abalị Fraịdee ma wụbata obodo ha.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo n'Imo steeti natara ozi na ọtụtụ ndị ọzọ na-ebo ebubo na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa nke Ebubeagu bụ ndị wakporo obodo ahụ mana enweghị ihe ịgba ama gosiri nke a.

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Getty Images

Cheta na akụkọ si obodo Agwa pụta n'abalị Fraịdee kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n’ebe ahụ, gbuo ndị uweojii anọ ma gbaa ụgbọala ha ọkụ. 

Nke a sokwa mwakpo mere na nso ụlọọrụ ndị uweojii ahụ bụ ebe ndị omekome a wakporo be otu nwoke gbagbuo ya ma gbaa nwunye ya egbe. Otu onye ọzọ n'obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya ji ụjọ kwuo:

"Anyị ezolaa onwe anyị n'ime ọhịa, ndị agha Naịjirịa awụchịela n'obodo anyị" 

"Ndị agha apụtala ibuso ha agha"

Ebubo a e boro ndị Ebubeagu so mkpa mkpa kpara n'obodo Awomamma na nso nso a, ebe a sị na ndị ọrụ nchekwa (nke ọtụtụ kwuru na ha bụ ndị Ebubeagu) gburu mmadụ asaa si agbamakwụkwọ na-alọta. 

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo steeti kwuru na ọ bụ ndị ngalaba uweojii pụrụiche nke Department of State Services (DSS) bụ ndị gara ebe ahụ wakpoo ndị omekome na-akpa ike ebe ahụ.

O kwukwara na ọ bụghị ndị na-alọta agbamakwụkwọ ka e meminara kama na ọ bụ ndị omekome.

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Getty Images

Gịnị mere n'Agwa kpọm kwem?

Akụkọ si obodo Agwa nke Imo steeti pụta n'ụtụtụ Satọdee kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'ebe ahụ gbụọ mmadụ anọ, gbaa ụgbọala nakwa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ.

E kwuru na otu n’ime ụgbọala a gbara ọkụ bụ nke onyeisi ụlọọrụ ndị uweojii n’Agwa.

Akụkọ kwukwara na ndị omekome ahụ wakporo be otu nwoke gbagbuo ya ma gbaa nwunye ya egbe. Nwunye nwoke a gburu bụ onye ọkwọ Ọkada dịka ndị mmadụ siri kwuo.

Ndị bi n’obodo a na-achọghị ka a kpọọ aha ha kọwara etu ihe a siri malite.

Ha kwuru na mwakpo a malitere n’ebe elekere iri nke abali Fraịdee.

Otu onye n’ime ha kwuru:

“Ndị ojiegbe a bu ụgbọala Sienna abụọ nakwa nnukwu ụgbọala teepa nwere wụbata”

Onye ọzọ kwuru:

“Anyị na-akwado ilaba mgbe anyị malitere nụwa ụda egbe aghara aghara, etu ahụ ka anyị si zoo onwe anyị”

Ọ gara n'ihu kwuo: “Mgbe anyị pụtara n’ụtụtụ Satọdee a, anyị nụrụ na ndị ahụ gbagburu ụmụnwoke ndị uweojii abụọ ma gbaa ụmụnwaanyị ndị uweojii abụọ ọkụ”

Foto gosiri otu n'ime ụgbọala ndị a gbara ọkụ

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Foto gosiri otu n'ime ụgbọala ndị a gbara ọkụ

Akụkọ na-ekwu na otu onye n’ime ndị uweojii a gbagburu malitere ọrụ uweojii Naịjirịa naanị izu abụọ gara aga.

Ndị bi nso ebe a mwakpo a mere na-ekwu na ndị uweojii si mpaghara ndị ọzọ nọ nso obodo ahụ awụchịela n’ebe ahụ n’ụtụtụ Satọdee a.

Onye ntaakụkọ anyị n'Imo steeti natara ọtụtụ ihe onyonyo nakwa foto gosiri ozu ndị mmadụ bụ ndị a na-ekwu na ndị omekome ahụ gburu.

Kemgbe afọ 2021, Imo steeti nakwa akụkụ Ọwụwa anyanwụ Naịjịrịa ndị ọzọ danyere n’ọnọdụ enweghị nchekwa.

Otu ndị ojiegbe dị icheiche malitere na-akpa ike ma na-wakpo ụlọọrụ gọọmentị nakwa be ndị mmadụ.

A wakpoola ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa, ndị uweojii nakwa ụlọọrụ ha n'akụkụ Ọwụwa Anywanụ Naịjirịa dị iche iche.

Gọọmentị Imo steeti ekwuola ugboro ugboro na ha na-agba mbọ ịhụ na-eweghachitere udo na obi iru ala na steeti ahụ.