NLC, TUC akwụsịla abụbụọrụ ha

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọrọ ndị ọrụ bụ NLC nkwa nwanne ha bụ TUC akwụsịla abụbụ ọrụ ha tinyeburu.
Nke a na-abịa dịka ha kwadoro abụbụọrụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Nọvemba.
O pụtara ihe dịka ndị isi ha na onye ndumodu n'ihe gbasara nchekwa bụ Nuhu Ribadu.
Ha kelere ndị otu ha gụnyere NLC na TUC maka etu ha si jikọ aka ma hụ na abụbụọrụ bịara na mmezu.

Otu jikọtara ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress na Trade Union Congress ekwuola na ha amaghị ma ọ bụ eziokwu na a nwụchiela ndị a na-enyo tiri onyeisi ha bụ Joe Ajaero ihe.
Nke a na-abịa dịka onye ndụmọdụ Onyeisala n’okwu nchekwa bụ Nuhu Ribadu kwuru na ha anwụchiela ndị aka ha dị n’iti Ajaero ihe.
Onyeisi ndị Trade Union Congress bụ Festus Osifo kwuru na ha nụrụ ozi si n’aka National Security Adviser (NSA) banyere ndị a nwụchiri kama na ha amaghị ma ọ bụ eziokwu.
O kwuru na NSA kpọrọ ha oku maka mkparịtaụka banyere nke a nakwa etu a ga-esi kwụsị abụbụọrụ ha na-agba, na ha ga-aza oku ahụ.

Osifo kwuru na ọ bụrụ na NSA gosi ha ihe akaebe na a nwụchiri ndị a n’ezie na ha ga-eme nzukọ n’ime onwe ha maka ihe ọzọ ha ga-eme.
N’aka nke ọzọ, ndị NLC na TUC mere ngagharị n’ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche n’Abuja iji hụụ na ndị otu ha na-erubeisi n’iwu ịgba abụbụọrụ ahụ ha malitere n’ụbọchị Wenezde 14 Ọktoba.
Ọtụtụ n’ime ma gbachiri ọtụtụ ụlọọrụ ha dị na secretariat nakwa nke ndị ụlọomeiwu Naịjirịa tupu ha alọghachị n’ụlọezume ndị ọrụ Bekee a kpọrọ ‘Labour House’.
Anyị anwụchiela ndị a na-enyo enyo tiri Ajaero ihe - NSA

Ebe foto si, Nuhu Ribadu/Joe Ajaero
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye ndụmọdụ nchekwa nke Naijiria bụ Nuhu Ribadu arịrọla onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress(NLC) mgbaghara maka ihe e tiri onyeisi ha na nsonso a, ma kwụọ na a nwụchiela ndị tiri ya ihe.
Joe Ajaero gara Owere idu ndị ọrụ na steeti ngagharịiwe megide ọnọdụ ọdịmma ha n'Imo steeti mana a nwụchiri ya, tie ya ihe tinka tiri pan tupu a tọhapụ ya.
N'ozi nke ọnụ na-ekwuru Nuhu Ribadu bụ Zakari Mijinyawa binyere aka ma wepụta ụbọchị Wenezde, Ribadu kpokuru NLC ka ha gbagha abụbụọrụ ha sị, " A nwụchiela ndị wakporo Ajaero, ebe nnyocha maliterela."
" Ribadu sịrị na Gọọmentị Etiti ataala ikikeri eze maka ihe mere n'Imo steeti ma katọọ ya , dịka o megidere usoiro iwu na ikike ndị mmadụ ịgbakọ nke Onyeisiala Tinubu na ọchịchị ya na-akwado."
Cheta Nke a mere ka otu NLC nọrọ na Fraide abalị atọ nke ọnwa Novemba afọ 2023, nye Gọọmentị abalị 14 ka nwuchie ndị wakporo Ajaero ma kwuo na e meghị etu ahụ, ha ga-agba abụbụọrụ.
Mana Gọọmentị gara ụlọikpe nweta mkpebi manyere ka ha ghara ịgba abụbụọrụ mana NLC gbara isi akwara gbaa abụbụọrụ malite ụbọchị Tuzde.

Ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na ụlọakụ arụghị ọrụ dịka ndị ọrụ oyibo n' ọtụtụ steeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ sonyere n'abụbụọrụ nke otu NLC na TUC kpọrọ malite n'ụbọchị Monde.
Mana na Legọs steeti, ndị ọrụ gara ọrụ, ebe a gghị akwụkwọ mana ndị ọrụ ahụike rụrụ ọrụ n'agbanyeghị oku NLC kpọrọ.
NLC, TUC, ASUU amalitela abụbụọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọakụ, ụlọọrụ na ụlọakwụkwọ mechiri na mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ, Naijiria taa dịka ndị ọrụ kwụsịrị ọrụ rue mgbe a mabeghị iji gosi iwe ha maka aka e tiri onye ndu ha bụ Joe Ajaero nakwa ọnọdụ ọdịmma ha kemgbe Gọọmentị Etiti wepụrụ ego mkwụbilata ego mmanụ ụgbọala(fuel subsidy.)
Otu jikọrọ ndịọrụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Labour Congress' 'NLC' na nwanne ha bụ 'Trade Union Congress'(TUC)' na otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities(ASUU) amalitela abụbụọrụ n'isi ụtụtụ taa bụ abalị 14 ọnwa Nọvemba, afọ 2023.
N'akwụkwọozi Odeakwụkwọ NLC abụọ; Emmanuel Ugboaja na Nuhu Toro binyere aka nke ha ji maa ọkwa mmalite ya bụ abụbụọrụ, kwuru na oso mkpebi nke ọgbakọ ndị isi otu ahụ.
Nke a na-abịa na-agbanyeghị na ụlọikpe ndị ọrụ bụ National Industrial Court nyere iwu ka NLC ghara ịgba abụbụọrụ.
N'ozi o zigara ndịisi otu Asuu na mpaghazra dị iche iche, onyeisi Asuu bụ Emmanuel Osodeke, kwuru sị,“Dịka ndị so na otu NLC, ndị nile so n'otu anyị sonye n' abụbụọrụ a iji chekwaa ọdịmma ndịọrụ Naijiria na ndị ndu otu a."

Ebe foto si, Getty Images
N'Ebonyi Steeti

Dịka otu jikọtara ndị ọrụ Bekee bụ NLC na TUC na-agba abụbụọrụ bụ nke ha malitere n’ụbọchị Tuzde 14 Nọvemba, 2023.
Ndị ọrụ Bekee nọ n’Ebonyi Steeti so ndị otu ha ndị ọzọ na Naịjirịa rubeisi n’abụbụọrụ a nke ụbọchị abụọ na Wenezde.

Nke a bụ dịka ụlọọrụ gọọmentị nwe nakwa ụfọdụ ndị nkịtị sonyere na ya bụ abụbụọrụ n’Abakaliki.
Ọtụtụ ụlọakụ, ụlọikpe, na ụlọọrụ ndị gọọmentị nwe mechichara emechi, ebe ndị bịara ịdọrọ ego ha n’ụlọakụ kwụcha n’ezi na mgbagwoju anya.
N'Abia, ụlọakụ, ụlọọrụ emepeghị

Ọtụtụ ụlọakụ na ụlọọrụ nke gọọmentị steet i na nke etiti dị n'Umuahịa gbachiri agbachi.
Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Umuahia hụrụ ka ndị ahịa ụlọakụ na-agba mbọ ịbanye n'ogige ụlọakụ mana ndị ọrụ nche ụlọakụ ndị ahụ ekweghị ha.

Ụlọọrụ ndị dị n'okporoụzọ Bende Road, Aba Road, Bank Road, Mayne Road, Akanu Ibiam Road, dịka Umuahia North, EEDC, Ministri Ọrụugbo, Post Office na ụlọọrụ nke Onyeisi Ọrụ(HOS) wdg., emepeghị.
Otu onye ọrụ Umuahia North,bụ Florence Iteogu gwara onye ntaakụkọ anyị na ha bere ọrụ iji gbalahụ ntaramahụhụ ọbụla mana o nweghị ọrụ ha na-arụ dịka a gbachiri ụlọọrụ ha. Ọtụtụ ndị mmadụ kwụkwa n'ihu ụlọọrụ ha.

N'Aba,ụlọọrụ gọọmentị, ụlọakwụkwo mechiri

Ụlọọrụ Gọọmentị, ụlọakwụkwo na ụlọakụ hubere isi n'oku abụbụọrụ otu ndịọrụ kpọrọ n'Aba, Abịa steeti.
Ụfọdụ ụlọakwụkwọ dịka Okigwe Road Primary School,ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi bịara akwụkwọ n'ụtụtụ mana ndịọrụ otu NLC bịara mee ha ka ha mechie.
Mana ụlọakwụkwọ ndị abụghị nke gọọmentị gara akwụkwọ.
N'Abuja, a sị ụmụakwụkwọ bịara akwụkwọ lawa mana ụlọọgwụ rụrụ ọrụ

N'Abuja, ọnọdụ agụmaakwụkwọ kpụrụ afọ n'ala dịka ụlọakwụkwọ emepeghị n'ihi abụbụọrụ nke ndị ọrụ Naijiria gbara banyere mwakpo a wakporo onye ndu ha bụ Joe Ajaero nakwa ọnọdụ ọdịmma ha kemgbe gọọmentị wepụrụ ego mgbakwụnye ego mmanụ ụgbọala.
Ụlọakwụkwọ Praimarị na nke Sekọndrị bụ nke gọọmentị emepeghị, dịka onye ntaakụkọ anyị gagharịị n'Abuja si kwuo.

A gwara ụmụakwụkwọ bịara akwụkwọ na-amaghị maka abụbọọrụ ndị ọrụ lawa.
Ụfọdụ n'ime ụlọakwụkwọ gwara onye ntaakụkọ anyị na obi adịghị mma n'ihi ụjọ na abụbọọrụ ga-emetụta ule ha nke ha gbara ama ga-ebido n'abalị 27 nke ọnwa Novemba afọ 2023.
Mana ndịọrụ ahụike na ụlọọgwụ na gọọmentị dị n'Abuja lụrụ ọrụ.

Otu onye butere nwanne ya ụlọọgwụ 'Kubwa General Hospital,Abuja, kpọrọ onwe ya 'Maazị Hussein' sịrị,"Nwanne m nwaanyị nwere ihe mberede n'ụtụtụ a" "Otu onye gwara anyị bụga ya n'ụlọọgwụ nke abụghị nke gọọmentị, na o nwere ike ịbụ na ndị ọrụ ahụike na-agba abụbụọrụ."
"Mana ụlọọgwụ a kachasị dị anyị nso.Anyị butere ya ebe a, ha akwọbala ya ime ya nnyocha ahụ."

Nwoke ọzọ nyere aha ya dịka 'Maazị Emeka' sịrị," Amaghị ma ndị nnukwu dọkịta ha anọ ọrụ, mana n'ụtụtụ a , ndị dọkịta gagharịrị na wọọdụ ihụ ndị ọrịa."
"Olileanya m bụ na ha agaghị esonye n'abụbụọrụ."
Na Legọs, ndị ọrụ oyibo gara ọrụ

Ndị ọrụ Bekee na-arụ n'Alausa, isiụlọọrụ Legọs stee esonyeghị n'abụbụọrụ nke otu NLC na TUC kpọrọ malite taa.
Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kwuru na ọrụ na-aga ka o kwesịrị.
Otu onye ọrụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ha enwetaghị ozi ọbụla site n'aka ndị isiọrụ ha ha kwụsị ọrụ.












