Ihe bụ iwe m ebe Gọvanọ Fubara nọ - Nyesom Wike

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Nyesom Wike/X
Kemgbe e mechara ntụliaka afọ 2023 na Naịjirịa, enweela ọtụtụ nsogbu pụtara n'etiti turu ugo na ndị daara na ntụliaka ahụ.
Ụfọdụ nsogbu a bụ nke ụlọikpe tinyere ọnụ na ya, ebe ụfọdụ ka na-aga n'ihu ugbua.
N'ime nsogbu ndị a, nke kacha ada ụda bụ nke dị n'etiti Gọvanọ Siminalayi Fubara na-achị Riva steeti na Nyesom Wike bụbu Gọvanọ chịrị Riva steeti ma bụrụ mịnịsta na-ahụ maka FCT ugbua.
Esemokwu a enwetala ọtụtụ mmebi nye steeti ahụ ma taa isi otu nwoke na steeti ahụ oge ndị ụlọomeiwu malitere atụmatụ ịchụpụ Gọvanọ Fubara n'ọkwa.
Onyekachi Ugiri, gbara afọ 27, nwụrụ mgbe mgbọegbe ndi uweojii gbara n’ebe a na-eme ngaghariiwe megide atumatụ iwepụ Govano Rivers steeti bụ Simi Fubara tụrụ ya n’ubọchị Tuzde , abalị 31 nke ọnwa Ọktọba afọ 2023.
Esemokwu a ekewaala ụlọomeiwu Riva steeti ma nweta nchụpụ ndị omeiwu steeti ahụ na-akwado Nyesom Wike bụ ndị hapụrụ pati Peoples Democratic Party (PDP) wee banye pati APC.
Kedụ ihe Fubara kwuru maka ihe ndị a

Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X
Dịka esemokwu a na-aga n'ihu, Gọvanọ Siminalayi Fubara na-achị Riva steeti ekwusiela ike na ya agahị achịkọ aka, gba nkiti ka Nyesom Wike, ndị nkwado ya maọbụ onye ọbụla enweta ntisa steeti ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
O kwuru na aka chịburu steeti ahụ bụ Nyesom Wike agaghị agwa ya ihe maọbụ etu ọ ga-esi chịa steeti ahụ n'agbanyeghi na ọ bụ Wike tinyere ya n'ọchịchị.
Oge ole na ole, Gọvanọ agwala Wike ka o sepụ aka n'ihe gbasara ọchịchị na Riva steeti maka na ọchịchị ya agwụla.
Gọvanọ Fubara bụ onye ọtụtụ ụmụafọ Riva steeti na-akwado ọchịchị ya. Ụfọdụ kọwara dịka onye mara ihe ekwe na-akụ banyere ọchịchị onyekwuouche ya.
N'ịma atụ, ntụliaka okpuru ọchịchị e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde 5 Ọktoba, 2024, bụ nke gosịrị na Gọvanọ Fubara kwụrụ chịm inweta ezi ọchịchị na Riva steeti.
Mana ka e mechara ntụliaka ahụ, ndị ekperima a na-eyo eyo na ha bụ ndị na-akwado Nyesom Wike. gara mụnye ọkụ n’ụfọdụ isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị Rivas steeti ma chụpụ ndị isioche ọhụrụ e dụrụ n’iyi ọrụ.
Ọnọdụ bịara dịka e wepụsịrị ndị uweojii n’isi ụlọorụ Okpuru ọchịchị ndị e nwere na Riva steeti.
Akụkọ kwuru na Okpuru ọchịchị ndị amụnyere isi ụlọọrụ ha ọkụ gụnyere Ikwerre, Eleme, Obio/Akpor na Emohua.
Ihe na-esere mụ na Gọvanọ Fubara

Ebe foto si, Nyesom Wike/x
N'aka nke ọzọ, Nyesom Wike ekwuola na ọ bụrụ na Gọvanọ Siminalayi Fubara chọrọ udo na Riva steeti, na ọ ga-erubeisi nye iwu ụlọikpe nyere.
Wike kwuru nke na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Channels Tv nwere.
N'okwu ya "Oge m bụ Gọvanọ, eruberem isi nye iwu ụlọikpe, ọ bụrụ na Fubara erubeghị isi nye iwu ụlọikpe, agaghị enwe udo na Riva steeti".
"Oge m nọ n'ọkwa dịka Gọvanọ, emeghịm ihe n'adighị n'iwu pati m, a bụ m onye kwenyere n'ime ihe etu iwu siri kwu, ghara imegide maọbụ kpagbuo onye ọbụla", ka Wike kwuru.
Wike boro Gọvanọ Fubara ebubo ịkwado ngagharịiwe na ọgbaghara e nwere na Riva steeti ka e mechara ntụliaka opkuru ọchịchị steeti ahụ.
Nyesom Wike kwuru na Gọvanọ Fubara kwadoro pati Action Peoples Party (APP) nke turu ugo na ntụliaka okpuru ọchịochị.
O bokwara Gọvanọ Fubara ebubo ịkpa nkata ịchụpụ onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ na ụfọdụ ndị ụlọomeiwu ahụ hapụrụ PDP banye APC.
Nyesom Wike bụ mịnịsta na-ahụ maka FCT, katọrọ Gọvanọ Bala Mohammed, na-achị Bauchi steeti maka isonye n'emume idu n'iyi ọrụ ndị isioche okpuru ọchịchị ọhurụ turu ugo na ntụliaka ahụ e mere na Riva steeti.






