Ụgbọagha mba Amerika abụọ emeela njem n'oke Osimiri Taiwan Strait

Ebe foto si, US 7TH FLEET
Ụgbọmmiri agha abụọ nke mba Amerịka na-aga n'oke osimiri Taiwan Strait dịka ndịagha mmiri Amerika si gbaa ama.
Nke a bụ mbụ nke a na-eme dịka Amerika na mba Chaina malitere ise okwu banyere mba Taiwan na mbido ọnwa Ọgụstụ afọ 2022 dịka onyeisi ụlọomeiwu mba Amerịka bụ Nancy Pelosi mere njem gaa Taiwan.
Ka nke mechara ndịagha Chaina malitere ime ọzụzụ nkwado ọgụ na mpaghara ahụ.
Ndị agha Amerịka na ndị mpa ndị ọzọ dị n'Ọdịda Anyanwụ Yurop na-agafe Ọwa mmiri Taiwan mgbe abụla mgbe ba nsonso a.
Washington kwuru na ngafe ụgbọagha USS Antietam na USS Chancellorsville - na-agafe Taiwan Strait bụ iji gosi na onye ọbụla nwere ikike isi oke osimri mba na mba gafee.
Mana Beijing na-ekwu na nke a bụ ịkpa agụ aka n'ọdụ dịka ha na-ekwu na Taiwan so n'ala Chaina nwe.
Ụbọchịụka, ndịagha Chaina kwuru na ha na-ele ụgbọmmiri abụọ ahụ mara ihe ha ga-eme , na ha dị njikere ninye ha ha ihe ọbụla ha chọrọ ma ha kụsuo ha.









