Ndị uweojii atụọla ndị ngagharịiwe 'tear gas' na Lekki Toll Gate

Ndị ngagharịiwe Endsars

Ndị uweojii Naịjirịa atụọla ndị na-eme ncheta ngagharịiwe Endsars 'tear gas' ma chụsaa ha n'akụkụ Lekki Toll Gate nke Legọs steeti.

Ndị a na-eme ngagharịiwe agbakọtala ọnụ dịka ha gbachara ọsọ ebe ahụ.

A wụkwara ndị ngagharịiwe ahụ mmiri site n'ụgbọala pụrụiche e ji awụ ndị mmadụ mmiri maka atụmatụ nchụsa bụ 'Water Canon' na Bekee.

Otu onye n'ime ha bụ onye ọkpa ọchị a ma ama dịka Mr Macaroni gwara BBC Igbo ihe mere o jiri pụta kwụnyere ndị ngagharịiwe a ọzọ agbanyeghị na anwụchịrị ya n'ụbọchị a n'afọ gara aga n'ama Lekki Toll gate.

Dịka ọ na-aza ajụjụ ndị ntaakụkọ, o kwuru "Ngagharịiwe abụghị atụmatụ ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla"

Nke a bụ dịka ụfọdụ malitere ikwu na Endsars aghọọla atụmatụ ụfọdụ ndị ji eme achụmnta vootu ma na-achọ ịkwatụ ọchịchị na Naịjirịa.

Mr Macaroni kwuru na e nweghị ihe jikọrọ ngagharịiwe a na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ka ma ha na-achọ ikpe ziri ezi.

Mr Macaroni

Ndị ntorobia awujuola na Lekki Toll Gate taa bụị abalị 20 nke ọnwa Oktoba afọ 2020 maka ncheta ndị egburu n'ụbọchị taa afọ abụọ gara aga.

Ndị agha Naijiria nọrọ n'abalị 20 nke ọnwa Oktoba afọ 2020, wụọ ndị ntorobia gbakọrọ ime ngaghariiwe megide mkpagbu ndị uweojii ụfọdụ nwụrụ ebe ụfọdụ merụrụ ahụ.

Ndị ntorobịa ndị a agbaala isi akwara ma wujuoo ebe ahụ agbanyeghị etu ndị ọrụ nchekwa siri ju n'igwe na ebube ha.

Ụfọdụ n'ime ha bu igbe akpati ozu ole m ole pụta, ọtụtụ n’ime ha ji otu olu na-ekwu ‘anyị agaghị echefu, anyị chọrọ ikpe ziri ezi’.

Ndị ngagharịiwe Endsars
Falz
Nkọwa foto, Onye otiegwu ama dịka Falz pụtara sonye ndị ngagharịiwe Endsars

Otu onye ọzọ a ma ama gosipụtakwara onwe ya dịka onye ngagharịiwe a na-anụ ọkụ n'obi kemgbe 2020 bụ Otiegwu a ma dịka Falz wụchịkwara n'ama Lekki Toll Gate nke Legos ma kwuo na ha agaghị akwụsị ncheta ruo mgbe gọọmentị nyere ndị ya bụ ngagharịiwe metụtara ikpe ziri ezi.

'Mr Maccaroni so na duru ndị ngaghariwe Endsarsars

Nd uweojii wujuru ama dịka a na-eme ncheta ndị a gbagburu na Lekki Toll Gate

Ndị ntorobia gunyere ndị bu agbatoozi pụtara n'igwe na Lekki Toll Gate dịka o ji nkeji iri na ise n ka ọ kụọ Elekere 10 nke ụtụtụ na-agbanyeghị na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa juru ebe ahụ nile.

Ndị welitere isi sonyere na ngagharị nke taa gụnyere ọkpaọchị sohal midia bụ Adebowale Adedayo ama dịka 'Mr Macaroni', Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu AAC bụ Omoleye Sowore.

Ndị uweojii na Tool Gate

Ndi uweojii wujuru na Lekki Toll Gate Legọs taa dịka a na-eme ncheta ọgbugbu ndịagha Naijiria gburu ụfọdụ ndị na-eme ngaghariiwe taa afọ agbụọ gara aga.

Ndị agha Naijiria nọrọ n'abalị 20 nke ọnwa Oktoba afọ 2020, wụọ ndị ntorobia gbakọrọ ime ngaghariiwe megide mkpagbu ndị uweojii ụfọdụ nwụrụ ebe ụfọdụ merụrụ ahụ.

Ụlọọrụ 'Amnesty International' kwuru na e gburu mmadụ 56 na nghariiwe ahụ bụ nke ndị ntorobịa mere megide ịnwụchị ezighị ezi, mmmekpa ahụ nakwa ogbugbu n'aka ndị uweojii.

Onye ntaakụkọ anyị gara Lekki Toll Gate n'ụtụtụ Taa bụ Tọzde kwuru na ebe nile dere jụụ oge o rutere ebe ahụ.

O kwuru na ndị uweojii na na ụgbọala ha weere ọnọdụ oge o rutere mana o nweghị ndị ntorobịa nọ n'ebe ahụ karịa ndị ntaakụkọ ole ma ole.

Ụfọdụ ha ji ụgbọala ha agafe na-egbu ọdụ maọbụ chaa ọkụ ụgbọala ha iji gosi obi ha.

ENDSARS memorial: Ihe ndị mere taa afọ abụọ gara aga

Ndị na-eme ngaghariiwe

Ebe foto si, EPA

Taa ka o mere afọ abụọ Ndịagha Naijiria ji wụọ ndị na-eme ngaghariiwe Endsars mgbọ ma gbuo ụfọdụ n'ime ha na Lekki Toll Gate dị na Legọs afọ 2020.

Ndị kpebiri na ha ga-eme ngagharị were mee ncheta ndị ogbo ha e gburu.

Ụlọọrụ 'Amnesty International kwuru na e gburu mmadụ 56 na nghariiwe ahụ bụ nke ndị ntorobịa mere megide ịnwụchị ezighị ezi, mmmekpa ahụ nakwa ogbugbu n'aka ndị uweojii.

Ndị ntorobia Naijiria mere ngagharịiwe ịzụụka abụọ na-eti mkpu maka mmekpa ahụ nke ha sị ngalaba ndịuweojii pụrụ iche e hiwere maka ibu agha megide iji egbe ozu ohi nke a kpọọ SARS..

Gọọmenti Etiti kwere ha nkwa ikposa to ahụ ma hiwe otu iwu ga-enyocha ebubo ndị eboro ndị ọrụ SARS.

Mana nke a akwụsịghị ngaghariiwe ahụ dịka ndị ntorobịa gbara isi akwara sị na ọ bụghị ụbọchị ahụ ka Gọọmenti kwewere nkwa eme eme.

Ha malitere tiwe mkpu maka ajọ ọchịchị.

Etu ngaghariiwe Endsars si malite

  • N'abalị 3 nke ọkwa Oktoba , afọ 2020(3/10/2020), ndị uweojii gbagburu otu nwaokorobia na Delta steeti nke iheonyonyo ya malitere weewe na soshal midia. Na mbụ, ndị okwu dị n'aka gọọrọ sị na ọ bụ ihe onyonyo adịgboroja, ma nwụchie onye mmere ihe onyonyo ahụ.
  • Iwe kpara ndị ntorobia nke mere ka ha malite tiwe mkpu na soshal midia jiri akara #ENDSARS sị ka e mechie ngalaba uweojii ahụ pụrụ iche bụSARS.
  • N'abalị asatọ nke ọnwa Oktoba, afọ 2020, (8/10/2020) iwe ahụ siri na soshal midia banye n'ama dịka ndị ntorobia malitere ngaghariiwe na steeti dị iche iche si na ya bụ mkpagbu n'aka ndị uweojii ezuola.
  • N'abalị 11 nke ọnwa Ọktoba, afọ 202(11-10-2022) Onyeisi Ndị uweojii Nigeria bụ Usman Abubakar gbara ọkwa na e kposala SARS.