Gịnị bụ 'Asset Forfeiture' na ihe ga-eme ka mmadụ hapụrụ mba Amerịka akụnaụba ya?

'Forfeiture' na-ewu na soshal midia na Naịjirịa dịka akwụkwọ ikpe ekpere Bola Tinubu n'afọ pụtara ihe.
Akwụkọ ahụ nke bu akara afọ 1993 gosiri na ngalaba 'Justice Department' mba Amerịka boro Maazị Tinubu, bụ onye meriri ntuliaka ịbu onyeisala Naịjirịa na 2023, ebubo na ego dị n'ọbaego ya si na mgbere ọgwụike.
Kevin Moss bụ onye ọrụ uweojii pụrụ iche mere nyocha banyere okwu a sị na Tinubu rụụrụ Adegoboyega Akande ọrụ.
Akande bụ onye ha na-enyo enyo maka ịtụ mgbere ọgwụike.
Ụlọikpe kwetere n'ezie na ha nwere ihe gosiri na ego nọ n'ọbaego ahụ bụ ego sitere na mgbere ọgwụike, mana Tinubu na ndị ọzọ gọnarịrị ya bụ ebubo nke mere na ụlọikpe ekpebighị kpọmkwem maka etu ya bụ ego siri bịa.
Nke a mere ka Tinubu na ndị gọọmentị jiri nwee mkpebi na ọ ga-ahapụrụ ha $460,000
Nke a bụ nke a na-akpọ 'Forfeiture of property' n'okwu Bekee.
Gịnị bụ 'Forfeiture'?
Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ikpe na BBC kọwara ya dịka mgbe mmadụ hapụụrụ gọọmentị akụnaụba ya ọkachasị na mba Amerịka maka na e nwere etu nrụrụaka siri metụta ya.
Ha kọwara na ihe nke a na-egosi bụ na gọọmentị ga-anapụ onye ahụ akụnaụba ya.
Kedụ ihe ga-eme ka mmadụ hapụrụ gọomentị Amerịka akụnaụba ya?

Ebe foto si, TheJusticeDept/Twitter
Dịka ọba Wikipedia siri kọwaa,' Civil assets Forfeiture' maọbụ 'Civil Judicial frofeiture' bụ usoro ngalaba nchekwa si e were akụnaụba ndị a na-enyo enyo na maka nrụrụaka ma ọ bụrụ na enweghị ihe ha gbadoro ụkwụ iji kpụpụ ha ụlọikpe maka ịda iwu ọbụla.
Onye ọbụla anapụrụ akụnaụba ya maka nke a ga-egosi na aka ya dị ọcha maka ebubo a na-ebo ya tupu enyeghachị ya ihe anapụrụ ya.
Lee mgbe iwu mba Amerịka nwereike ịnapụ mmadụ ihe ya n'usoro a
- Na mbụ na mba Amerịka n'ihe dịka afọ 1920 ruo 1933 mgbe mmanya na-aba n'anya megidere iwu ha, ha ji usoro ịnapụ akụnaụba mmadụ ata ndị na-agba mgbere mmanyaọkụ ahụhụ.
- Kamgbe afọ 1980, mgbe Amerịka na-aluso ọgwụike ọgụ, e ji usoro ịnapụ akụnaụba ndị na-agba mgbere ọgwụike ata ha ahụhụ dịka ha si eme oge mmanya ọkụ bụ ahịa iwu na mba Amerịka.
- N'ebe dịka New Yokr mba Amerịka, gọọmentị steeti a ji ịnapụ mmadụ akụnaụba ha egbochi onye ṅụrụ mmanya nke manya na-egbu ịkwọ ụgbọala. Gọọmentị steeti a na-anapụ ndị ji anya mmanya na-egwu na-anya ụgbọala ụgbọala ha.
- Iwu Amerịka akwadoghị egwuregwu chaachaa e ji ọkụkọ alụ ọgụ nke bụ Cockfighting na Bekee. Ha ji atụmatụ ịnapụ mmadụ akụnụba ya dịka ntaramahụhụ ndị ejidere na-eme nke a.
- Iwu Amerịka megidere iji ụgbọala eme egwuregwu ọsọ nke bụ Drag Racing n'okwu bekee. Gọọmentị Amerịka ji atụmatụ ịnapụ akụnụba dịka ntaramahụhụ nke a.
- Gọọmentị Amerịka na-eji kwa atụmatụ a ata onye e jidere na-atụ chaachaa nke iwu akwadoghị ahụhụ.
- E nwere ụfọdụ anụmanụ nke iwu akwadoghị ka egbuo maọbụ chụọ na nta. Gọọmentị Amerịka ji iwu a ata onye kọrọ azu nke iwu akwadoghị ịkọ ntaramahụhụ.
- Ọzọ abụrụ na nrụrụaka nke iji ego achụ ego nke a na-akpọ Securities Fraud n'okwu bekee. Gọọmentị Amerịka ji kwa iwu a enye ntaramahụhụ mgbe mmadụ ji nrụrụaka napụ ndị mmadụ ego ha dịka o nyere ha ndụmọdụ ka ha zụta maọbụ ree ihe nke ga-efu ha ego ma mee ka onye ahụ nweta ego.









