Ihe Ohanaeze sara Lai Mohammed maka ebubo o boro Peter Obi

Ebe foto si, Ohanaeze Ndigbo/Lai Mohammed
Otu jikọtara ndị Igbo n’ụwa gbaa gburugburu bụ Ohanaeze Ndigbo akatọọla minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed maka ebubo o boro Peter Obi ji ọkọlọtọ Labour Pat zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023.
Mohammed na mgbasaozi o mere na mba Amerịka n’izuụka a kwuru na Obi na osote ya bụ Datti Baba-Ahmed na-akpa agwa ndị nwereike ibute ọgbaghara na nkewa na Naịjirịa kamgbe e merichara ha na ntuliaka ahụ.
N’ozi odeakwụkwọ mgbasaozi otu a bụ Chiedozie Alex Ogbonna wepụtara, otu a sị ka ha kpọọla uche Lai Mohammed azụ n’ihe o kwuru n’afọ 2015 na ọchịchị onye kwuo uche ya ga-akụrụ ọnụ na Naịjirịa ma ọ bụrụ na APC emerighi na ntuliaka.
Ọ sị na ndị otu APC gakwara n’ihu kwuo na ha ga-ajụ ịnabata mpụtara ntuliaka 2015 ma hiwe ọchịchị nke aka ha ma ọ bụrụ na PDP mee nrụrụaka na ntuliaka ahụ.
Ohanaeze kwuru na Lai Mohammed bụ odeakwụkwọ APC n’oge ahụ gọrọ sị na ihiwe ọchịchị ‘parallel government’ abughị ibuagha megide gọọmentị nọ n’ọchịchị. Na ọ gara n’ihu kwuo na o nweghi ibuagha megide gọọmentị karịrị izuru uche ndị mmadụ site n’izu vootu ha.
Ha gakwara n’ihu rụtụaka etu onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari jiri yie egwu na ọbara ga-akwafu ma ọ bụrụ na o merighi na ntuliaka 2011.
Ha kwuru na ọ bụ ihe dị njọ ibu Obi na Datti Ahmed ebubo ibuagha imegide gọọmentị maka na ha kwupụtara iwe ha n’etu ntuliaka 2023 si gaa dịka ọtụtụ ndị Naịjirịa na ndị ofesi si katọọ ya.
Ohanaeze nke onye ndu ha bụ Emmanuel Iwuanyanwu kwuru hoohaa na o doro ewu na ọkụkọ anya na nrụrụaka dị na ntuliaka Naịjirịa e mere n’ọnwa Febụwarị 2023.
Ebubo Lai Mohammed na-ebo m bụ ebubo ụgha - Peter Obi

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Peter Obi, onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Labour Party' ekwuola na gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya ebubo ụgha ma na-ekwu na ya na-akpa nkata ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Obi kwuru nke a n'ịzaghachi ebubo a Lai Mohammed, bụ Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa, boro ya dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na mba Amerịka Obi kwuru na "ọ bụ ihe mwute mbọ dị icheiche nke a na-agba iji metọọ aha ya ma gosipụta ya dịka ihe ọ bụghị".
"Mịnịstra Lai Mohammed ibo m ebubo na m na-akpata ọgbaaghara bụ okwu ụgha nakwa ihe abụghị eziokw."
"Onwebeghị mgbe m ji nwee mkparịtaụka maọbụ nye onye ọbụla ndụmọdụ ilelị obodo Naịjirịa anya. Ekwubeghị m okwu ọbụla maọbụ kwadoo atụmatụ ọbụla megide Naịjirịa.
"Ọ bụ ndị na-eme ihe dị otu a na-ejikwa ikike ọkwa ha gbalitere agbalite nakwa ndị ọrụ ha na-ebo m ebubo ụgha ndị a.
"O doro anya na m na-agagharị na-ekwu okwu ga-akwalite udo, onweghịkwa mgbe m chụrụ nta vootu n'ịgbado ụkwụ n'agbụrụ maọbụ n'okpukperechi. Atụkwasịrị m obi n'ụzọ ziri ezi, ugbua, esikwa m n'ụzọ ụlọikpe na-achọ mmezi."
Peter Obi, Datti Baba-Ahmed adaala iwu 'treason' - Gọọmentị etiti

Lai Mohammed na ụlọ ntaakụkọ dị icheiche na mba Amerịka, nke gụnyere Washington Post, Voice of America, na Associated Press - nwere mkparịtaụka gbasara ntuliaka e mere na Naịjirịa n'ọnwa Febrụwarị na Maachị 2023.
Mohammed kwuru na ọ bụ ihe dị njọ na Peter Obi na-ekwu na ya agaala ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka ahụ, ma na-aga n'ihu ikwu okwu nwereike ịkpata ọgbaaghara.
"Gị na osote gị ekwesịghị ị na-amaja ndị Naịjirịa site n'ikwu na idu onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala (bụ Bola Ahmed Tinubu) n'iyi ọrụ ga-abụ njedebe ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa. Nke a bụ treason," Mohammed kwuru.
O kwuru na ihe Obi na Baba-Ahmed na-ekwu bụ akparamagwa ndị chọrọ ihe naanị maka onwe ha n'ihi na ha na-eche na ọ bụ naanị oge ha meriri ntuliaka ka ha ga-ekwenye n'ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ntuliaka 2023 bụ nke kacha doo anya na Naịjirịa

Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ na mba Amerịka, Lai Mohammed gara n'ihu kwuo na ntuliaka nke afọ 2023 bụ ntuliaka kacha doo anya kamgbe Naịjirịa malitere.
O kwuru na Peter Obi nakwa Abubakar Atiku - onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'otu Peoples Democratic Party (PDP) - agaghị emeri n'ikpe nke ha wegara n'ụlọikpe gbasara ntuliaka ahụ.
Mohammed kwuru na ọ bụ naanị Tinubu nwatara ihe niile akwụkwọ iwu Naịjirịa kwuru na mmadụ ga-enweta iji bụrụ onyeisiala.
"Ihe akaebe gosiri nke a bụ na pati Onyeisiala (Muhammadu Buhari) dara ntuliaka na Katsina nke bụ steeti onyeisiala si pụta," Mohammed kọwara.
"Ọzọkwa, onyeisiala a họpụtara ọhụrụ dara na steeti ya bụ Legọs, ebe onyeisi pati anyị bụ Abdullahi Adamu dara ntuliaka na steeti ya bụ Nasarawa dịka Labour Party meriri ebe ahụ."
"Onyeisi otu achụmnta vootu pati anyị dara ntuliaka na steeti ya bụ Plateau ebe PDP nwetara mmeri."
"Onweghị ihe ọzọ gosiri na ntuliaka a doro anya, karịa na ndị niile welitere isi na pati anyị dachara ntuliaka na steeti ha n'ihi na nrụrụaka adịghị na ya."









