“Ihe anyị na-eme iji kekpọọ nchekwa Ọwụwa Anyanwụ maka Ekeresimesi”

Akwammiri Naịja

Ebe foto si, BBC Media Action

Otiegwu tiri egwu sị “ọnwa Disemba bụ ọnwa ihe niile ji eme eruwego”. Ụgbọ njem nke ọtụtụ ndị si Ọwụwa Anyanwụ na-adazi kwarapụ kwarapụ iji gbaruo obodo ha dị iche iche.

Mana tupu i mee njem n’oge a, gbalịa mata okporoụzọ ndị ị ga-ezere dịka BBC Igbo mere akụkọ banyere ha.

BBC Igbo gakwara n’ihu kpọtụrụ ndị Gọọmentị steeti dị n’Ọwụwa Anyanwụ ịmata atụmatụ ha banyere nchekwa okporọụzọ ndị a ọkachasị n’oge Ekeresimesi a.

Lee ụfọdụ atụmatụ ndị a hiwere maka nchekwa;

Abia Tọwa

Abia Steetị

Kọmishọna mgbasaozi bụ Eze Chikamnayo kwuru na gọọmentị Abia Steeti ehiela asaa n’anya iji hụụ na nchekwa dị n’obodo niile.

O kwuru na ihe ndị gọọmentị mere iji weta nchekwa n’Abia gụnyere;

Ihiwe mịnịstrị nchekwa a kpọrọ “ministry of homeland security” na Naịjirịa bụ ndị ọrụ ha bụ ịhazi nchekwa.

Nkewapụta kọmitti a kpọrọ ‘local government security commitee’ bụ ndị na-ahụ maka nchekwa ime ime obodo; ndị a gụnyere onyeisi okpuruọchịchị, ndị Eze ọdịnala na ndị ndu obodo.

Chikamnayo kwuru na ọ bụ atụmatụ ndị a mere ịtọrọ mmadụ, izu ohi na mpụ dịi iche iche ji kụrụ ọnụ n’Abia.

N’ikpeazụ, o kwuru na gọọmentị Abia na-anabata nwafọ Abia maọbụ onye ọbụla chọrọ ilọta maka emume Ekeresimesi.

Okporoụzọ Ebonyi State

Ebe foto si, Ebonyi State Government

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ebonyi Steeti

N’otu aka ahụ kọmishọna mgbasaozi n’Ebonyi Steetị bụ Uchenna Orji kwuru na gọọmentị Ebonyi Steeti emeela ọtụtụ ihe iji kwado nchekwa na steeti ha.

O kwuru na ụfọdụ ihe ndị a gụnyere;

Ihiwe otu nchekwa a kpọrọ ‘Ebubeagụ’ bụ na-ahụ maka nchekwa ime obodo gbaa gburugburu.

Ọ sị na ndị mejupụtara ‘Ebubeagu’ bụ ndị si n’obodo dị iche iche n’Ebonyi Steeti bụ nke ndị Eze ọdịnala họpụtara.

Ọ gara n’ihu kwuo na nhiwe ngalaba ‘Ebubeagu’ nyere ọtụtụ ndị ntoroọbịa Ebonyi steetị ọrụ ma belata mpụ na izu ohi.

Orji sị na ihe ọzọ gọọmentị ha mere bụ ịrụ okporoụzọ nkere ka ime njem dị mfe na steeti ha tinyekwara ọkụ latrik na-acha n’okpuruọzọ.

O kwuru na ọ bụrụ na ị gaa n’obodo ndị enweghi ụzọ maọbụ ọkụ latrik na ohi, ntọrọ mmadụ na mpụ dị iche iche rie elu.

BBC Igbo kpọtụụrụ gọọmentị steetị ndị ọzọ dịka Anambra, Enugwu nakwa Imo mana ha azabeghi oku rute mgbe akụkọ a pụtara.

Ọ gara gwa ndị njem na-achọ ịlọta Ebonyi ka ha lọtawa na ntọrị mmadụ, izu ohi nakwa mpụ ndị ọzọ adịghị na steetị ha.

Imo Steeti