Yuletide Travels: Lee okporoụzọ ebe i kwesịrị izere n'oge a

Okporouzo gawara Opi Nsukka

Dịka mmemme Ekeresimesi na-abịa nso n'ike n'ike, ọnụọgụgụ ndị njem ga na-arị elu dịka ndị mmadụ ga na-achọ ịga sonyere ndị ha hụrụ n'anya maka ya bụ emume.

Mana ọnọdụ nchekwa na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa na-akawanye njọ, ọtụtụ okporoụzọ ugbua abụrụla ebe ndị omekome na-awakpo ndị mmadụ kwa mgbe kwa mgbe, na-ezu ohi, na-atọrọ mmadụ, oge ụfọdụ ọtụtụ na-atụfukwa ndụ ha.

Njem okporoụzọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ugbua bụzi onye na-aga, ọ chịrị bi n'aka, na-ekpe ekpere n'ihi ụjọ.

Lee okporoụzọ ụfọdụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ebe ị ịkwesịrị ihi aka abụọ n'anya tupu ịgbaa ya bụ ụzọ ụgbua:

Enugwu steeti.

1. Okporoụzọ Ugwogo Opi-Nsukka

Ụzọ si Ugwogo gawa Opi Nsukka bụ ụzọ ọhụrụ nke Gọvanọ Sullivan Chime rụrụ oge ọ na-achị Enugwu steeti, ihe dịka afọ iri gara aga.

Ya bụ ụzọ dị mkpa nke ukwuu n'ihi na o mere ka njem ịga Nsukka nakwa mpaghara Ugwu Naịjirịa dịwanye nkenke.

Mana kamgbe afọ a, ihe niile gbanwere dịka ndị ekperima jizi mpaghara Ugwu Ekwegbe na Agu Opi wee mere isi ọnọdụ ha.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị ọchịehi nakwa ndị ojiegbe ndị ọzọ na-atọ mmadụ kwa mgbe kwa mgbe n'okporoụzọ ahụ.

Iji maa atụ n'ụbọchị 23 nke ọnwa Oktoba 2022, ndị ntọrị kwụsịrị ụgbọala bu ndị njem, bukọrọ ha niile baa n'ime ọhịa. Ha malitere ịkpọ ndị ezinụlọ ndị ahụ ha tọọrọ na-ekwu ka a kwụọ ha ụgwọ tupu ha atọhapụ ndị ahụ.

Ọ bụ n'okporo ụzọ ahụ ka a tọọrọ onye bubu kọmishọna nakwa onyeisi ndị ọrụ Gọvanọ Chimaroke Nnamani.

2. Okporoụzọ Four Corner-Udi

Ndị njem na-esikarị ụzọ si mpaghara 'Four Corner' gawa Udi n'ihi na ọ mara mma bịakwa dị mfe iji zeere kpachikpachi ụzọ na-adịkarị na mpaghara 9th mile Enugwu.

Mana n'ọnwa September afọ a ka ndị ntọrị malitere ịkpa ike ọjọ ebe ahụ, nke mere ka ọ bụrụzie kwa ụbọchị kwa akụkọ.

Ọ bụ eziokwu na ndị agha na-anọzi n'okporoụzọ ahụ ugbua na mpaghata Ishi Ozalla, mana ndị ekperima ka na-enyekwa nsogbu na mpaghara Osimiri Nvene.

3. Adani-Uzo Uwani-Nimbo

Mwakpo ndị ọchịehi ugboro ugboro emeela ka mpaghara a bụrụ ebe ndị njem na-atụ egwu ịgba.

N'ọdị nso a, enwekwaala akụkọ maka mwakpo na ntọrọ mmadụ n'ụzọ a.

4. Agbani-Akpugo-Ozalla

Otụtụ okporoụzọ n'okpuru ọchịchị Nkanụ East na West nọzị n'oke egwu ugbua n'ihi na ndị ntọrị na akpazi ike ebe ahụ.

Cheta na ọ bụ n'okporoụzọ ahụ ka a tọọrọ ndị Nollywood mmadụ abụọ bụ Cynthia Okereke na Clemson Cornel dịka ha gachara ime ihe ejije n'ụzọ Ozalla.

Abia Steeti

Okporoụzọ Okigwe-Uturu

Ọ bụ ụzọ a ka e si aga Mahadum Abia steeti dị n'Uturu.

Ugboro ugboro ka ndị ntọ tọọrọ ụmụakwụkwọ nakwa ndị nkuzi mahadum ahụ.

Okporoụzọ Lokpanta-Umunneochi

Mpaghara a dị n'okporoụzọ si Enugwu gawa Pọtakọtụ, na mpaghara ebe a na-ere ehi n'obodo Umunneochi.

Ọtụtụ ndị mmadụ atụfuola ndụ ha na mpaghara n'ihi mwakpo ndị ekperima.

Ọ bụ na mpaghara a ka a nọ tọrọ onye bụbu onyeisi ụka Methodist na Naịjirịa bụ Samuel Kanu n'ọnwa Mee afọ a.

Ụkọchukwu Samuel kwụrụ otu narị nde naịra tupu a tọhapụ ya, o kwukwara na ọ bụ ndị ọchịechi Fulani tọọrọ ya na ndị otu ya.

Anambra Steeti

Okporoụzọ Ihiala-Ọlụ

Ọtụtụ akụkọ ọjọọ aụtala gbasara mwakpo, ntọrọ nakwa ogbugbu mmadụ na mpaghara a.

Ọ bụ ebe a ka ndị ekperima tọọrọ ma gbuo ndị agha abụọ na-aga emume agbamakwụkwọ ha n'ọnwa Mee afọ a.

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ IPOB n'ịchafụ na ndị ọgụ ha bụ ESN, na-akpa ike ọjọọ a.

Mana ndị IPOB na ESN na-ekwu na ọbụghị ha.

Okporoụzọ Enugwu-Ọnịcha (Old Road)

Ọ bụ ebe a ka ndị ekperima nọrọ wakpo onye omeiwu Naịjirịa bụ Ifeanyi Ubah, na mpaghara Enugwu-Ukwu, n'ọnwa Sepụtemba.

Ndị uweojii kwuru na ndị ekperima ahụ gburu mmadụ ise ha na Ifeanyi Ubah so n'ụbọchị ahụ.

Ọ bụkwa n'okporoụzọ a, na mpaghara Afọ Nkpọọ, ka ndị ekperima wakporo ma gbuo Dọkịta Chike Akunyili na Septemba afọ 2021.

Okporoụzọ Abatete-Ideani

Ọ bụ n'okporoụzọ a ka ndị ojiegbe wakporo ma gbuo otu ide ego aha ya bụ Philip Udala, onye nwe otu bọọlụ a na-akpọ Udala FC, n'ọnwa Julaị 2021.

Ndị ekperima ahụ gbukwara onye uweojii na-eche nwa amadị ahụ nche, nakwa otu onye ọzọ aha ya bụ Godsent Eriobu, bụ onye nkuzi ndị Udala FC.

Okporoụzọ Nanka-Ekwulobia-Oko

Mpaghara so n'ebe enwerela ọtụtụ mwakpo ndị ekperima n'ọdị nso a.

N'ọnwa Maachị afọ a, ụlọntaakụkọ Guardian kwuru na ndị ekperima gburu ihe ruru mmadụ 12 n'ime otu izuụka.

Okporoụzọ ndị ọzọ ebe enwerela mwakpo ndị ọrụ nchekwa na ndị njem ugboro ugboro gụnyere: Nnobi-Agulu-Nnewi, Awkuzu-Nkwelle Ezunaka, Nimo-Neni. dgz.

Ebonyi Steeti

Okporoụzọ Enugwu-Abakiliki

N'ọdị nso a, enweela mwakpo dị icheiche n'okporoụzọ a, ọ kachasị na mpaghara Presco, ebe ndị ekperima wakporo ma gbuo ndị uweojii.

Mpaghara Ezzamgbo 'junction', dịkwa n'okporoụzọ a, bụkwa ebe ndị ojiegbe wakporo ụgbọala na-ebu ego a kpọrọ 'bullion van' ma gbuo ụfọdụ ndị uweojii.

Ebe ọzọkwa bụ mpaghara Ezza-Ezzilo ebe ndị ọchịehi na-awakpo ugboro ugboro.

Okporoụzọ Nnodo-Ogbaga

Enweela ọtụtụ mwakpo ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ na mpaghara.

N'ọdị nso a ka ndị ojiegbe gburu otu onye ọrụ nchekwa 'Ebube Agu' n'okporoụzọ a, wakpoo ndị njem ma gbaa ụgbọala ha na ọgbatumtum ọkụ.

Mpaghara Ụkawu/Isinkwo

Ebe a bụ ebe a na-enwekarị nsogbu obodo na obodo nke buterela ọtụtụ nkwafu ọbara ndị njem na-agara onwe ha n'ọdị nso a.