Ikwu mmadụ o tozuru oke iketa akụnaụba ya ma ọ nwụọ?

Aha onyonyo, Ikwu mmadụ na-abụkarị onye akaebe maọbụ onye na-anọchite anya mmadụ, ọkachasị n'oge mkpa.
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Ndị na-eru uju

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Igbo bụ agbụrụ anaghị eji ezinaụlọ egwu egwuregwu. Ọ bụ nke a kpatara ha ji enwe ndị ikwu na ibe.

Onye ọbụla bụ nwaafọ Igbo nwere ezinaụlọ o si na ya pụta, nwee ụmụnne, nweekwa ndị ikwu na ibe.

Nne na nna maọbụ ụmụnne mmadụ ndị nke nwoke na ndị nke nwaanyị nwere ike ị bụụrụ ya ikwu.

Ndị ọzọ nwekwara ike ị bụụrụ mmadụ ikwu bụ ụmụ ha, di maọbụ nwunye ha, nne maọbụ nna ochie ha, nwanne nne maọbụ nwanne nna ha.

Ikwu mmadụ na-abụkarị onye akaebe maọbụ onye na-anọchite anya mmadụ, ọkachasị n'oge mkpa.

Otu ihe mere ndị Igbo ji enwe ikwu bụ ka ha hụ onye ga-anọchite anya ha ọ bụrụ ma a chọọ ha ma ahụghị.

Ndị Igbo bụ ndị nwere ọtụtụ akụnụba gụnyere ala, ugbo, akwa nakwa ego. Ha na-alụkwa ọtụtụ nwunye ma mụtakwa ọtụtụ ụmụ.

Ọ bụ ọnọdụ dị etu a mere ha ji ahọpụta otu onye si n'agbụrụ ha dịka ikwu, nke bụ onye ga-elekọta maọbụ kesaa akụnaụba ha etu kwesịrị ekwesị ọ bụrụ ma ha emeghị nke ahụ tupu ha anwụọ.

Mana ụfọdụ oge, ndị mmadụ na-eche na onye ọbụla mmadụ ji mere ikwu bụ ya ga-eketa akụnaụba niile onye ahụ ga-ahapụ n'ụwa oge ọ nwụrụ.

Ụfọdụ na-echekwa na ọ bụrụ ma e jiri ha mee ndị ikwu, na ha ga-enwe ikikere ịdọrọ maọbụ lekọta ego ọbụla dị n'ọbaego onye ahụ ma ọ nwụọ.

Ọ bụ nke a mere anyị ji kpọtụrụ onye Ọkaiwu ọnọdụ a doro anya nke ọma bụ Barr. Nnennaya Anozie iji mara ihe iwu Naịjirịa kwuru gbasara ikwu mmadụ.

Onye bụ ikwu mmadụ?

Ndị nọ n'ime ụlọ ha

Ebe foto si, Getty Images

Ikwu mmadụ bụ onye mmadụ nyere ikike ịnọchite anya ya site na nkwado nke iwu na-achị obodo.

Barr Nnennaya sịrị na "ikwu mmadụ bụ onye e kwupụtara dịka onye kachasị dị onye ahụ nso. Nke pụtara na onye ahụ bụ onye natara ikike site n'aka onye nyere ya ikike ahụ ịnọchite anya ya n'ọnọdụ ụfọdụ nke na-abụghị n'ọnọdụ niile".

"O nwereike ị bụ n'ọnọdụ gbatagbata maọbụ ịnọchite anya ya n'otu ebe maọbụkwanụ oge mmadụ na-etinye aka n'akwụkwọ. Ebumnoobi nke a bụ i ji hụ onye a ga-akpọtụrụ ọ bụrụ ma ọ danye na mkpa".

"N'aka nke ọzọ, i nwekwara ike kọwaa ikwu mmadụ dịka onye mmadụ họpụtara a ga-akpọtụrụ ọkachasị n'oge mkpa," ka Barr Anozie kwuru.

Kedụ onye mmadụ kwesịrị iji mere ikwu ya?

Mbaraezi mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

"Mmadụ nwere ike i ji onye ọbụla ọ tụkwasara obi mere ikwu ya. O nwere ike bụrụ di, nwunye, ụmụ, ụmụnne, nne maọbụ nna," ka Barr Anozie kọwara.

Ọ gara n'ihu kwuo na a na-enyekarị ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha were okenye [ya bụ, onye ruru afọ iri na asatọ] mere ikwu ha.

Ọ sịrị na nke a bụ n'ihi na onye ahụ eruola ogogo inwe mkpebi n'onwe ya dịka ọ dị n'iwu.

Ọ bụ onye mmadụ ji mere ikwu ga-eketa akụnaụba ya ma ọ nwụọ?

Oliliozu mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

"Mba. Na mmadụ mere gị ikwu ya, enyeghị gị ikikere ọbụla iketa akụnaụba ya maọbụ ihe ọbụla o nwere ma ọ nwụọ," ka Barr Nnenna kọwara.

Dịka o siri kwuo "tupu ụlọakụ enye gị ikikere ịdọrọ maọbụ lekọta ego dị n'ọbaego onye ji gị mere ikwu ya, ị ga-enwerịrị leta ntozuoke a na-akpọ 'letter of administration'".

"Dịka iwu Naịjirịa siri kwuo, mmadụ ọbụla enweghị ikikere ilekọta akụnaụba onye nwụrụ anwụ naanị na onye ahụ ji ya mere ikwu".

"E nwere ọtụtụ iwu na-elekọta usoro nkesa akụnaụba, ndị gụnyere iwu ọdịnaala, iwu sharia na iwu Bekee," ka Barr Anozie kwuru.

Ọ sịrị na tupu ekwube okwu ime ka ikwu mmadụ were maọbụ lekọta akụnaụba onye nwụrụ anwụ, a ga-ebu ụzọ leba anya n'ọnọdụ o jiri nweta akụnaụba ahụ nakwa ọnọdụ jikọtara ya na onye ahụ o ji mere ikwu.

"Ọ bụrụ na onye nwụrụ anwụ kere ekpe tupu ọ nwụọ, nke ahụ ka a ga-eji mee ihe n'agbanyeghị ma o ji gị mere ikwu oge ọ dị ndụ."

"E nwere ọtụtụ iwu na-elekọta nkesa akụnaụba onye nwụrụ anwụ tụmadị ya bụrụ onye ekeghị ekpe tupu ọ nwụọ".

"Ọ bụrụ na mmadụ chọọ ka onye o ji mere ikwu ya keta akụnaụba ya ma ọ nwụọ, ọ ga-eme ka nke ahụ doo anya site n'ide ya n'akwụkwọ o jiri kee ekpe," ka Barr Anozie kọwara.

Uru na ọrụ dịịrị onye e ji mere ikwu

Ihu Ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ọrụ na uru dịịrị onye ọbụla mmadụ ji mere ikwu ya.

Barr Nnenna kwuru na "ọ bụrụ na mmadụ ji gị mere ikwu, ị kwesịrị inyere onye ahụ aka ime ụfọdụ ihe onye ahụ apụghị imere onwe ya".

"Ọ bụ gị bụ onye mbụ a ga-akpọ oge ọbụla a chọpụtara na onye ahụ enweghị ike imeere onwe ya ihe, tụmadị ya bụrụ ibinye aka n'akwụkwọ, ịrụ ọrụ ụfọdụ onye ahụ gaara arụ nakwa ịgakwuru onye Ọkaiwu ọ bụrụ na aha gị so na ndị ga-eketa ekpe".

"Ọtụtụ oge, ikwu mmadụ na-anata nkwụchapụ ụgwọọnwa ezumiike nka maọbụ ego nchekwaonwe onye nwụrụ anwụ, mana anyị ahụtụla ọnọdụ ụfọdụ n'ụlọikpe ebe onye e ji mere ikwu apụghị ịnata ego ndị a n'agbanyeghị na onye nwụrụ anwụ nyere ya ikike dị etu ahụ oge ọ dị ndụ," ka Barr Nnenna kwuru.

Akwụkwọ na-egosi ekpe mmadụ kere

Ebe foto si, Screenshot

Ihe nke a pụtara bụ na ọnọdụ onye e ji mere ikwu bụ nke gbapụtara ihe nakwa nke gbara ọkpụrụkpụ mana ọ pụtaghị na onye ahụ nwere ikike iketa akụnaụba onye ji ya mere ikwu ma ọ nwụọ.

Tupu mmadụ ọbụla eketa oke n'akụnaụba onye nwụrụ anwụ, ọ ga-abụrịrị nke onye ahụ depụtara ma binye aka na ya oge ọ dị ndụ maọbụkwanụ site n'usoro ọdịnaala.