Ị maara uru nwa nwoke bara n'ezinaụlọ n'ala Igbo?

Nwoke na ezinaụlọ ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwoke na ezinaụlọ ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ịmụta nwa nwoke bụ otu n'ime ụkpụrụ omenala dị n'ala Igbo.

Ọ bụrụ na a mụọ nwa nwoke n'ala Igbo, a na-enwe oke ọṅụ.

Ọ bụ ya mere e ji akwanyere nwa nwoke ugwu pụrụiche ma nyekwa ya ọkwa dị elu n'ala Igbo.

Dịka ọkammụta Chinedum Ezekiel Ofomata onye bụ ọkachamara n'asụsụ nakwa n'omenala Igbo, kwuru na ihe kpatara ndị Igbo ji ahụta nwa nwoke dịka nnukwu ihe mkpa n'ezinaụlo bụ maka na ọ bụ nwoke na-anọchi 'obi' nna ya ma ọnwụ.

Akụkọ a ga-egosi ma ọ bụ n'ezie na ụmụnwoke bara oke uru n'ezinaụlọ Igbo nakwa ọrụ ha na-arụ.

Akụkọ ndị ọzọ yiri nke a

Onye bụ nwa nwoke n'ezinaụlọ n'ala Igbo?

Nwa nwoke bụ onye nne na nna mụtara n'ezinaụlọ ha. Ọ bụrụ na nwaanyị tụrụ ime, oge ụfọdụ di ya ga-eme nyocha i ji chọpụta ka ọ bụ ime nwa nwoke. Ọ bụrụ na nke a bụrụ eziokwu, a na-enwe oke oriri n'ihi na ndị igbo na-ahụta nwa nwoke dịka ezi ihe.

Ofomata kwuru na "Nke a abụghị na nwa nwaanyị adịrọ mkpa n'ala igbo, kama na ọ bụ maka na ọ bụ nwa nwoke ahụ a mụtara ga-aga n'ihu lụta nwaanyị, mụọ nwa nke e ga-eme ka ezinaụlọ na agbụrụ n'abawanye."

Dịka ọmenala Igbo si kwu, "Ọ bụ nwa nwoke nwannyị a lụtara mụrụ ka omenala ndịigbo nabatara dịka nwa nwoke".

"Ọ bụrụ na nwaanyị mụọ nwa nwoke bee nna ya tupu ọ lụọ di, omenala igbo anaghị ahụta nwa nwoke ahụ dịka onye nwere oke n'ezinaụlọ a na-alụ nne ya," Ka Ofomata kwuru.

Mgbe gboo, e nwere aha a na-enye nwa nwoke n'ala igbo.

Ha gunyere Nweke, Nwafọ Ọkpara, Nwadiala, Mgbaafọ wee diri ga wa.

Ọrụ nwa nwoke na-arụ n'ezinaụlọ

Ọkammụta Chinedum Ezekiel Ofomata kwuru na "Ọ bụghị nwaanyị na-anọchi obi nna ya maka na nwaanyị ga-alụ di."

"Nwoke ọbụla na-amụtaghị nwa nwoke, ị mara na obi ya ga-echi." Ọ bụ ya mere ndị Igbo ji aza aha dịka 'Obiechina, Ahamefuna na Amaechina'.

"Enweghị onye Igbo ọbụla chọrọ ka-echezọ aha ya ma ọ bụ ka agbụrụ ya mechie."

Nwoke dị mkpa n'ala Igbo maka na ndị Igbo kwenyere na ịmụbawaye nke bekee kpọrọ 'Procreation'.

"Ọ bụ ya kpatara amụta nwoke, ọ lụọ nwaanyị maka ndị Igbo si na, 'onye amụtara, ọ mụta ibe ya."

Ọ bụ amụta nwoke n'ala Igbo, ụmụnna enwe ike ị na-eto eto.

"Mgbe gboo, ihe e ji ama nnukwu mmadụ n'ala Igbo bụ ụmụ nwoke ole ọ mụrụ. Ọ bụrụ na ihe si ike n'ezinaụlo, ọ bụ nwoke ka a ga-akpọ maka na ọ bụghị ihe niile nwoke mere ka nwaanyị nwere ike ime."

Ọkammụta Ofomata kwuru na "Ọ bụ naanị ụmụ nwoke ka a na-ekenye ala n'ala Igbo." Nke a gosiri ezi mkpa ọ dị na nwoke ọbụla n'ala Igbo mutara nwa nwoke.

Gịnị ga-eme ezinaụlọ na-amụtaghị nwa nwoke?

Foto ezinaụlọ n'ụlọ ha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto ezinaụlọ n'ụlọ ha
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ bụrụ na-amụtaghị nwoke n'ezinaụlo, a ga-enwe ihe omenaala Igbo kpọrọ 'ihachi obi' ezinaụlọ dị etu a.

"Ihachi Obi bụ mgbe a ga-arịọ otu nwaanyị n'ezinaụlo ahụ ka ọ hapụ ịlụ di ma nọrọ bee nna ya tụrụ ime iji mara ka ọ ga-amụta nwa nwoke ga-anọchi nna ezinaụlọ ahụ nwụrụ."

Ọ bụrụ nwoke amụtaghị nwoke tupu ọ anwụọ, ụmụnne ya ga-enwere akụnaụba niile ọ kpatara maka na ọ mutaghị nwa nwoke ga-anọchi ya ma leta ihe ndị ahụ ọ hapụrụ nwụọ.

Oge ụfọdụ, a na-akọ ezinaụlọ na-enweghị nwa nwoke ọnụ. Ọzọ dị ka ibe ya bụ na a na-ahụta ezinaụlọ dị etu a dịka ndị na-enweghị enyemaka nke nwere ike ịbute mmekpahụ dịrị ezinaụlọ ahụ.

Iji gbochie ihe di etu a ime, ọ na-adị mkpa ka di na nwunye kpa nkata ka nwoke lụọ nwaanyị ọzọ iji mara ka ọ ga-amụta nwa nwoke.

"Ị lee anya n'omenala Igbo mgbe gboo, ezinaụlọ nwoke lụrụ ọtụtụ nwaanyị na-ebi n'udo karịa ka ọ dị taa"

"Ndị Ụka na nkụzi ndị ọcha mere ka a na-enwezi ọgbaghara n'ezinaụlo nwoke lụrụ ọtụtụ nwaanyị ugbua."

"Omenala Igbo akwadoghi otu nwoke otu nwaanyị ndị ụka na-akụzi ugbua.

Omenaala Igbo kwenyere na-aga na-amụbawye ma na-eto eto.

Ihe Igbo kwuru maka uru ịmụ nwa nwoke

Ndị ichie n'ala Igbo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ichie n'ala Igbo

Ofomata kwuru na "Uru dị na ị mụta nwa nwoke bụ na ọ bụ nwa nwoke ga-eleta nne na nna ya na nkà."

Ọ gbakwunyere na "Ọ bụrụ na nwoke nọrọ n'ezinaụlo, ndị ọjọọ, ma ọbụ ndị chọrọ imebi ihe ga na-atụ egwu ịbata ezinaụlọ ahụ maka na mara na nwoke nọ ya."

Enwere ụfọdụ nkata, nzukọ ụmụnna na mmemme ọ bụ naanị ụmụ nwoke ma ọ bụ ndị mụtara nwoke na-esonye na ya.

"Ọ bụrụ na-achọ ime nzukọ ahụ, a ga-agwa ụmụ nwaanyị pụọ tupu e bido ya."

Ọ bụ nwoke na-awa ọjị n'ala igbo. Omenala ndịigbo megidere nwaanyị ịwa ọji.

Ọzọ bụ 'ije agha', "Ọ bụrụ n'agha daa, ọ bụ ụmụnwoke na-eje anụ agha n'ala Igbo"

"Enweghị ọghọm ọbụla dị na-ịmụta nwa nwoke n'ala Igbo".

Ofomata gbakwunyere na "Nwoke dị mkpa" maa ọ dara ngwọrọ maa okpuru isi, Nwoke bụ nwoke"

Mmemme omenaala n'ala Igbo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmemme omenaala n'ala Igbo

Dịka omenaala ndị Igbo si dị na mgbe gboo, ọ bụ nwaanyị ka a na-ata ụta ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwoke n'ezinaụlo.

Mana ugbua, ihe niile agbanwela.

Ọfọmata kwuru na "Ọ bụrụ na nwaanyị amụtaghị nwoke ugbua, nnyocha sayensị mere ka amata na ọ dị nwaanyị na di ya n'aka, ọ bụ ozi nwoke tụrụ nwunye ya n'ahịa ka ọ zụtara ya."

Mmepe e nwere ugbua a mere ka anapụta ụmụ nwaanyị na afụfụ ha na-ata mgbe gboo ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa oké.

Ọzọ kwa bụ na amụtaghị nwoke na-ebute nsogbu n'etiti nwaanyị na nne di ya.

Nne di ọbụla n'ala Igbo na-atụ anya ka nwunye nwa ya mụta ụmụaka nwoke na nwaanyị.

Ihe dị etu a na-eme ka nne di nwaanyị ahụ bido chọba nwaanyị ọzọ nwa ya ga-lụbata ka onwe ike mụtara ya nwa nwoke.

Amụtaghị nwa nwoke na-eme ka nwoke kwụsị ịhụ nwunye ya n'anya. Nke a na-eme ka nwaanyị ahụ bido ije n'ụlọ ekpere iji mee ọgwụ ka di ya bido ịhụ ya n'anya.

Oge ụfọdụ, nke a na-ebute ogbaghara nakwa ntisa ezinaụlọ.

Akụkọ na-akọwa omenala Igbo

Ọ pụtara na nwa nwaanyị abaghị uru n'ala Igbo?

Nne na nwa ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nne ku nwa ya nwaanyị ọhụrụ

N'aka nke ọzọ, Ofomata kwuru na ị mụta nwa nwaanyị nwe kwara uru nke ya.

Nke mbụ bụ na ọ bụrụ na nne na nna anọghị n'ụlọ, ọ bụ nwa nwaanyị na-elekọta ma chịkọta ụmụnwanne ma nwoke ma nwaanyị.

"Ọ bụ ọrụ nwaanyị isii nri ma hụ na ezinaụlọ dị ọcha" ka Ofomata kwuru.

Uru ọzọ nwa nwaanyị bara n'ezinaụlọ n'ala Igbo bụ na oruo oge nwa nwaanyị ga-alụ di, ọ na a bụ ihe ọṅụ n'ezinaụlọ maka na ọ ga-eme ka onye ukwu ma onye nta zukọọ ma nwe ọṅụ.

"N'ala Igbo, ọ bụ nne mụtara nwa nwaanyị lụrụ di na-aga 'Ọmụgwọ' mgbe nwa ya mụrụ nwa. Ọmụgwọ bụ ezigbo ihe ọṅụ nye ndị nne n'ala Igbo maka na ọ na-egosi na nwa ha nwaanyị bụ nwaanyị n'ezia." Ofomata kwuru.