Ihe mere ụmụnwaanyị South Korea anaghị ekwe amụzị nwa

Ebe foto si, Jeanu Chung
- Onye dere ya, By Jean Mackenzie
- Ndị mere akụkọ a, Seoul Correspondent
Otu ehihie Tuzde, Yejin na-esiri ndị enyi ya nri ehihie n'ụlọ nani ya biiri onwe ya na Seoul, isobodo Saụt Koria n'obiọcha na-alụghị di.
Dịka ha na-eri nri, otu n'ime ha wepụtara ihe eserese ebe anụ adịghịkwa n'ụwa ugbua a kpọrọ 'dinosaur ' na Bekee kwuru sị, "Kpachara anya gị. Ekwela ka ụnụ nwụfucha dịka anyị".
Ụmụnwaanyị nile ndị ahụ dapụrụ n'ọchị.
Yejin bụ onye na-arụ ọrụ imepụta ihe onyonyo TV kwụrụ si, "Ọ tọrọ ọchị mana ọ tọchaghị m n'ihi na anyị nwere ike ibute mkpochapụ onwe anyị."
Ma Yejin ma ndị enyi ya enweghị nke chọrọ ịmụ nwa. Ha so n'ọtụtụ ụmụnwaanyị na mba Saụt Korịa achọghị nwa.
Saụt Koria bụ mba pekachịrị n'ụwa n'ịmụ nwa.
Ọnụọgụgụ a na-agbada kwa afọ dịka ngụkọ e wepụtara n'ụbọchị Wenezde gosiri na o ji pasent asatọ (8%) daa n'afọ 2023 rue 0.72.
Ọ bụrụ na ọ dịrị otu a gaa n'ihu, ọnụọgụgụ ndị Saụt Koria ga-eji ọkara gbadaa n'afọ 2100.
Nnukwu nsogbu nye mba ahụ

Ebe foto si, Jean Chung
N'ụwa nile, ọ kachasị na mba ndị mepere emepe, ọnụọgụgụ ọmụmụ(birth rate) na-akụda mana o nweghị mba dị njọ rue ndị Saụt Koria.
A na-atụ uche na n'afọ 50 na-abịa, ọnụọgụgụ ndị na-arụ ọrụ ga-agbada ọkara, nke ga-eme ka ọnụọgụgụ ndị na-eje agha otu afọ dịka ọ dị n'iwu na mba ahụ ga-ejiri pasent 58 gbadaa.
N'otu aka ahụ, mba ahụ ga-akachasị nwee ndị kara nka karịa afọ 65.
Nke a pụtara na akụnaụba na nchekwa mba ahụ nọ na nsogbu nke ndị ndọrndọọ ọchịchị mba ahụ sị bụ "oke ihe ndapụta gbatagbata".
Ihe karịrị afọ 20, gọọmentị kwuru gọọmentị na mba ahụ etinyela nnukwu ego na nsogbu a- ego dị tarị 379.8 ego mba ahụ, ya bụ ijeri dọla 286($286bn; £226bn.)
Asia na-emefu akatamkpo ego ịhụ na ụmụnwaanyị mụrụ nwa, okwu a ọ ga-enwe isi?

Ebe foto si, Jean Chung
A na-enye di na nwunye ji ụmụ ego, akọrọngwa e ji elekọta ndụ kwa ọnwa, ụlọobibi akwụbilatara ego ya nakwa ụgbọala n'efu.
A na-akwụkwara ha ụgwọ ụlọọgwụ, ụgwọ nleta maka ndị na-achọ nwa maọbụrụ na ha mere alụmdinanwunye.
Mana atụmatụ ndị a amịtabeghị mkpụrụ nke mere ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-achọ ihe ọzọ ha nwere ike ime iji kpalite ndị mmadụ ịmụwa nwa.
Nke a gụnyere idutere ha nwaneku site n'Ọwụwa Anyanwụ Asia, ịkwụ ha ụgwọọnwa opekatampe nakwa ịhapụ ụmụnwoke gara agha ka ha lawa maọbụrụ na ha mụruo ụmụ atọ tupu ha agba afọ 30.
Mana a na-ata ndị ọchịchị ụta na ha anaghị ege ndị ntorobia , ọ kachasị ụmụnwanyị ntị iji mata ihe ha chọrọ.
Ya mere anyị gị gagharịa na mba ahụ nile na-ajụ ụmụnwaanyị ajụjụ banyere ihe mere ha ji kpebie na ha agaghị na-amụ nwa.
Yejin chọrọ ịhapụ Saụt Koria
Oge Yejin chọrọ ibiwere onwe ya dịka ọ gbara afọ 20 n'ụma, ọ dị ka nsọ ala n'ihi na, na Koria nwaanyị ibiri onwe ya nwere ka e si ahụta ya.
Afọ ise gara aga, o kpebie na ya agaghị alụ di, nke ya ga-eji amụ nwa.
Ọ gwara onye ntaakụkọ anyị sị, "O siri ike inweta nwoke tozuru ọyịyị na Koria, onye ga-ekwe ka anyị na-eke ọrụ ilekọta nwa na ọrụ ndị ọzọ dị n'ezinaụlọ."
" Ọzọ, e jighị anya ọma ele ụmụnwaanyị mụrụ nwa na-alụghị di."
N'afọ 2022, nani pasent 2 ụmụaka bụ ndị a mụrụ na Saụt Koria na-alụghị di.
Ọrụ agwụ agwụ

Ebe foto si, Jean Chung
Kama ya , Yejin hara ịrụ ọrụ ya dịka onye ihe onyonyo TV bụ nke o kwuru agaghị enye ya ohere ịzụ nwa.
Na Saụt Koria a na-arụ ọrụ ogologo awa.
Yejin na-arụ ọrụ malite n'Elekere Itoolu rue Elekere Isii nke ụbọchị dịka ndị koria si agụkọ nke ha mana o kwuru na ya na-arụ rue Elekere Asatọ ma tinye jara.
O larue, nani ohere idowe ụlọ ya ọcha maọbụ megharịa ahụ ka o nwere tupu ọ laba ụra.
"Ahụrụ m ọrụ m n'anya. Ọ na-enye m afọ ojuju."
"Mana ịrụ ọrụ na Koria siri ike, ị ga-atọ n'ịrụ ọrụ agwụ agwụ."
Yejin kwuru na ya na-agụkwa akwụkwọ iji nyere onye ya aka n'ọrụ ya ka ya kawanye mma.
"Ndị Koria nwere nkwenye na ọ bụrụ na ịnaghị aga n'ihu ịkwalite mmụta n'onwe gị, ụgbọ agha gị."
"Ọ bụ egwu a mere anyị ji arụsi ọrụ ike."
Ihe m ma karịrị

Ebe foto si, Jean Chung
Otu nwaanyị gbara afọ 28 na-arụ na ngalaba na-ahụ maka ndịọrụ n'ụlọọrụ ya kwuru na ya ahụla ndị a manyere ka ha gbaa arụkwaghịm n'ọrụ ha n'ihi na ha gara ezumike ịmụ nwa maọbụ ndị a hapụrụ bulie ogbo ha n'ọrụ n'ihi otu ihe ahụ. bụ nke mere ka ya kpebie na ya agaghị amụ nwa.
Ma nwoke, ma nwaanyị nwere ohere ịga ezumike otu afọ n'ime afọ asatọ mbụ na ndụ nwa ha.
Mana n'afọ 2022, naanị ndị nna pasentị asaa gara ezumike ahụ, ma e were ha tulee pasent ụmụnwaanyị 70 gara ya.
Ụmụnwaanyị Koria kachasị agụ akwụkwọ na mba ndị mepere emepe( OECD countries), mana mba ha bụ mba kachasị njọ na ndị anaghị akwụ nwaanyị ihe a na-akwụ nwoke, ha nwekwara ụmụnwaanyị anọghị nọ ọrụ.
Ndị nchọpụta kwuru na ihe ọ pụtara bụ na e weta ọrụ na inwe ezinaụlọ, ọtụtụ n'ime ụmụnwaanyị na-aharazi ọrụ.















