Ukraine war: Ọsịsa ajụjụ ise a na-ajụ ka agha a ruru afọ abụọ

Ebe foto si, EPA
Ma Yukren ma Rọshịa maọbụ ndị na-akwado mba abụọ ndị a enweghị ndị hụrụ ebe ha ga-agbado ụkwụ were kpee udo.
Kyiv gbara isi akwara na a gaenyegachi ya okeala nile nakwa ha chụpụrụ ndịagha Rọshịa, ebe Moscow na-ekwu na Ukraine abụghị obodo zuru oke, na ndịagha Rọshịa ga-ahụ isi ya imezu ebumnobi ha.
Anyị na-ele ihe na-eme ugbua nakwa ebe okwu a nwere ike ị ga n'ọdịnịhu.
Onye na-emeri?

Ebe foto si, Getty Images
Agha kara aka na-aga n'oge winta nke furu akụkụ abụọ ndụ ọtụtụ mmadụ.
Ihu agha ruru 1000 kilomita, ọnọdụ ya gbanwere nanị nwantịị kemgbe oge 'autum' nke afọ 2022.
N'ime ọnwa ole na ole Rọshịa ji wakpoo Yukren afọ abụọ gara aga, Yukren esila n'ugwu nakwa na nso isiobodo Kyiv chụmie ndịagha Rọshịa
Ha weghakwara obosara ala dị n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ndida na ngwụcha afọ ahụ.
Mana ugbua, ndịagha Rọshịa enwetawala ebe ndị Yukren gwunyeburu. Ndị Yukren na-ekwu na ngwagha ha agbadawala.
Nkwado a na-enye Yukren ọ gbadawala?
Kemgbe afọ abụọ, ndị na-akwado Yukren ezigarala ha nkwado ndịagha, ego nakwa ngwa enyemaka- ihe ruru ijeri 92 ($92bn) site n'aka ụlọọrụ ndị Yurop, ebe ijeri 73( $73bn) n'aka Amerika na Jenụwarị 2024, dịka ụlọọrụ 'Kiel Institute for the World Economy'.
Ụgbọagha, ogbunigwe na ngwa nchekwa elu si na mba ndị dị n'Ọdịda-Anyanwu Yurop rutere Yukren aka.
Mana ihe enyemaka ndị a na-agbada na nsonso a.
Nkwado Yukren na-enweta ọ na-agbada?
N'Amerịka, okwu inye ijeri dola 60 ọhụrụ agachaghị n'ihu n'ụlọomeiwu mba Amerịka n'ihi ndọrịdata ndọọndọọ ọchịchị imeụlọ.
A na-atụ uche na enyemaka si n'aka ndị na-akwado ga-akwụsị ma ọ bụrụ na Donald Trump emerie na ntuliaka banyekwa n'ọkwa dịka onyeisiala mba Amerịka na ntuliaka a ga-eme na Novemba.
Atụmatụ Roshịa ọ ga-agbanwe?

Ebe foto si, Sputnik/Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
E chere na Onyeisiala Vladimir Putin nke Rọshịa chọrọ inweta Yukren nile.
Na mkparịtaụka ya na onyentakụkọ Amerịka bụ Tucker Carlson, Onyeisial Roshia kwesiri kọọ ihe o chere bụ ihe mere oge ochie nakwa ihe butere nsogbu ahụ.
O teela o kwuwere, na-ewepụtaghị ihe akaebe ọbụla, na ndị nkịtị nọ na mpaghara Donbas dị n'Ọwụwa Anyanwu Yukren nwere mkpa nchekwa.
Tupu agha adaa, Putin depụtara ozi n'akwụkwọ akụkọ na-ekwu na Yukren abụghị mba kwụrụ onwe ya, sị na ụmụamala Rọshịa na Yukren bụ ndị otu obodo.
N'ọnwa Disemba afọ 2023, okwukwara maka atụmatụ 'iji ndịagha' mere Rọshịa ihe pụrụ iche na Yukren lụọ ọgụ' gụnyere, ikpochapụ "communism".
Ọ chọkwara "ịnapụ ha ike ndịagha" ha, ma gaa n'ihu na-akatọ otu NATO na-agbasa n'Ọwuwa Anyanwu Yurop.
Yukren bu mba nọrọ onwe ya , esoghị na nkwekọrịta enyemaka ndịagha ọbụla mana ha nwere ebumnobi ibanye otu 'European Union' nakwa NATO.
Ihe ndị a bụ ihe a na-ele anya n'itule okwu a.
Atụmatụ ndị a bụ ihe a na-ele anya iji mee ka Yukren kwụsie ike, ma gbochie mbọ ọbụla ịkpaliekwa otu 'Soviet Union' n'ụzọ abụla ụzọ.
Kedụ ka agha ga-esi bi?
E lewe anya na o nweghị akụkụ nke chọrọ ichiliri ibe ya aka elu, ọdịka Putin ga-aga n'ihu nọrọ n'ọkwa ọchịchị, nke pụtara na agha ag=hụ ga-aga n'ihu.
Otu na-eme nnyocha nchekwa n'ụwa bụ Globsec, nke na-achịkọta ozi si n'aka ndị ọchamara kwuru na agha ga-agafe afọ 2025.
Globsec natara ozi si n'aka ndị ọkachamara nke ihe nwere ike ime.
Mpụtara mkpọkọta ozi ahụ kwuru na ọnọdụ agha a nwere ike ịgafe afọ 2025, na ọ ga-ata isi ọtụtụ ma ndị Rọsịa ma ndị Yukren, ọbụladi dịka Yukren ka na-ele anya nkwado ngwagha site n'aka mba ndị na-akwado ya.
Ihe ọzọ nwere ike ime bụ na e nwere ike inwe agha na mpaghara ndị ọzọ dịka Middle East, etiti China na Taiwan nakwa ndị Balkan.
N'ụdị ọnọdụ a, Rọshịa ga-agba mbọ ịkwanye mmanụ n'ọkụ na-enwu enwu.
Agha o nwere ike ịkawanye njọ
N'etiti Febụwarị, Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky dọrọ aka na nti na ibunye Yukren ga-aabara Rọshịa uru.
N'okwu ya n'ọgbakọ nchekwa e mere na Munich, Zelensky kpokuru mba ndị dị n'ỌDịda Anyanwu Yurop ka ha gakwuru Putin., na ọ bụụ na ha emeghị nke a, na ihe ọọọọọọọọọọọ ga-apụtara ọtụtụ mba ndị ọzọ n'ọdịnihu ga-adị egwu.
Dịka ụlọ mmụta 'Royal United Services Institute' (RUSI) si kwuo, Rọshịa ahazigharịala akụnụba ha nakwa ngalaba nchekwa ha ma buwe ihe metụtaraz ndịagha ụzọ dịka ha na-akwado ịlụ agha ogologo oge.
Ịdọaka na ntị si n'aka Minista mba Jamany na-ahụ ihe na eme na mba ọzọ nakwa ụlọfụ ncyocha nke mba Estonia na-ekwu na Rọshịa nwere ike ịwakpo mba so n'otu NATO n'ime afọ iri na-abịa.
Ya mere, otu NATO na European Union' na-ejikere na-akwadokwa agha na ndịagha na mba maka nchekwa zuru oke n'ụwa.










