Etu ụgbọelu bu Herbert Wigwe na ezinaụlọ ya si kpọkasịa n'Amerịka – Nnyocha kwuru

Ebe foto si, NTSB/Wigwe
Ụlọọrụ mba Amerịka na-ahụ maka njem a kpọrọ National Transportation Safety Board (NTSB) ekwuola ihe mere ụgbọelu helikọpta ahụ Herbert Wigwe bụ onyeisi ụlọọrụ Access Holding na ndị ọzo jiri kpọkasịa.
Nke a dị n’akwụkwọ ụlọọrụ a wepụtara na Satọde ma sị na ọtụtụ ndị hụrụ ka ihe mbere a si mee kwuru na ụgbọelu ahụ dịka ọkụ a kpọrọ ‘fireball’ si n’elu tupu ọ daa n’ala ma kpọkasịa.
Wigwe, nwunye ya, nwa ya nakwa Abimbola Ogunbanjo bụbu onyeisi ụlọọrụ Nigeria Exchange Group so na ndị nwụrụ n’ụgbọelu EC130B4 ahụ nke akara ya bụ N130CZ kpọkasịrị na California n’ụbọchị 9 Febụwarị 2023.
Ndị a hụrụ ka o si mee kọwakwara na mmiri nọ na-ezo n’ụbọchị ahụ, tinyere ijiriji nakwa ‘snow’ na-ada n’otu aka ahụ.
Ha kọwakwara na igwe na-egosi ebe ụgbọelu nọ kwa mgbe a kpọrọ ‘automatic dependent surveillance broadcast (ADS-B) gosiri na ụgbọelu ahụ nọ na-agba nnukwu ọsọ tupu ọ kpọkasịa.
Ụlọorụ a kwuru na a hụrụ ọtụtụ mpekere akụkụ ahụ ụgbọelu ahụ n’ugwu dị n’ọzara dịka ọtụtụ igwe na-arụ ọrụ n’ime ya mebichara emebi site n’ọkụ ọgbụgba.
N’ihe dịka otu izuụka Wigwe nwụchara, ụlọọrụ Access Holding họpụtara nwada Bolaji Agbede ka ọ nọchie anya ya dịka ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa ruru uju maka ọnwụ ya.
A họpụtala Bolaji Agbede ka ọ nọchie Herbert Wigwe nwụrụ anwụ n’ọkwa onyeisi Access Holding

Ebe foto si, ACCESS BANK/WEB
A họpụtala Bolaji Agbede ka ọ nọchie Herbert Wigwe nwụrụ anwụ n’ọkwa onyeisi Access Holding
Ụlọọrụ Access Holding ahọpụtala Bolaji Agbede dịka onyeisi ọhụrụ ga-arụ ọrụ ịnọchiteanya Herbert Wigwe nwụrụ anwụ.
Ndịisi ụlọorụ a kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde n’ime ụbọchị abụọ Herbert Wigwe bụbu onyeisi ụlọọrụ nwụchara.
Wigwe, nwunye ya, nwa ya nwoke na mmadụ atọ ndị ọzọ nwụrụ n’ihe mbere ụgbọelu helikọpta mere na Fraịde n’obodo California na mba Amerịka.
Ngalaba na-ahụ maka njem na mba Amerịka bụ National Transport Safety Board (NTSB) ekwuola na ha na-eme nyocha ịchọpụta ihe butere ọdachi ahụ.
Onye otu ha bụ Michael Graham kwuru na onye hụrụ ka ihe a si mee kwuru na mmiri na ijiriji nọ na-ezo mgbe helikọpta ahụ kpọkasịrị.
Dịka ndị mmadụ ka na-ebe akwa ọnwụ nwamadị a, ụlọọrụ Access Holdings họpụtara Agbede dịka onye ga-arụ ọrụ onyeisi ha.
“Nhọpụta a ga-adị ire mgbe ụlọakụ etiti nke Naịjirịa kwadochara ya,” ka odeakwụkwọ ụlọọrụ ahụ bụ Sunday Ekwochi kwuru.
Ihe nyocha e mere kwuru banyere ọnw ụ Herbert Wigwe

Ebe foto si, Herbert Wigwe
Ndị ọrụ mba Amerịka akọwaala otu n’ime ihe ndị butere mberede ụgbọelu helikọpta nke gburu onyeisi ụlọọrụ Access Group bụ Herbert Wigwe, nwunye ya na nwa ya nwoke n'obodo California n’ụbọchị Fraịde.
Ha kwuru na akụkọ si n’ọnụ anya hụrụ ka o si mee kwuru na mmiri nọ na-ezo mgbe ụgbọelu helikọpta ahụ kpọkasịrị.
“Anya hụrụ ka ihe si mee kwuru na ọnọdụ ihe eluigwe mgbe ihe mberede a mere gosiri na mmiri na-ezo, tinyere ijiriji.” Ka ihe otu onye ụlọọrụ na-ahụ maka eje alọ n’Amerịka bụ Michael Graham kwuru.
O kwuru na mmadụ atọ ndị ọzọ so n’ụgbọelu ahụ gụnyere Abimbola Ogunbanjo bụbu onyeisioche ụlọọrụ Nigeria Exchange Group nwụrụ.
Graham gara n’ihu kwuo na otu ha ga-eme ezi nyocha tara ọchịchị iji chọpụta kpọmkwem ihe butere mkpọkasị ụgbọelu helikọpta ahụ.
Alex Otti esorola ruo uju ọnwụ Herbert Wigwe

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Aka na-achị Abia steeti bụ Alex Otti ekwuputala etu obi dị ya n'ọnwụ onyeisi Access Bank bụ Herbert Onyewumbu Wigwe.
Otti kọwara na Wigwe gwara ya na ọ na-aga ọgbakọ na Briten, na ọ ga esi ebe ahụ gaa Amerịka tupu ọlaghachi Naịjirịa bia huya.
Okwuru na kemgbe ozi ọnwụ ya jiri gbasaa na ọkabeghị jikọta onwe ya, okwuru na ọdị ya ka n'nrọ.
N'okwu ya ''oge a sọ n'oge m kachasị nwe nwute n'ndụ m, nke ka njọọ bụ na Chizoba na Chizzy so gị banye ya bụ ụgbụelụ tara isi unu niile, ọdi m ka mmadụ kpọtee m gwa m na ọ bụ n'nrọ ka ihe a na-eme''
Otti kwuru na ọnwụ Wigwe bụ ihe mgbawa obi nyere ya, na mmadụ niile matara ha abụọ ma na ọbụghị nani ezi enyị ka ha bụ, na ha bụku nwanne.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ụlọọrụ Access Group nwe ụlọakụ Access ewerela obi mgbawa kwupụta ọnwụ onyeisi ha bụ Herbert Wigwe na nwunye ya na nwa ha nwoke bụ ndị nwụrụ n’ihe mberede ụgbọelu Helikọpta na mba Amerịka.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ha bụ Sunday Ekwochi wepụtara na Sọnde ma sị na ọdachi a bụ ezigbo iru uju nye ha.
N’ozi ahụ ụlọọrụ Access tiri ezinaụlọ Wigwe aka n’obi maka oke ihe a dakwasịrị ha.
Onyeisioche ụlọọrụ a bụ Abubakar Jimoh kwuru na oke ihe efunahụrụ ha site n’ọnwụ Herbert Wigwe bụ ezigbo enyi ya nwoke, bụrụ ezigbo mmadụ nakwa onye maara ihe ekwe n’akụ n’azụmaahịa.
Jimoh gara n’ihu kwuo na oge na-adịghị anya ha ha ga-ahọpụta onyeisi ọhụrụ nke Access Group ga-agbakwasị ụkwụ n’ukporo Wigwe hiwere maka mwulite ụlọọrụ ahụ.

Ebe foto si, Access/Instagram
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Kemgbe mgbede ụbọchị Satọde ka aha onyeisi ụlọakụ Access bank bụ Herbert Onyewumbu Wigwe malitere kpọtụba n'intanet.
Mana ọtụtụ amaghị ihe ọbụla banyere nwoke ahụ karịa na ọ bụ onyeisi otu n'ime nnukwu ụlọakụ e nwere na Naijria.
Wigwe bụbụ Osote onyeisi ụlọakụ ahụ weghara ọkwa dịka onyeisi Accessbank dịka Aigboje Aig-Imoukhuede bụbụ onyeisi ụlọakụ ahụ chịsara ọwa dịka onyeisi n'afọ 2014 .
Onye Ikwerre, Rivas steeti a mụrụ n'Ibadan Oyo steeti, Wigwe gụrụ 'Accountancy na mahadum 'University of Nigeria Nsukka', n'ogige ha dị n' Enugwu.

Ebe foto si, Access Bank
Ọ malitere ọrụ dịka onye ọrụ mgbakọ na mwepụ n'ụlọọrụ 'Coopers and Lybrand Associates Limited' dị na Legọs.
Ọ rụrụ ọrụ ụlọakụ na ụlọakụ Kapital Merchant Bank tupu ọ gaa GTBank bụ ebe ọ rụrụ ọrụ ihe karịrị afọ iri ma rịa rue ọkwa 'Ezxcutive Director' tupu o si ebe ahụ gawa Access Bank dịka Osote Onyeisi.

Ebe foto si, Herbert Wigwe /X
Wigwe ji nwaanyị bụ Chizoba Wigwe. Ha mụrụ ụmụ anọ: Chizi, Tochi, Hannah na David.
Etu ndị a ma ama si kwanyere Herbert Wigwe ugwu

Ebe foto si, Wigwe/Okonjo Iweala/Instagram/Getty Images
Dịka ozi ọnwụ Herbert Wigwe ka na-ewu ewu, ndị mmadụ ọ kachasị ndị a ama ama na-egosi mute ha maka ihe mere.
Ka ha na-eme nke a, ka ha na-akwanyere Wigwe ugwu ikpeazụ.
Ndị ahụ gụnyere Ngozi, Okojo Iweala, onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi, Festus Keyamo bụ Mịnịsta njem ụgbọelu, ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga nakwa Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron.
E nwekwara ndị ọzọ selitere isi bụ Atiku Abubakara zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha otu PDP nakwa onye omwieu Shehu Sani ndz.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3

End of X post, 4

End of X post, 5
N'agbanyeghi nke a, ụlọakụ Access Bank bụ nke Wigwe hibere ekwuputabeghi hoo haa ma ọ nwụọla ma ọ nwụbeghi.
Kama n'ozi ha wepụtara n'akara X (bụbu) Twitter ha kwuru na ha na ndị isi mba Amerịka ka na-arụkọ ọrụ ịma mpụtara nyocha banyere ihe mere.
Ha kelekwara ndị mmadụ ma nghọta na nkwado enyere ha maka ya bụ ihe mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6