Ụlọikpe enyela iwu ka a kpọchie Emefiele na nga Kuje dị n'Abuja

Godwin Emefiele
Nkọwa foto, Emefiele n'ụlọikpe ukwu dị na Legọs dịka ndị DSS boro ya ebubo inwe egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Julaị 2023

Ụlọikpe dị n’Abuja nọọrọ n’ụbọchị Fraịde 17 Nọvemba 2023 nye iwu ka a kpọchie Godwin Emefiele bụbu onyeisi ụlọakụ etiti na mkpọrọ dị na Kuje, Abuja.

Ọkaikpe Hamza Muazu nyere iwu a ma sị na Emefiele ga-anọ na nga ruo ụbọchị Wenezde 22 Nọvemba mgbe ụlọikpe ga-eleba anya n’ebubo isii gọọmentị etiti boro ya.

Gọọmentị boro ya ọnụ ebubo iri abụọ ịzụ ngwa ego ya dị ijeri naịra isii na ụma (N6.5bn) mana ha mechara belata ya n’ọnụ ebubo isii ego ya pụtara otu ijeri naịra na ụma (N1.6bn).

Mana Emefiele agọọla na aka ya dị ọcha n’ebubo ndị ahụ.

N’izuụka gara aga ka ọkaịkpe ọzọ nyere iwu sị ka a tọhapụ Emefiele dịka ọ gbara akwụkwọ maka nwuchi a nwuchiri ya kamgbe ọnwa ise na-amaghị ya ikpe.

Ụlọikpe atọhapụla ya n'ọnọdụ mgbapụta

Ọkaikpe Olukoyade Adeniyi nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja atọhapụla onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele.

Ọkaikpe a nyere iwu sị ka a tọhapụ Emefiela ngwa ngwa ma nye ya n’aka ndị ọkaiwu ya bụ ndị ga na-akpọta ya n’ụlọikpe mgbe ọbụla o kwesịrị.

Ọkaikpe a nyere iwu ka Emefiele ka enye ụlọikpe akwụkwọ njem ya ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe dị n’isi ya.

Ọkaikpe a kwukwara na e kwesịrị ịkwụsị nwụchi ndị mmadụ ma tinye ha na nga na-ekpeghi ha ikpe ọbụla.

Ụlọikpe a gara n’ihu nye Gọọmentị etiti nakwa ọkaiwu gọọmentị etiti iwu ka ha ghara inupuisi n’iwu o nyere sị ka a tọhapụ Emefiele.

E yigharịrị ikpe ahụ gawa n’ụbọchị 17 Nọvemba 2023.

Nsogbu Emefiele malitere n’ọnwa Juun 9, 2023 mgbe onyeisiala Tinubu kwụsịchara ya ọrụ. Ka otu ụbọchị gachara, ndị uweojii nzuzo bụ DSS kwupụtara na ha anwụchiela ya.

Emefiele nọ n’ụlọ mkpọro ndị DSS kamgbe ahụ rute ugbua ụlọikpe sị ka ha tọhapụ ya.

Ụlọikpe enyela EFCC iwu ka ha tọhapụ Emefiela maọbụ kpọta ya n'ụlọikpe

Ọkaikpe Adegbola Adeniyi nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja enyela ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC iwu ka ha tọhapụ Godwin Emefiele bụbu onyeisi ụlọakụ etiti.

Ọkaikpe Adeniyi nyere iwu dịka Emefiele gbara akwụkwọ n’ụlọikpe na-achọ ka a tọhapụ ya site n’aka ndị EFCC ruo mgbe ha ga-amalite ikpe ikpe banyere ebubo ndị nọ n’isi ya.

N’aka nke ọzọ, e nyere EFCC iwu ka ha kpọta Emefiele n’ụlọikpe na Mọnde 6 Nọvemba, 2023 bụ ụbọchị a ga-anụ ikpe mgbe e nwereike ịtọhapụ ya.

Emefiele tinyere aha gọọmentị etiti, ọkaiwu ukwu gọọmentị nakwa onyeisi ngalaba EFCC dịka ndị ga-azara ọnụ ha n’akwụkwọ ọ gbara n’ụlọikpe.

N’akwụkwọ ahụ ọ gbara, ọ gwara ụlọikpe ka amanye EFCC n’ike ka a tọhapụ ya maọbụ ụlọikpe e were aka ha mee nke a.

Ihe mere ikpe Emefiele agaghị n'ihu dịka a tụrụ anya n'Abuja

Godwin Emefiele
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ikpe gbasara ebubo nrụrụaka nke gọọmentị Naịjirịa na-ebo Godwin Emefiele, bụbu onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa, agaghị n'ihu n'ụlọikpe ukwu nke FCT dị na mpaghara Maitama n'Abuja taa bụ Wenezde, ụbọchị 23 nke ọnwa Ọgọst 2023.

Ọtụtụ ndị ntaakụkọ gbakọrọ n'ụlọikpe, tinyere onye ntaakụkọ BBC, chọpụtara na ikpe gbasara Emefiele adịghị n'akwụkwọ gosiri ikpe niile a ga-ekpe n'ụlọikpe ahụ, nke pụtara na ọ gaghị abịa ụlọikpe taa.

Cheta na gọọmentị Naịjirịa boro Emefiele na otu nwaanyị aha ya bụ Sa'adatu Yaro ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri naịra isii na ụma itoolu (N6.9b).

Ikpe ha kwesịburu ịmalite n'ụbọchị 17 nke ọnwa ọgọst n'ihu ọkaikpe Hamza Muazu, mana n'ụbọchị ahụ ndị ọkaiwu nwaada Sa'adatu kwuru na o nweghị ike ịbịa n'ụlọikpe n'ihi na ahụ esichaghị ya ike.

Nke a mere ka e yigharịa ikpe ahụ ka ọ dịzie n'ụbọchị 23 nke Ọgọst, mana ọ gbara ndị ntaakụkọ gharịị dịka ha chọpụtara na ikpe ahụ esoghị na nke e depụtara n'akwụkwọ ụlọikpe maka ụbọchị taa.

Onwebeghịonye ma ihe kpatara nke a, dịka ndị ọrụ ụlọikpe enyeghị nkọwa ọbụla gbasara ya. A hụkwaghị ma ndị ọkaiwu Emefiele ma ndị ọkaiwu gọọmentị etiti n'ụlọikpe taa.

Ka ọ dị ugbua, Emefiele ka nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ Department of State Service, bụ ndị jidere ya kamgbe ụbọchị 10 nke ọnwa Jun 2023.

Maka akụkọ etu ikpegbasara Emefiele si gaa n'ụlọikpe n'ụbọchị 17 nke Ọgọst, gụrụ gbadawa.

Etu ikpe Godwin Emefiele si gaa n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja n'Ọgọst 17

Godwin Emefiele n'ụlọikpe

Godwin Emefiele bụ Gọvanọ ụlọakụ etiti nke Naịjirịa abịrutela n'ụlọikpe ukwu nke FCT dị n'Abuja, n'ụtụtụ Tọzde a, dịka a na-ekpe ya ikpe maka ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri naịra 6.9 bụ nke gọọmentị Naịjirịa boro ya.

Ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ 'Department of State Service' (DSS) kpọtara Emefiele n'ebe elekere itoolu nke ụtụtụ.

Ebubo e boro Emefiele ruru 20, dịka gọọmentị kwuru na o ji ọkwa ya na-enye ndị enyi ya ọrụ ngo dị icheiche n'ụzọ iwu akwadoghị.

Onye ọzọ e boro ya na Emefiele ebubo a bụ nwaanyị aha ya bụ Sa'adatu Yaro, bụkwa onye ọrụ n'ụlọakụ etiti, onye a sị na Emefiele nyere ụlọọrụ nwaanyị ahụ a na-akpọ April1616 Investmet Limited ọrụ ngo ịzụta ọtụtụ ụgbọala.

Mana ikpe ahụ agaghị n'ihu taa n'agbanyeghị na Emefiele n'onwe ya bịara n'ụlọikpe.

Ndị ọkaiwu gọọmentị Naịjirịa gwara ọkaikpe Hamza Muazu na ha enweghị ike ikpọta 'Sa'adatu Yaro n'ụlọikpe n'ihi na ahụ esighi ya ike.

Nke a mere ka ọkaikpe ahụ yigharịa ya bụ ikpe ka ọ dịzie n'ụbọchị 23 nke ọnwa Ọgọst 2023.

Ọ bụrụ na a ma Emefiele ikpe, e nwereike ịtụ ya mkpọrọ afọ ise, na-enyeghị ohere maka ịkwụ nha ọbụla.

Lee foto ụfọdụ si n'ụlọikpe taa

Godwin Emefiele
Nkọwa foto, Emefiele na-ezo ihu ya n'ụlọikpe dịka ndị ntaakụkọ na-achọ isete ya foto
Godwin Emefiele
Nkọwa foto, Ndị ntaakụkọ jupụtara n'ụlọikpe na-achọ isete Emefiele foto
Godwin Emefiele
Nkọwa foto, Emefiele na-ezo ihu ya ka ndị ntaakụkọ ghara isete ya

Ihe i kwesịrị ịma maka Godwin Emefiele

  • Gowin Emefiele bụ onye obodo Ika South dị na mpaghara Agbor nke Delta Steetị
  • A mụrụ ya na Legọs Steetị n'ụbọchị anọ nke ọnwa Juun, afọ 1961
  • Ọ gụrụ mahadum na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka na ngalaba Banking and Finance ma bụrụ onye mbụ na klassị n'afọ 1984
  • Ọ gụkwara akwụkwọ na Stanford University, Harvard University (2004) nakwa Wharton School of Business (2005)
  • Ọ rụrụ ọrụ n'ụlọakụ dị iche iche ruo ihe karịrị afọ iri na asatọ, ọ rụrụ ọrụ dịka otu n'ime ndịisi ụlọakụ Zenith Bank na Naịjirịa nakwa Gambia
  • O weere ọkwa dịka onyeisi ụlọakụ etiti n'afọ 2014
  • Onyeisiala Bola Tinubu chụturu Emefiele n'ọkwa onyeisi ụlọakụ etiti n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Jun 2023